Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 7:1-38

7  “‘Nke a bụ iwu metụtara àjà ikpe ọmụma:+ Ọ bụ ihe kasị nsọ.+  N’ebe+ ha na-egbu anụ àjà nsure ọkụ ka ha ga-anọ gbuo anụ àjà ikpe ọmụma, a ga-efesakwa+ ọbara+ ya gburugburu n’elu ebe ịchụàjà.  Ma ọ ga-achụ abụba+ ya dum n’àjà, bụ́ ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba nakwa abụba nke kpuchiri eriri afọ ya,  tinyere akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha, ya bụ, abụba dị n’úkwù ya. Ọ ga-ewepụtakwa abụba dị n’elu imeju ya, ya na akụrụ ya.+  Onye nchụàjà ga-esure ha n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova.+ Ọ bụ àjà ikpe ọmụma.  Nwoke ọ bụla so ná ndị nchụàjà ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya. Ọ bụ ihe kasị nsọ.+  Otú àjà mmehie dị, otú ahụ ka àjà ikpe ọmụma dị. Otu iwu na-achị ha.+ Ọ ga-aghọ nke onye nchụàjà ahụ nke ga-eji ya kpuchie mmehie.  “‘Ma onye nchụàjà nke chụụrụ onye ọ bụla àjà nsure ọkụ, akpụkpọ+ anụ nke àjà nsure ọkụ ahụ, bụ́ nke onye ahụ wetaara onye nchụàjà, ga-aghọ nke onye nchụàjà ahụ.  “‘Àjà ọka* ọ bụla e ghere n’ekwú+ nakwa nke ọ bụla e ji mmanụ ghee n’ime ite nwere afọ+ nakwa nke e ghere n’ite+ bụ nke onye nchụàjà chụrụ ya n’àjà. Ọ ga-aghọ nke ya.+ 10  Ma àjà ọka ọ bụla a gwara mmanụ+ ma ọ bụ nke dị gharị gharị+ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn niile, onye ọ bụla ga-enweta dị ka ibe ya nwetara. 11  “‘Nke a bụ iwu metụtara àjà udo+ nke onye ọ bụla ga-ewetara Jehova: 12  Ọ bụrụ na ọ ga-eweta ya iji nye ekele,+ ọ ga-eweta àjà ekele ahụ ya na achịcha na-ekoghị eko nke a gwara mmanụ na achịcha dị fere fere na-ekoghị eko nke e tere mmanụ,+ tinyere ntụ ọka e gweriri egweri nke a gwọrọ nke ọma, n’ụdị achịcha a gwara mmanụ. 13  Mgbe ọ na-eweta àjà udo ya bụ́ àjà ekele, ọ ga-eweta ihe a ga-eji chụọrọ ya àjà, ya na achịcha koro eko.+ 14  Ọ ga-esikwa na nke ọ bụla n’ime ha were otu ka ọ bụrụ òkè dị nsọ nye Jehova;+ ọ ga-aghọ nke onye nchụàjà bụ́ onye fesara ọbara anụ àjà udo ahụ n’elu ebe ịchụàjà.+ 15  A ga-eri anụ àjà udo ya, bụ́ àjà ekele, n’ụbọchị ọ chụrụ àjà ya. Ọ gaghị edofọ nke ọ bụla ruo ụtụtụ.+ 16  “‘Ọ bụrụ na àjà o wetara ka a chụọrọ ya bụ nkwa o kwere+ ma ọ bụ àjà afọ ofufo,+ a ga-eri ya n’ụbọchị ọ chụrụ àjà ahụ, e nwekwara ike iri nke fọdụrụ na ya echi ya. 17  Ma ihe fọdụrụ n’anụ ahụ a chụrụ n’àjà n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+ 18  Otú ọ dị, ọ bụrụ na e rie anụ àjà udo ya n’ụbọchị nke atọ, a gaghị anabata onye wetara àjà ahụ nke ọma.+ A gaghị agụnyere ya nke a.+ Ọ ga-aghọ ihe rụrụ arụ, mkpụrụ obi nke riri ụfọdụ n’ime ya ga-aza ajụjụ maka njehie ya.+ 19  A gaghị eri anụ ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha eri.+ A ga-akpọ ya ọkụ. Ma anụ ndị nke ọzọ, onye ọ bụla dị ọcha nwere ike iri ya. 20  “‘Mkpụrụ obi ọ bụla nke riri anụ àjà udo, bụ́ nke a chụụrụ Jehova, mgbe ọ na-adịghị ọcha, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+ 21  Ọ bụrụkwa na mkpụrụ obi emetụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha aka, bụ́ ihe na-adịghị ọcha si n’ahụ́ mmadụ pụta+ ma ọ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha+ ma ọ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha nke a na-asọ oyi,+ wee rie ụfọdụ n’ime anụ àjà udo, bụ́ nke a chụụrụ Jehova n’àjà, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.’” 22  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 23  “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Unu erila abụba ọ bụla+ nke oké ehi ma ọ bụ nke nwa ebule ma ọ bụ nke ewu. 24  A pụrụ iji abụba nke anụ nwụrụ anwụ na abụba nke anụ a dọgburu adọgbu+ mee ihe ọ bụla ọzọ, ma unu erila ya ma ọlị. 25  N’ihi na onye ọ bụla nke riri abụba nke si n’anụ o ji chụọrọ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ, a ga-ebipụ mkpụrụ obi riri ya+ n’etiti ndị ya. 26  “‘Unu erila ọbara ọ bụla+ n’ebe ọ bụla unu bi, ma ọ̀ bụ nke anụ ufe ma ọ bụ nke anụ ọhịa. 27  Mkpụrụ obi ọ bụla nke riri ọbara ọ bụla, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ+ n’etiti ndị ya.’” 28  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 29  “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Onye na-ewetara Jehova àjà udo, ga-ewere ụfọdụ n’ime àjà udo+ ya chụọrọ Jehova àjà. 30  Ọ ga-eji aka ya weta abụba ya,+ tinyere obi ya, ka ọ bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova. Ọ ga-eweta ya na obi ya ka e wee fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova. 31  Onye nchụàjà ga-esure abụba ahụ n’ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà, ma obi ya ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya.+ 32  “‘Unu ga-enyekwa onye nchụàjà ụkwụ aka nri ya ịbụ òkè dị nsọ+ site n’àjà udo unu. 33  Onye ọ bụla n’ime ụmụ Erọn nke chụrụ ọbara nke anụ àjà udo na abụba ya n’àjà ga-enweta ụkwụ aka nri ya dị ka òkè ya.+ 34  N’ihi na m na-anara ụmụ Izrel obi anụ àjà a na-efegharị efegharị+ na ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ site n’àjà udo ha, m ga-anara ha ụmụ Izrel nye Erọn bụ́ onye nchụàjà na ụmụ ya, ka ọ bụrụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka. 35  “‘Ọ bụ nke a bụ òkè Erọn dị ka onye nchụàjà nakwa òkè ụmụ ya dị ka ndị nchụàjà site n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, n’ụbọchị ọ kpọtara+ ha nso ijere Jehova ozi dị ka ndị nchụàjà, 36  dị nnọọ ka Jehova nyere n’iwu ka e were ya nye ha n’ụbọchị o tere ha mmanụ+ n’etiti ụmụ Izrel. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka.’”+ 37  Nke a bụ iwu metụtara àjà nsure ọkụ,+ àjà ọka+ na àjà mmehie+ na àjà ikpe ọmụma+ na àjà e ji ahọpụta mmadụ+ na àjà udo,+ 38  dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu n’Ugwu Saịnaị,+ n’ụbọchị o nyere ụmụ Izrel iwu ịchụrụ Jehova àjà n’ala ịkpa Saịnaị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Le 7:9*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.