Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 26:1-46

26  “‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru,+ unu eguzobekwarala onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi nsọ, unu edebela nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike m,+ na-atụkwa ebe nsọ m ụjọ. Abụ m Jehova.  “‘Ọ bụrụ na unu ana-eje ije n’ụkpụrụ m, na-edebekwa ihe m nyere n’iwu ma na-eme ha,+  m ga-enye unu mmiri ozuzo n’oge kwesịrị ekwesị,+ ala unu ga-emepụtakwa ihe,+ osisi ndị dị n’ubi ga-amịkwa mkpụrụ.+  Oge nzọcha mkpụrụ unu ga-adịgide ruo n’oge ịghọ mkpụrụ vaịn, oge ịghọ mkpụrụ vaịn unu ga-adịgide ruo n’oge ịgha mkpụrụ; unu ga-erikwa nri unu rijuo afọ+ wee biri n’ala unu n’obi iru ala.+  M ga-eme ka udo dị n’ala unu,+ unu ga-edinakwa ala n’enweghị onye ga-eme ka unu maa jijiji;+ m ga-eme ka a ghara inwekwa ajọ anụ ọhịa n’ala unu,+ mma agha agaghịkwa agabiga n’ala unu.+  Unu ga-achụkwa ndị iro unu ọsọ,+ ha ga-adakwa n’ihu unu site ná mma agha.  Mmadụ ise n’ime unu ga-achụ otu narị mmadụ ọsọ, otu narị mmadụ n’ime unu ga-achụ puku mmadụ iri ọsọ, ndị iro unu ga-adakwa n’ihu unu site ná mma agha.+  “‘M ga-eche ihu m n’ebe unu nọ+ wee mee ka unu mụọ ọmụmụ, meekwa ka unu baa ụba,+ m ga-emezu ọgbụgba ndụ mụ na unu.+ 10  Unu ga-eri ihe ochie unu wetara n’ubi n’afọ gara aga,+ unu ga-ewepụta ihe ochie unu wetara n’ubi iji nye ohere maka nke ọhụrụ. 11  M ga-eme ka ụlọikwuu m dịrị n’etiti unu,+ mkpụrụ obi m agaghịkwa akpọ unu asị.+ 12  M ga-ejegharịkwa n’etiti unu wee bụrụ Chineke unu,+ unu onwe unu ga-abụkwa ndị m.+ 13  Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt ka unu kwụsị ịgbara ha ohu,+ m wee gbajie osisi yok unu ma mee ka unu guzoro kwem na-eje ije.+ 14  “‘Otú ọ dị, ọ bụrụ na unu egeghị m ntị, gharakwa idebe iwu ndị a niile,+ 15  ọ bụrụ na unu ajụ ụkpụrụ m,+ ọ bụrụkwa na mkpụrụ obi unu akpọọ mkpebi ikpe m asị wee ghara ime ihe m nyere n’iwu, ruo n’ókè nke imebi ọgbụgba ndụ m,+ 16  mụ onwe m ga-eme unu ihe ndị a, iji nye unu ntaramahụhụ, m ga-eme ka ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ mee ka ha maa jijiji, bụ́ ndị ga-eme ka unu ghara ịhụkwa ụzọ,+ meekwa ka ike gwụ mkpụrụ obi unu.+ Unu ga-aghakwa mkpụrụ unu n’efu, ebe ndị iro unu ga-erichapụ ya.+ 17  M ga-eche ihu m megide unu, ndị iro unu ga-emeri unu;+ ndị kpọrọ unu asị ga-azọ unu ụkwụ,+ unu ga-agbakwa ọsọ mgbe ọ na-adịghị onye na-achụ unu.+ 18  “‘Ọ bụrụ na unu egeghị m ntị n’agbanyeghị ihe ndị a, m ga-apịa unu ihe okpukpu asaa maka mmehie unu.+ 19  M ga-agbaji ike unu nke na-ebu unu isi, meekwa ka eluigwe unu dị ka ígwè,+ meekwa ka ala unu dị ka ọla kọpa. 20  Unu ga-emefusi ike unu na nkịtị, ala unu agaghị emepụta ihe,+ osisi ndị dị n’ala agaghịkwa amị mkpụrụ.+ 21  “‘Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eje ije imegide m ma ghara ịchọ ige m ntị, aghaghị m itikwu unu ihe okpukpu asaa, dị ka mmehie unu si dị.+ 22  M ga-eme ka anụ ọhịa bata n’etiti unu,+ ha ga-agbawa unu aka ụmụ+ ma gbuchapụ anụ ụlọ unu, meekwa ka ọnụ ọgụgụ unu belata, ụzọ unu ga-atọgbọkwa chakoo.+ 23  “‘Otú o sina dị, ọ bụrụ na unu ekweghị ka m jiri ihe ndị a gbazie unu,+ unu ewee na-eje ije megide m, 24  ee, mụ onwe m aghaghị ije ije megide unu;+ ọbụna mụ onwe m aghaghị iti unu ihe okpukpu asaa maka mmehie unu.+ 25  M ga-emekwa ka mma agha nke na-abọ ọbọ+ maka ọgbụgba ndụ+ m bịakwasị unu; unu ga-agbakọta n’obodo unu dị iche iche, m ga-eme ka ọrịa na-efe efe bịa n’etiti unu,+ a ga-enyefekwa unu n’aka ndị iro.+ 26  Mgbe m gbajiri mkpara unu ji ekonye achịcha,+ ndị inyom iri ga na-emere unu achịcha n’otu ekwú ma na-atụ achịcha ha na-enye unu atụ̀;+ unu ga-eri ihe ma afọ agaghị eju unu.+ 27  “‘Otú ọ dị, ọ bụrụ na nke a agaghị eme ka unu gee m ntị, unu ewee na-eje ije imegide m,+ 28  mgbe ahụ, aghaghị m iji ọnụma m jee ije megide unu,+ ee, mụ onwe m ga-apịa unu ihe okpukpu asaa maka mmehie unu.+ 29  Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, unu ga-erikwa anụ ụmụ unu ndị inyom.+ 30  M ga-alakwa ebe ndị dị elu+ unu ndị dị nsọ n’iyi, gbupụsịakwa ihe unu ji adọba ihe nsure ọkụ unu na-esi ísì ụtọ ma mee ka ozu unu tọgbọrọ n’elu ozu arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị;+ mkpụrụ obi m ga-akpọkwa unu asị.+ 31  M ga-enyefe obodo unu dị iche iche n’ọnụ mma agha+ ma mee ka ebe nsọ unu niile tọgbọrọ n’efu,+ m gaghị anụrụ ísì ụtọ nke àjà unu.+ 32  Mụ onwe m ga-eme ka ala unu tọgbọrọ n’efu,+ ndị iro unu bụ́ ndị ga-ebi n’ime ya ga-ekporopụ anya na-ele ya.+ 33  Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu. 34  “‘N’oge ahụ, ala unu ga-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji n’ụbọchị niile ọ ga-atọgbọrọ n’efu, mgbe unu ga-anọ n’ala ndị iro unu. N’oge ahụ, ala unu ga-edebe ụbọchị izu ike, ebe ọ na-aghaghị ịkwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+ 35  Ọ ga-edebe ụbọchị izu ike n’ụbọchị niile ọ ga-atọgbọrọ n’efu, n’ihi na o debeghị ụbọchị izu ike n’ụbọchị izu ike unu dị iche iche mgbe unu bi na ya. 36  “‘Ma m ga-eme ka obi lọọ ndị fọdụrụ n’etiti unu+ mmiri n’ala ndị iro ha; mkpọtụ nke akwụkwọ ifufe na-ebugharị na-eme ga-eme ka ha gbaa ọsọ, ha ga-agba ọsọ dị ka ebe mmadụ na-agba ọsọ n’ihi mma agha, ha ga-adakwa n’enweghị onye na-achụ ha.+ 37  Ha ga na-adagide ibe ha dị ka à ga-asị na ha na-agba ọsọ n’ihi mma agha, n’enweghị onye na-achụ ha, unu agaghị enwe ike iguzogide ndị iro unu.+ 38  Unu ga-alakwa n’iyi n’etiti mba dị iche iche,+ ala ndị iro unu ga-eripịa unu. 39  Ma ndị fọdụrụ n’etiti unu ga-erekasị+ n’ala ndị iro unu n’ihi njehie ha. Ee, ọbụna n’ihi njehie nke ndị nna ha,+ ha ga-erekasị dị ka ha rekasịworo. 40  Ha ga-ekwupụta njehie ha+ nakwa njehie ndị nna ha na ekwesịghị ntụkwasị obi ha n’ụzọ ha si meso m omume ekwesịghị ntụkwasị obi, ee, ọbụna n’ụzọ ha jere ije megide m.+ 41  Mụ onwe m wee jee ije megide ha,+ m wee kpọbata ha n’ala ndị iro ha.+ “‘Ikekwe, obi ha a na-ebighị úgwù+ ga-adị umeala+ n’oge ahụ, ha ga-akwụkwa ụgwọ njehie ha n’oge ahụ. 42  M ga-echetakwa ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb;+ m ga-echeta ọbụna ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik+ na ọbụna ọgbụgba ndụ mụ na Ebreham,+ m ga-echetakwa ala unu. 43  Ka nke a na-eme, ha agaghị ebi n’ala ha, ala ha ga-anọkwa na-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji,+ mgbe ọ ga-atọgbọ nkịtị n’enweghị onye ọ bụla n’ime ha bi na ya, ha onwe ha anọrọkwa na-akwụ ụgwọ njehie ha,+ n’ihi na ha jụrụ mkpebi ikpe m,+ mkpụrụ obi ha kpọkwara ụkpụrụ m asị.+ 44  Ma n’agbanyeghị ihe a dum, mgbe ha nọ n’ala ndị iro ha, agaghị m ajụ ha,+ agaghịkwa m akpọ ha asị+ wee kpochapụ ha, mebie ọgbụgba ndụ+ mụ na ha; n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha. 45  N’ihi ha, m ga-echeta ọgbụgba ndụ mụ na ndị nna nna ha+ bụ́ ndị m kpọpụtara n’ala Ijipt n’ihu mba dị iche iche,+ iji gosi na m bụ Chineke ha. Abụ m Jehova.’” 46  Ndị a bụ ụkpụrụ na mkpebi ikpe+ na iwu ndị Jehova guzobere n’agbata ya na ụmụ Izrel n’Ugwu Saịnaị site n’aka Mozis.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji