Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Efesọs 1:1-23

1  Pọl, onyeozi+ nke Kraịst Jizọs site n’uche Chineke,+ na-edetara unu ndị nsọ nọ n’Efesọs na ndị kwesịrị ntụkwasị obi+ ha na Kraịst Jizọs dị n’otu+ akwụkwọ:  Ka obiọma na-erughịrị mmadụ+ na udo+ nke si n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu.  Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na o jiriwo ngọzi niile nke mmụọ nsọ gọzie anyị+ n’ebe ndị dị n’eluigwe+ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst,  dị nnọọ ka ọ họọrọ+ anyị ka anyị na Kraịst dịrị n’otu tupu a tọọ ntọala+ ụwa, ka anyị wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ+ n’ihu ya n’ihi ịhụnanya.+  N’ihi na ọ họpụtara anyị tupu oge eruo+ ka o doo+ anyị dị ka ụmụ+ nye onwe ya site n’aka Jizọs Kraịst, dị ka o si dị ya ezi mma n’uche,+  ka e wee too+ ya n’ihi obiọma ya na-erughịrị mmadụ+ nke dị ebube bụ́ nke o ji obiọma meere anyị site n’aka onye ọ hụrụ n’anya.+  E si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, site n’ọbara+ nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie+ anyị, dị ka obiọma ya dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ si dị.+  O mere ka nke a jupụta n’ebe anyị nọ n’amamihe+ na ezi uche niile,  ebe o mere ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ+ nke uche ya. Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị bụ́ nke o zubere n’ime onwe ya+ 10  maka ilekọta ihe+ mgbe oge ahụ a kara aka zuru,+ ya bụ, ịchịkọtaghachi+ ihe niile n’ime Kraịst,+ ihe ndị dị n’eluigwe+ na ihe ndị dị n’ụwa.+ Ee, n’ime ya, 11  n’ịdị n’otu nke anyị na onye e kenyekwara anyị na ya dị ka ndị nketa,+ ebe a họpụtara anyị tupu oge eruo dị ka nzube nke onye ahụ si dị bụ́ onye ji ihe niile na-arụ ọrụ dị ka uche ya si agwa ya okwu,+ 12  ka anyị wee bụrụ ndị ga-eme ka e nye ebube ya otuto,+ ya bụ, anyị ndị bu ụzọ nwee olileanya na Kraịst.+ 13  Ma unu nwekwara olileanya n’ebe ọ nọ mgbe unu nụsịrị okwu nke eziokwu ahụ,+ bụ́ ozi ọma banyere nzọpụta unu.+ Mgbe unu kweresịịrị, e sikwa n’aka ya jiri mmụọ nsọ+ ahụ e kwere ná nkwa kaa unu akara,+ 14  bụ́ ihe àmà+ e bu ụzọ nye anyị tupu anyị enweta ihe nketa anyị,+ ka e wee jiri ihe mgbapụta tọhapụ+ ndị Chineke,+ iji nye ya otuto dị ebube. 15  Nke ahụ mekwara na ebe m nụworo banyere okwukwe unu nwere n’ime Onyenwe anyị Jizọs, nke unu na-egosi n’otú unu si emeso ndị nsọ niile,+ 16  akwụsịghị m ikele Chineke maka unu. M na-echeta unu n’ekpere m mgbe niile,+ 17  ka Chineke nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke ebube, wee nye unu mmụọ nke amamihe,+ ka unu wee ghọta ihe ndị ọ na-ekpughe n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere ya+; 18  ebe e meworo ka anya+ nke obi unu hụ ìhè,+ ka unu wee mara ihe bụ́ olileanya+ ahụ bụ nke ọ kpọrọ unu ka unu nweta, ihe bụ́ akụ̀ ahụ dị ebube,+ nke ọ ga-enye ndị nsọ+ dị ka ihe nketa, 19  na ihe oké ịdị ukwuu nke ike+ ya bụ n’ebe anyị bụ́ ndị kwere ekwe nọ. Ọ bụ dị ka ịrụ ọrụ+ nke ịdị ike nke ume ya si dị, 20  bụ́ nke o ji rụọ ọrụ n’ebe Kraịst nọ mgbe o si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya+ ma nye ya oche n’aka nri ya+ n’ebe ndị dị n’eluigwe,+ 21  n’ebe dị elu karịa ọchịchị na ikike na ike na ịbụisi+ ọ bụla na aha ọ bụla a kpọrọ,+ ọ bụghị naanị n’ime usoro ihe a,+ kamakwa n’ime nke ahụ gaje ịbịa.+ 22  O dokwara ihe niile n’okpuru ụkwụ ya,+ meekwa ya onyeisi nke ihe niile+ n’ihi ọgbakọ ya, 23  nke bụ́ ahụ́ ya,+ nke o zuru ezu+ n’ime ya site n’onye ahụ nke na-eme ka ihe niile ju eju n’ime ihe niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji