Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Efesọs 3:1-21

3  Ọ bụ nke a mere, mụ onwe m, bụ́ Pọl, ji bụrụ onye mkpọrọ+ n’ihi Kraịst Jizọs maka unu ndị mba ọzọ+  ma ọ bụrụ n’ezie na unu anụwo banyere ọrụ nlekọta+ nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke e nyere m n’ihi unu,  na e kpugheere m ihe nzuzo ahụ dị nsọ,+ dị nnọọ ka m bu ụzọ dee ná mkpirikpi.  Ebe ọ dị otú a, mgbe unu gụrụ nke a, unu pụrụ ịmata nghọta+ m nwere n’ihe nzuzo dị nsọ+ banyere Kraịst.  N’ọgbọ ndị ọzọ, e meghị ka ụmụ mmadụ mara ihe nzuzo a+ dị ka mmụọ nsọ kpugheere+ ya ndịozi na ndị amụma+ ya dị nsọ ugbu a,  ya bụ, na ndị mba ọzọ kwesịrị ịbụ ndị anyị na ha na-eketakọ ihe na ndị so bụrụ akụkụ nke ahụ́+ ahụ na ndị so anyị na-eketa nkwa+ ahụ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst Jizọs site n’ozi ọma ahụ.  M ghọrọ onye ozi+ nke ihe a dị ka onyinye nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ si dị bụ́ nke e nyere n’efu, nke e nyere m dị ka ike ya si arụ ọrụ.+  Ọ bụ m, bụ́ onye dị ala karịa onye kasị nta+ n’ime ndị nsọ niile, ka e nyere obiọma a na-erughịrị mmadụ,+ ka m wee zisaara ndị mba ọzọ+ ozi ọma banyere akụ̀+ Kraịst nke a na-apụghị ịghọta aghọta  ma mee ka ụmụ mmadụ hụ ụzọ e si na-ahụ maka+ ihe nzuzo ahụ dị nsọ+ bụ́ nke e zoro site na mgbe gara aga a na-amaghị ama n’ime Chineke, bụ́ onye kere ihe niile.+ 10  Nke a bụ ka e wee mee ugbu a ka ọchịchị na ikike+ ndị dị n’ebe ndị dị n’eluigwe mara amamihe dịgasị iche iche nke Chineke+ site n’ọgbakọ ahụ,+ 11  dị ka nzube ebighị ebi ahụ si dị nke o zubere n’ime Kraịst,+ bụ́ Jizọs Onyenwe anyị, 12  bụ́ onye anyị si n’aka ya nwee nkwuwa okwu a ma jiri obi ike bịaruo nso+ site n’okwukwe anyị n’ebe ọ nọ. 13  N’ihi ya, m na-arịọ unu ka unu ghara ịda mbà n’ihi mkpagbu+ ndị a m na-enwe maka unu, n’ihi na mkpagbu ndị a pụtaara unu otuto. 14  Ọ bụ nke a mere m ji na-egburu Nna anyị+ ikpere n’ala,+ 15  bụ́ onye ezinụlọ+ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa sitere n’ebe ọ nọ nweta aha ya,+ 16  ka o wee jiri ike sitere na mmụọ+ ya mee ka unu dị ike ná mmadụ ahụ unu bụ n’ime,+ dị ka ebube ya dị ukwuu si dị,+ 17  ka Kraịst wee site n’okwukwe unu biri n’obi unu n’ịhụnanya+ nke kwesịrị ịdị n’etiti unu; ka unu wee gbanye mgbọrọgwụ+ ma guzosie ike na ntọala ahụ,+ 18  ka unu wee nwee ike nke ọma isoro ndị nsọ niile jiri uche ghọta+ ihe bụ́ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi,+ 19  na ịmara ịhụnanya nke Kraịst+ bụ́ nke karịrị ihe ọmụma, ka àgwà niile nke Chineke wee jupụta n’ime unu n’ụzọ zuru ezu.+ 20  Ma onye ahụ nke pụrụ ime ihe nke ukwuu karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche,+ dị ka ike ya nke na-arụ ọrụ n’ime anyị si dị,+ 21  ka otuto dịrị ya site n’ọgbakọ ahụ nakwa site na Kraịst Jizọs n’ọgbọ niile ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji