Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Efesọs 5:1-33

5  Ya mere, ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke,+ dị ka ụmụ a hụrụ n’anya,  na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya+ ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye+ na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ+ nye Chineke.  Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko+ na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu+ aha n’etiti unu,+ dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ;+  ma ọ bụ omume ihere+ ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ,+ bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị, kama nke ahụ ikele Chineke.+  N’ihi na unu maara nke a, unu onwe unu ghọtakwara na ọ dịghị onye na-akwa iko+ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anyaukwu+—nke pụtara ịbụ onye na-ekpere arụsị—nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Kraịst na nke Chineke.+  Unu ekwela ka mmadụ ọ bụla jiri okwu efu ghọgbuo unu,+ n’ihi na ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ e bu ụzọ kwuo ka ọnụma nke Chineke na-abịakwasị ụmụ nnupụisi.+  Ya mere, unu na ha enwekọla ihe ọ bụla;+  n’ihi na unu bụbu ọchịchịrị,+ ma ugbu a unu bụ ìhè+ n’ime Onyenwe anyị. Na-ejenụ ije dị ka ụmụ nke ìhè,  n’ihi na mkpụrụ nke ìhè ahụ bụ ụdị ịdị mma ọ bụla na ụdị ezi omume ọ bụla na ụdị eziokwu ọ bụla.+ 10  Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma;+ 11  kwụsịkwanụ iso ha na-ekere òkè+ n’ọrụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ ndị dịịrị ọchịchịrị,+ ma, kama nke ahụ, ọbụna na-akatọnụ+ ha, 12  n’ihi na ihe ndị ha na-eme na nzuzo na-emedị ihere ịkọ akọ.+ 13  Ìhè ahụ na-emekwa ka ihe niile a na-akatọ akatọ+ pụta ìhè, n’ihi na ihe ọ bụla nke a na-eme ka ọ pụta ìhè+ bụ ìhè. 14  Ya mere, ọ na-ekwu, sị: “Teta,+ gị onye na-arahụ ụra, sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ Kraịst ga-enwukwasịkwa+ gị.” 15  Ya mere, na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije+ ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, 16  na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị,+ n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.+ 17  N’ihi nke a, kwụsịnụ ịbụ ndị na-enweghị ezi uche, kama nọgidenụ na-aghọta+ ihe uche+ Jehova bụ. 18  Unu adịkwala na-aṅụbiga mmanya ókè,+ nke ndụ ịla n’iyi dị na ya,+ kama na-ejupụtanụ na mmụọ nsọ,+ 19  jirinụ abụ ọma+ na ito+ Chineke na abụ ime mmụọ na-agwa ibe unu okwu, na-abụ abụ+ ma na-agụ egwú olu ụtọ+ n’obi unu nye Jehova, 20  na-ekele+ Chineke bụ́ Nna anyị mgbe niile maka ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. 21  Na-edonụ onwe unu n’okpuru ibe unu+ n’ịtụ egwu Kraịst. 22  Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru+ ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, 23  n’ihi na di bụ isi nke nwunye+ ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ,+ ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a. 24  N’eziokwu, dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe niile.+ 25  Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya,+ 26  ka o wee doo ya nsọ,+ jirikwa mmiri saa ya wee mee ka ọ dị ọcha site n’okwu Chineke,+ 27  ka o wee chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya,+ n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ahụ́ ndọlị ma ọ bụ ihe ọ bụla dị otú ahụ, kama ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.+ 28  N’ụzọ dị otú a, ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, 29  n’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya,+ dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya, 30  n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke ahụ́ ya.+ 31  “N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.”+ 32  Ihe nzuzo a dị nsọ+ dị ukwuu. Ana m ekwu banyere Kraịst na ọgbakọ.+ 33  Otú ọ dị, ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya+ dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji