Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Galeshia 3:1-29

3  Unu ndị Galeshia na-amaghị ihe, ọ̀ bụ onye duhiere unu,+ unu ndị e mere ka o doo anya nke ọma na a kpọgidere Jizọs Kraịst n’osisi?+  Naanị ihe a ka m chọrọ ịmata n’aka unu: Ùnu natara mmụọ nsọ+ n’ihi ọrụ nke iwu+ ka ọ̀ bụ n’ihi na unu ji okwukwe gee ntị?+  Ọ̀ bụ otú a ka amaghị ihe unu ruru? Mgbe unu malitesịrị site na mmụọ nsọ,+ à na-eme ugbu a ka unu zuo ezu n’anụ ahụ́?+  Ùnu tara ọtụtụ ahụhụ n’efu?+ N’ezie, amaara m na ọ bụghị n’efu.  Ya mere, onye ahụ nke na-enye unu mmụọ nsọ+ ma na-arụ ọrụ ndị dị ike+ n’etiti unu, ọ̀ na-eme ya n’ihi ọrụ nke iwu ka ọ̀ bụ n’ihi na o ji okwukwe gee ntị?  Dị nnọọ ka Ebreham “nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, a gụkwaara ya nke ahụ dị ka ezi omume.”+  N’ezie, unu maara na ọ bụ ndị nwere okwukwe+ bụ ụmụ Ebreham.+  Ma ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ bu ụzọ hụ na Chineke ga-akpọ ndị mba ọzọ ndị ezi omume n’ihi okwukwe, o bu ụzọ zie Ebreham ozi ọma, sị: “A ga-agọzi mba niile site na gị.”+  N’ihi ya, a na-agọzi ndị nwere okwukwe+ dị ka a gọziri Ebreham bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi.+ 10  N’ihi na ndị niile na-adabere n’ọrụ nke iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ; n’ihi na e dere, sị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ọ bụla bụ, nke na-anọgideghị n’ihe niile e dere n’akwụkwọ mpịakọta nke Iwu ahụ ka o wee na-edebe ha.”+ 11  Ọ pụtakwara ìhè na n’ebe Chineke nọ, a dịghị esi n’iwu akpọ onye ọ bụla onye ezi omume,+ n’ihi na “onye ezi omume ga-adị ndụ n’ihi okwukwe ya.”+ 12  Ma Iwu ahụ adabereghị n’okwukwe, ma “onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha.”+ 13  Kraịst tọhapụrụ+ anyị n’ọbụbụ ọnụ nke Iwu ahụ site n’ịzụrụ anyị,+ site n’ịbụ onye a bụrụ ọnụ+ n’ọnọdụ anyị, n’ihi na e dere, sị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ọ bụla a kwụwara n’osisi bụ.”+ 14  Nke a bụ ka ngọzi a gọziri Ebreham wee ruoro ndị mba ọzọ site na Jizọs Kraịst,+ ka anyị wee nata mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa+ site n’okwukwe anyị.+ 15  Ụmụnna m, eji m ihe ndị mmadụ na-eme na-amara unu atụ: Ọ dịghị onye na-akagbu ọgbụgba ndụ e mere ka ọ dị irè, ọ dịghịkwa onye na-atụkwasị ya ihe,+ ọ bụ ezie na ọ bụ ọgbụgba ndụ nke mmadụ. 16  Ma, ọ bụ Ebreham+ na mkpụrụ ya+ ka e kwere nkwa ndị ahụ. Ihe o kwuru abụghị: “Na mkpụrụ dị iche iche,” dị ka ọ̀ na-ekwu banyere ọtụtụ mkpụrụ, kama dị ka à ga-asị na ọ na-ekwu banyere otu onye, ọ sịrị:+ “Na mkpụrụ gị,”+ nke bụ́ Kraịst.+ 17  Ana m ekwukwa, sị: Banyere ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dị irè na mbụ,+ Iwu ahụ nke malitere ịdị mgbe narị afọ anọ na iri atọ gasịrị+ adịghị eme ka ọ ghara ịdị irè, ka o wee wepụ nkwa ahụ.+ 18  N’ihi na ọ bụrụ na ihe nketa ahụ bụ n’ihi iwu, ọ bụkwaghị n’ihi nkwa;+ ebe Chineke ji obiọma nye ya Ebreham site ná nkwa o kwere ya.+ 19  N’ihi gịnịzi ka e ji nwee Iwu ahụ? A tụkwasịrị ya iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè,+ ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịarute,+ bụ́ onye e kwere nkwa ahụ; e sitekwara n’aka ndị mmụọ ozi+ nye ya, site n’aka onye ogbugbo.+ 20  Ma e nweghị onye ogbugbo mgbe ọ bụ naanị otu onye ka o metụtara, ma Chineke bụ naanị otu.+ 21  Ya mere, Iwu ahụ ọ̀ na-emegide nkwa Chineke?+ Tụfịakwa! N’ihi na ọ bụrụ na e nyere iwu nke nwere ike inye ndụ,+ ezi omume gaara abụ site n’iwu.+ 22  Ma Akwụkwọ Nsọ+ kpọchikọrọ ihe niile n’okpuru mmehie,+ ka ndị na-enwe okwukwe wee nweta nkwa ahụ nke na-esite n’okwukwe e nwere n’ebe Jizọs Kraịst nọ.+ 23  Otú ọ dị, tupu okwukwe ahụ abịarute,+ anyị bụ ndị a na-eche nche n’okpuru iwu,+ bụrụ ndị a kpọchibidokọrọ ọnụ, na-ele anya n’okwukwe ahụ nke a kara aka na a gaje ikpughe.+ 24  N’ihi ya, Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst,+ ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe. 25  Ma ebe ọ bụ na okwukwe ahụ abịala,+ anyị anọkwaghị n’okpuru onye nduzi.+ 26  N’eziokwu, unu niile bụ ụmụ+ Chineke site n’okwukwe unu nwere na Kraịst Jizọs. 27  N’ihi na unu niile ndị e mere baptizim baa na Kraịst+ eyikwasịwo Kraịst.+ 28  E nweghịkwa onye Juu ma ọ bụ onye Grik,+ e nweghịkwa ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya,+ e nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị;+ n’ihi na unu niile bụ otu onye n’ime Kraịst Jizọs.+ 29  Ọ bụrụkwa na unu bụ ndị nke Kraịst, unu bụ n’ezie mkpụrụ Ebreham,+ ndị nketa dị ka nkwa e kwere si dị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji