Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 10:1-39

10  N’ihi na ebe Iwu ahụ nwere onyinyo+ nke ihe ọma ndị gaje ịbịa, ma ọ bụghị ihe ndị ahụ kpọmkwem, ọ dịghị mgbe ụmụ mmadụ pụrụ ime ka ndị na-abịaru nso zuo okè+ site n’otu àjà ndị ahụ a na-achụ site n’afọ ruo n’afọ bụ́ ndị ha na-achụ mgbe niile.  A sị na ha pụrụ ime ya, ọ̀ bụ na a garaghị akwụsị ịdị na-achụ àjà ndị ahụ, n’ihi na ndị na-eje ozi dị nsọ, bụ́ ndị e mere ka ha dị ọcha naanị otu ugboro, agakwaghị ama banyere mmehie?+  Kama nke ahụ, site n’àjà ndị a, a na-echeta mmehie kwa afọ,+  n’ihi na ọbara ụmụ oké ehi na ọbara ewu apụghị iwepụ mmehie.+  Ya mere, mgbe ọ bịara n’ụwa, o kwuru, sị: “‘Ị chọghị àjà na onyinye,+ kama ị kwadebeere m ahụ́.+  Ị kwadoghị onyinye a na-esurecha n’ọkụ na àjà mmehie.’+  M wee sị, ‘Lee! Abịawo m ime uche gị, Chineke,’”+ (e dere ihe banyere m n’akwụkwọ mpịakọta).+  Mgbe o buworo ụzọ kwuo, sị: “Ị chọghị, ị kwadoghịkwa àjà na onyinye na onyinye a na-esurecha n’ọkụ na àjà mmehie”+—bụ́ àjà ndị a na-achụ dị ka Iwu ahụ si dị+  ọ sịrị: “Lee! Abịawo m ime uche gị.”+ O wepụrụ nke mbụ ka o wee mee ka nke abụọ guzosie ike.+ 10  Site ‘n’uche’+ ahụ nke o kwuru okwu ya, e dowo anyị nsọ+ site n’àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ+ naanị otu ugboro.+ 11  Onye nchụàjà ọ bụla na-eguzo+ kwa ụbọchị+ ijere ọha mmadụ ozi na ịchụ otu àjà ndị ahụ mgbe mgbe, ebe ọ na-adịghị mgbe àjà ndị a nwere ike iwepụ mmehie kpamkpam.+ 12  Ma nwoke a chụrụ otu àjà maka mmehie ruo mgbe niile+ wee nọdụ ala n’aka nri Chineke,+ 13  malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ nọ na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.+ 14  N’ihi na ọ bụ site n’otu àjà ọ chụrụ+ ka o mere ka ndị a na-edo nsọ zuo okè+ ruo mgbe niile. 15  Mmụọ nsọ+ na-agbakwara anyị àmà, n’ihi na mgbe o kwuchara, sị: 16  “‘Nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ha ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,’ ka Jehova kwuru. ‘M ga-etinye iwu m n’obi ha, m ga-edekwa ya n’uche ha,’”+ 17  o mesịrị kwuo, sị: “M gakwaghị echeta mmehie ha na mmebi iwu ha ma ọlị.”+ 18  N’ebe a gbaghaara ihe ndị a,+ ọ dịkwaghị mkpa ịchụ àjà maka mmehie.+ 19  Ya mere, ụmụnna m, ebe anyị nwere obi ike isi n’ụzọ e si abanye+ n’ebe nsọ ahụ+ gafere site n’ọbara Jizọs, 20  bụ́ nke o megheere anyị dị ka ụzọ ọhụrụ nke dịkwa ndụ e si agabiga ákwà mgbochi ahụ,+ ya bụ, anụ ahụ́ ya,+ 21  ebe anyị nwekwara onye nchụàjà ukwu na-elekọta ụlọ Chineke,+ 22  ka anyị jiri ezi obi na-abịaru nso, nwee obi ike zuru ezu na okwukwe, ebe e fesaworo mmiri dị ọcha n’obi anyị ka ọ ghara inwe ajọ akọ na uche,+ jirikwa ya sachaa ahụ́ anyị.+ 23  Ka anyị jidesie nkwupụta ihu ọha nke olileanya anyị ike+ n’amaghị jijiji,+ n’ihi na onye ahụ nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi.+ 24  Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie+ ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ,+ 25  ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị,+ dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume,+ na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.+ 26  N’ihi na ọ bụrụ na anyị elezie anya+ na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ,+ ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie,+ 27  kama e nwere nnọọ ikpe dị egwu+ nke a na-atụ anya ya, na ekworo na-enwu ka ọkụ nke ga-erepịa ndị mmegide.+ 28  A na-egbu onye ọ bụla ledara iwu Mozis anya n’enweghịrị ya ọmịiko, mgbe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbagidere ya akaebe.+ 29  Olee ụdị ntaramahụhụ ka njọ+ unu chere e kwesịrị inye onye zọkwasịrị+ Ọkpara Chineke ụkwụ, onye wekwaara ọbara+ nke ọgbụgba ndụ ahụ e ji doo ya nsọ dị ka ihe na-abaghị uru, onye lelịkwara mmụọ nke obiọma na-erughịrị mmadụ, mejọọkwa ya?+ 30  N’ihi na anyị maara onye ahụ nke kwuru, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ”;+ ọ sịkwara: “Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe.”+ 31  Ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.+ 32  Otú ọ dị, na-echetanụ ụbọchị ndị gara aga, bụ́ mgbe unu tachiri obi n’oké ịgba mgba ka unu nọ na-ata ahụhụ,+ mgbe e mesịrị ka unu nwee nghọta,+ 33  mgbe ụfọdụ ka a nọ na-ekpughe unu, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’ebe a na-eme ihe ngosi,+ ka e wee kọchaa ma kpagbuo unu, mgbe ụfọdụkwa ka unu na ndị na-enwe ụdị ahụmahụ ahụ+ na-enwekọ ha. 34  N’ihi na unu nwere obi ebere n’ebe ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ nọ, jirikwa ọṅụ nabata mbukọ e bukọọrọ+ ihe unu, ebe unu maara na unu onwe unu nwere ihe onwunwe ka mma, nke na-adịgidekwa adịgide.+ 35  Ya mere, unu atụfula nkwuwa okwu unu,+ nke nwere ụgwọ ọrụ dị ukwuu.+ 36  N’ihi na ntachi obi dị unu mkpa,+ ka unu wee nata mmezu nke nkwa ahụ,+ mgbe unu mesịrị uche Chineke.+ 37  N’ihi na ọ fọdụrụ “nnọọ nwa oge,”+ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarutekwa, ọ gaghịkwa egbu oge.’+ 38  “Ma onye ezi omume m ga-adị ndụ n’ihi okwukwe ya,”+ ‘ọ bụrụkwa na ọ laa azụ, mkpụrụ obi m enweghị obi ụtọ n’ebe ọ nọ.’+ 39  Ma anyị abụghị ụdị ndị na-ala azụ ka e wee bibie ha,+ kama anyị bụ ndị nwere okwukwe ka e wee chebe mkpụrụ obi ha ndụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji