Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Galeshia 5:1-26

5  Ọ bụ n’ihi nnwere onwe dị otú ahụ ka Kraịst mere ka anyị nwere onwe anyị.+ Ya mere, guzosienụ ike,+ unu ekwekwala ka e jichie unu ọzọ na yok nke ịnọ n’ohu.+  Lee! Mụ onwe m, bụ́ Pọl, na-agwa unu na ọ bụrụ na e bie unu úgwù,+ Kraịst agaghị abara unu uru.  Ana m agbakwa àmà ọzọ nye onye ọ bụla a na-ebi úgwù na o ji ụgwọ idebe Iwu ahụ dum.+  Unu ahapụwo Kraịst, ndị ọ sọrọ unu bụrụ, unu ndị na-agbalị ka a kpọọ ha ndị ezi omume n’ihi iwu;+ unu esiwo n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ dapụ.+  Ma anyị onwe anyị, site na mmụọ nsọ, anyị na-echeresi ezi omume ahụ a na-ele anya ya n’ihi okwukwe ike.+  N’ihi na n’ihe banyere Kraịst Jizọs, ibi úgwù abaghị uru ọ bụla, ebighị úgwù abaghịkwa,+ ma okwukwe+ nke na-arụ ọrụ site n’ịhụnanya+ bara uru.  Unu nọ na-agba ọsọ nke ọma.+ Ònye gbochiri unu ịnọgide na-erubere eziokwu ahụ isi?+  Ụdị echiche a esighị n’aka Onye ahụ nke na-akpọ unu.+  Ntakịrị ihe iko achịcha na-eme ka ntụ ọka dum a gwakọtara agwakọta koo eko.+ 10  Obi siri m ike+ banyere unu ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu+ na unu agaghị eche ihe dị iche; ma onye ahụ nke na-akpatara unu nsogbu+ ga-anata ikpe ya,+ onye ọ sọrọ ya bụrụ. 11  Ụmụnna m, ọ bụrụ na mụ onwe m ka na-ekwusa ibi úgwù, gịnị mere a ka ji na-akpagbu m? Mgbe ahụ, n’ezie, e wepụwo+ ihe ịsụ ngọngọ+ nke osisi ịta ahụhụ.+ 12  Ọ dị m ka ya bụrụ na ndị ahụ na-anwa ime ka unu daa+ ga-eme onwe ha ndị ọnaozi.+ 13  Otú ọ dị, ụmụnna m, a kpọrọ unu ka unu nwere onwe unu;+ ma unu ejila nnwere onwe a mere ihe na-akpali anụ ahụ́,+ kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu ohu.+ 14  N’ihi na a na-emezu Iwu ahụ dum+ n’otu okwu a, ya bụ: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”+ 15  Otú ọ dị, ọ bụrụ na unu anọgide na-atarịta ibe unu arụ ma na-eripịarịta ibe unu,+ lezienụ anya ka unu ghara ịlarịta ibe unu n’iyi.+ 16  Ma m na-ekwu, sị, Nọgidenụ na-eje ije site na mmụọ nsọ,+ unu agaghịkwa emezu ọchịchọ anụ ahụ́ ọ bụla ma ọlị.+ 17  N’ihi na anụ ahụ́ na-emegide mmụọ nsọ+ n’ọchịchọ ya, mmụọ nsọ na-emegidekwa anụ ahụ́; n’ihi na ihe ndị a na-emegiderịta onwe ha, ka unu wee ghara ime ihe ndị ahụ unu na-achọ ime.+ 18  Ọ bụrụkwa na unu bụ ndị mmụọ nsọ na-edu,+ unu anọghị n’okpuru iwu.+ 19  Ma ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè,+ ha bụ ịkwa iko,+ adịghị ọcha, omume rụrụ arụ,+ 20  ikpere arụsị, ime mgbaasị,+ ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, inwe òtù, 21  anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya,+ oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị otú a. Ebu m ụzọ na-adọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị a, n’otu ụzọ ahụ m buru ụzọ dọọ unu aka ná ntị, na ndị na-eme+ ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.+ 22  N’aka nke ọzọ, mkpụrụ+ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma,+ okwukwe, 23  ịdị nwayọọ, njide onwe onye.+ Ọ dịghị iwu na-emegide ihe ndị dị otú a.+ 24  Ọzọkwa, ndị bụ́ ndị nke Kraịst Jizọs kpọgidere anụ ahụ́ ha n’osisi, ya na agụụ mmekọahụ ya na ọchịchọ ya niile.+ 25  Ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ site na mmụọ nsọ, ka anyị na-ejekwa ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị site na mmụọ nsọ.+ 26  Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi+ n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji