Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Maịka 6:1-16

6  Biko, nụrụnụ ihe Jehova na-ekwu.+ Bilienụ, ka ugwu ukwu niile nụrụ okwu ikpe unu, ka ugwu nta niile nụkwa olu unu.+  Nụrụnụ okwu ikpe Jehova, unu ugwu niile, nụrụkwanụ, unu ihe ndị na-adịte anya, unu ntọala ụwa;+ n’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu ikpe, ọ bụkwa ya na Izrel ga-arụrịta ụka:+  “Ndị m,+ gịnị ka m mere unu? Oleekwa otú m si mee ka ike m gwụ unu?+ Gbagidenụ m akaebe.+  Esi m n’ala Ijipt kpọpụta unu,+ ọ bụkwa n’ụlọ ndị ohu ka m gbapụtara unu;+ m wee zitere unu Mozis, Erọn na Miriam.+  Bikonụ, ndị m, chetanụ+ nkata Belak eze Moab kpara,+ nakwa ihe Belam nwa Biọ zara ya.+ Ọ bụ malite na Shitim+ ruo na Gilgal+ ka ihe a mere, ka e wee mara ọrụ ezi omume niile nke Jehova.”+  Olee ihe m ga-eji gakwuru+ Jehova? Olee ihe m ga-eji kpọọrọ Chineke nke nọ n’elu isiala?+ M̀ ga-eji àjà a na-esurecha n’ọkụ gakwuru ya,+ m̀ ga-eji ụmụ ehi ndị gbara otu afọ?  Jehova ọ̀ ga-enwe mmasị na puku kwuru puku ebule, ọ̀ ga-enwe mmasị ná mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi?+ M̀ ga-enye ọkpara m maka nnupụisi m, m̀ ga-enyekwa mkpụrụ nke afọ m maka mmehie nke mkpụrụ obi m?+  Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+  Olu Jehova na-akpọ obodo òkù,+ onye nwere ezi amamihe ga-atụkwa egwu aha gị.+ Nụrụnụ ihe mkpanaka ahụ na onye họpụtara ya na-ekwu.+ 10  À ka nwere akụ̀ ajọ omume n’ụlọ onye ajọ omume,+ ma ọ bụ ntakịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa na-adịghị mma? 11  M̀ pụrụ ịdị ọcha ma m nwee ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị mma na akpa nkume e ji atụ̀ ihe bụ́ nke aghụghọ?+ 12  N’ihi na ndị ọgaranya ya ejupụtawo n’ime ihe ike, ndị bi na ya ekwuwokwa okwu ụgha,+ ire dị ha n’ọnụ na-aghọkwa aghụghọ.+ 13  “Mụ onwe m ga-eme ka ị daa ọrịa site n’iti gị ihe;+ m ga-eme ka ị tọgbọrọ n’efu n’ihi mmehie gị.+ 14  Gị onwe gị ga-eri ihe ma afọ agaghị eju gị, o nweghị ihe ga-adị gị n’afọ.+ Ị ga-akwapụtakwa ihe, ma ị gaghị echekwa ha; ihe ọ bụla ị ga-akwapụta ka i chekwaa, m ga-enyefe ya n’aka mma agha.+ 15  Gị onwe gị ga-akụ mkpụrụ, ma ị gaghị aghọrọ ya. Gị onwe gị ga-azọcha mkpụrụ oliv, ma ị gaghị ete mmanụ; ị ga-azọchapụta mmanya dị ụtọ, ma ị gaghị aṅụ mmanya.+ 16  Unu na-edebe ụkpụrụ Ọmraị+ ma na-arụ ọrụ niile nke ụlọ Ehab rụrụ,+ unu na-agakwa ije na ndụmọdụ ha;+ ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka obodo a ghọọ ihe ijuanya, meekwa ka ndị bi n’ime ya bụrụ ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị;+ unu ga-eburukwa nkọcha nke ndị dị iche iche.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji