Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Galeshia 6:1-18

6  Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ+ tupu ya amara na ọ zọhiere ụkwụ, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ,+ gbalịanụ iji mmụọ dị nwayọọ+ gbazie onye ahụ. Ka onye ọ bụla n’ime unu lekwasị onwe ya anya,+ a dịghị ama ama, a nwaakwa onye ahụ.+  Na-eburịtanụ ibu arọ+ nke ibe unu, ma si otú a na-emezu iwu nke Kraịst.+  N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ,+ ọ na-aghọgbu obi ya.  Ma ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya,+ mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.+  N’ihi na onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.+  Ka onye ọ bụla e jikwa ọnụ+ na-akụziri okwu Chineke na-enye onye ahụ ji ọnụ na-akụziri ya ihe+ dị otú ahụ ihe ọma niile.+  Unu ekwela ka e duhie unu:+ Chineke abụghị onye a ga-akwa emo.+ N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa;+  n’ihi na onye na-agha mkpụrụ maka anụ ahụ́ ya ga-aghọrọ ire ure site n’anụ ahụ́ ya,+ ma onye na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ+ ga-aghọrọ ndụ ebighị ebi site na mmụọ nsọ.+  Ya mere, ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma,+ n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.+ 10  Ya mere, ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya,+ ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.+ 11  Leenụ otú m si jiri aka m were mkpụrụ akwụkwọ dị okpotokpo detara unu akwụkwọ.+ 12  Ọ bụ ndị niile chọrọ ka ndị ọzọ na-ele ha anya ọma na-anwa ịmanye unu ka e bie unu úgwù,+ naanị ka e wee ghara ịkpagbu ha n’ihi osisi ịta ahụhụ nke Kraịst,+ bụ́ Jizọs. 13  N’ihi na ndị ahụ e biri úgwù adịghịdị edebe Iwu ahụ,+ kama ha na-achọ ka unu bụrụ ndị e biri úgwù ka ha wee nwee ihe ha ga-eji na-anya isi n’anụ ahụ́ unu. 14  Ya adịla mgbe m ga-anya isi, ọ gwụla ma ọ̀ bụ ịnya isi n’osisi ịta ahụhụ+ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ onye e si n’aka ya kpọgide ụwa n’osisi n’ebe m nọ,+ kpọgidekwa m n’ebe ụwa dị. 15  N’ihi na ibi úgwù abụghị ihe ọ bụla, ebighị úgwù abụghịkwa,+ ma ihe e kere ọhụrụ+ nwere ihe ọ bụ. 16  Ndị niile ga-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ụkpụrụ omume a, ka udo na ebere dịkwasị ha, dịkwasịkwa Izrel nke Chineke.+ 17  Site ugbu a gaa n’ihu, ka onye ọ bụla ghara ịdị na-enye m nsogbu, n’ihi na ebu m apa n’ahụ́ m,+ ndị na-egosi na abụ m ohu Jizọs.+ 18  Ụmụnna m, ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ+ unu na-egosi. Amen.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji