Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Malakaị 3:1-18

3  “Lee! M na-ezite onye ozi m,+ ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.+ Na mberede, ezi Onyenwe unu,+ bụ́ onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ Ya,+ ya na onye ozi+ nke ọgbụgba ndụ ahụ,+ onye unu nwere mmasị na ya.+ Lee! Ọ ga-abịa,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.+  “Ma ònye pụrụ idi ụbọchị ọ ga-abịa,+ ònye pụkwara iguzo mgbe ọ ga-apụta?+ N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ nke onye na-anụcha ihe,+ dịkwa ka ncha+ nke ndị na-asụ ákwà.+  Ọ ga-anọdụkwa dị ka onye na-anụcha ihe na onye na-eme ka ọlaọcha dị ọcha,+ ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha;+ ọ ga-anụcha ha dị ka ọlaedo,+ nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha, ha ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma+ n’ezi omume.  Onyinye inweta ihu ọma nke Juda na Jeruselem ga-eweta ga-atọ Jehova ụtọ,+ dị ka ọ dị n’oge dị anya gara aga, dịkwa ka ọ dị n’oge ochie.+  “M ga-abịaru unu nso ikpe unu ikpe,+ m ga-agba akaebe ọsọ ọsọ+ megide ndị dibịa afa,+ megidekwa di ma ọ bụ nwunye nke na-akwa iko,+ megidekwa ndị na-aṅụ iyi ụgha,+ megidekwa ndị na-aghọ aghụghọ n’ụgwọ e kwesịrị ịkwụ onye ọrụ,+ na-aghọkwa nwaanyị di ya nwụrụ+ na nwa na-enweghị nna aghụghọ,+ nakwa ndị na-emegbu onye mbịarambịa,+ ha adịghị atụ egwu m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “N’ihi na abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.+ Unu onwe unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị.+  Malite n’ụbọchị ndị nna nna unu, unu agbakụtawo ụkpụrụ m azụ, unu adịghịkwa edebe ha.+ Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. Unu asịwokwa: “Olee otú anyị ga-esi lọghachi?”  “Mmadụ ọ̀ ga-ezu Chineke ohi? Ma unu na-ezu m ohi.” Unu asịwokwa: “Olee otú anyị si ezu gị ohi?” “Ọ bụ n’otu ụzọ n’ụzọ iri nakwa n’onyinye dị iche iche.  Unu na-akọcha m,+ unu na-ezukwa m ohi—mba unu n’ozuzu ya. 10  Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile+ n’ụlọ nkwakọba ihe m, ka nri wee dịrị n’ụlọ m;+ biko, nwaleenụ m n’ihe a,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe+ wee wụsa unu ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.”+ 11  “M ga-abara ihe na-eripịa ihe mba+ n’ihi unu, ọ gaghị ebibi mkpụrụ ala unu mepụtara, osisi vaịn ndị dị n’ubi ga-amịkwara unu mkpụrụ,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 12  “Mba niile ga-akpọkwa unu ndị obi ụtọ,+ n’ihi na unu onwe unu ga-aghọ ala obi ụtọ,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 13  “Okwu unu kwuru megide m dị ike,”+ ka Jehova kwuru. Unu asịwo: “Gịnị ka anyị kwurịtara megide gị?”+ 14  “Unu sịrị, ‘Ọ baghị uru ijere Chineke ozi.+ Olee uru anyị ritere na anyị anọwo na-eme ihe ọ chọrọ anyị n’aka, jegharịakwa n’ihu mgbarụ n’ihi Jehova nke ụsụụ ndị agha?+ 15  Ugbu a kwa, anyị na-akpọ ndị dị mpako ndị obi ụtọ.+ E wuliwokwa ndị na-eme ajọ omume elu.+ Ha anwalewokwa Chineke, ma ọ dịghị ihe mere ha.’”+ 16  N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova+ nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu.+ E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya+ maka ndị na-atụ egwu Jehova nakwa maka ndị na-echebara aha ya echiche.+ 17  “Ha ga-aghọkwa nke m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “n’ụbọchị m ga-eme ka ha bụrụ ihe onwunwe m pụrụ iche.+ M ga-enwekwara ha ọmịiko, dị nnọọ ka mmadụ na-enwere nwa ya nke na-ejere ya ozi ọmịiko.+ 18  Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume,+ n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji