Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Maịka 7:1-20

7  Nke m agwụla,+ n’ihi na adịzi m ka mkpụrụ osisi a ghọtara n’oge okpomọkụ, dị ka mkpụrụ vaịn a tụtụkọtara mgbe e wechara ihe ubi!+ E nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịn a ga-eri, e nweghị mkpụrụ fig mbụ, nke na-agụ mkpụrụ obi m agụụ!+  Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+  Aka ha dị n’ihe ọjọọ, imeta ya nke ọma;+ onyeisi na-ekwu ka e nye ya ihe, onye na-ekpe ikpe na-ekpekwa ikpe iji nata ụgwọ ọrụ,+ onye ukwu na-ekwukwa ihe si ya n’obi, uche nke aka ya;+ ha na-agbakọ aka eme ya.  Onye kasị mma n’ime ha yiri ahịhịa ogwu, onye kasị bụrụ onye ziri ezi n’ime ha dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige.+ Ụbọchị ndị nche gị, mgbe a ga-elebara gị anya, ga-abịa.+ Ugbu a ka ha ga-anọ ná mgbagwoju anya.+  Unu enwela okwukwe n’ebe enyi unu nọ. Unu atụkwasịla enyi ọma unu obi.+ Kpachara anya n’ihe i ji ọnụ gị na-ekwu ná ntị nwaanyị nke dina gị n’obi.+  N’ihi na nwata nwoke na-eleda nna ya anya; nwata nwaanyị na-ebili imegide nne ya;+ nwunye nwa na-ebilikwa imegide nne di ya;+ ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+  Ma mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova.+ M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.+ Chineke m ga-anụ olu m.+  Gị nwaanyị bụ́ onye iro m, aṅụrịla ọṅụ n’ihi ihe mere m.+ Ọ bụ ezie na adawo m, m ga-ebili;+ ọ bụ ezie na m bi n’ọchịchịrị,+ Jehova ga-abụrụ m ìhè.+  M ga-edi ọnụma Jehova—n’ihi na emehiewo m ya+—ruo mgbe o kpechitere ọnụ m, meekwa ka m nweta ikpe ziri ezi.+ Ọ ga-akpọrọ m bịa n’ìhè; m ga-elekwasị ezi omume ya anya.+ 10  Onye iro m ga-ahụ ya, ihere ga-emegbukwa ya,+ bụ́ onye nọ na-ajụ m, sị: “Olee ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ?”+ M ga na-ele onye iro m anya.+ Ọ ga-aghọ ebe a ga na-azọtọ azọtọ, dị ka apịtị dị n’okporo ámá.+ 11  Ụbọchị a ga-eji nkume wuo mgbidi gị, n’ụbọchị ahụ iwu ga-adị n’ebe dị anya.+ 12  N’ụbọchị ahụ, ha ga-esi ọbụna n’Asiria na obodo ndị dị n’Ijipt bịakwute gị, ha ga-esi n’Ijipt ruo ọbụna n’Osimiri Yufretis;+ si n’otu oké osimiri ruo n’oké osimiri ọzọ, sikwa n’otu n’ugwu ruo n’ugwu ọzọ.+ 13  Ala a ga-aghọ ebe tọgbọrọ n’efu n’ihi ndị bi ya, n’ihi ihe ha metara.+ 14  Jiri mkpara gị zụọ ndị gị dị ka atụrụ,+ bụ́ ìgwè atụrụ nke ihe nketa gị, onye naanị ya bi n’oké ọhịa—n’ime ubi mkpụrụ osisi.+ Ka ha taa nri n’ala Beshan na Gilied+ dị ka n’oge dị anya gara aga.+ 15  “M ga-egosi ya ihe ndị dị ebube dị ka m gosiri ya n’ụbọchị i si n’ala Ijipt pụta.+ 16  Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ike ha dum ga-eme ha.+ Ha ga-ekpuchi aka n’ọnụ ha;+ ntị ga-echi ha. 17  Ha ga-aracha ájá dị ka agwọ;+ dị ka anụ na-akpụ akpụ n’elu ala, ha ga-esi ná mgbidi ha ndị siri ike mara jijiji pụta.+ Ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova bụ́ Chineke anyị, ha ga-atụkwa gị egwu.”+ 18  Olee Chi dị ka gị,+ onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu+ nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma* na-atọ ya ụtọ.+ 19  Ọ ga-emere anyị ebere ọzọ;+ ọ ga-azọdakwa njehie anyị.+ Ị ga-atụbakwa mmehie ha niile n’ala ala oké osimiri.+ 20  Ị ga-egosi Jekọb ikwesị ntụkwasị obi, gosikwa Ebreham obiọma, bụ́ nke ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi n’ụbọchị dị anya gara aga.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Maị 7:18*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”