Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 22:1-33

22  Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ, sị:  “Gwa Erọn na ụmụ ya ka ha ghara imetụ ihe ndị dị nsọ ụmụ Izrel na-eweta aka, wee ghara imerụ aha m dị nsọ+ n’ihe ndị ha na-edoro m nsọ.+ Abụ m Jehova.  Sị ha, ‘N’ọgbọ unu niile, nwoke ọ bụla nke bụ́ otu n’ime mkpụrụ unu niile, nke bịara nso n’ihe ndị dị nsọ, bụ́ nke ụmụ Izrel ga-edoro Jehova nsọ, mgbe ọ na-adịghị ọcha,+ a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’ihu m. Abụ m Jehova.  Ọ dịghị nwoke ọ bụla bụ́ nwa Erọn nke na-arịa ekpenta+ ma ọ bụ nke ihe na-agbapụta n’ahụ́+ nke ga-eri ihe dị nsọ ruo mgbe ọ dịrị ọcha,+ onye metụrụ onye ọ bụla mkpụrụ obi nwụrụ anwụ+ mere ka ọ ghara ịdị ọcha aka ma ọ bụ metụ nwoke ọbara ọcha na-agbapụta n’ahụ́+ aka agaghịkwa eri ya,  onye metụrụ ihe ọ bụla na-enupụta n’ìgwè aka, bụ́ ihe bụụrụ ya ihe na-adịghị ọcha,+ ma ọ bụ, onye metụrụ onye bụụrụ ya onye na-adịghị ọcha aka, agaghịkwa eri ya, n’agbanyeghị ihe mere ka ọ ghara ịdị ọcha.+  Mkpụrụ obi ọ bụla nke metụrụ ihe dị otú ahụ aka ga-aghọ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede, ọ gaghịkwa eri nke ọ bụla n’ihe ndị dị nsọ, kama ọ ga-eji mmiri saa ahụ́ ya.+  Mgbe anyanwụ dara, ọ ga-abụ onye dị ọcha, e mesịa, ọ pụrụ iri ụfọdụ n’ime ihe ndị dị nsọ, n’ihi na ọ bụ ihe oriri ya.+  Ọ gaghịkwa eri anụ ọ bụla nwụrụ anwụ ma ọ bụ ihe ọ bụla anụ ọhịa dọgburu wee bụrụ onye na-adịghị ọcha site n’iri ya.+ Abụ m Jehova.  “‘Ha ga-arụkwa ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ m, ka ha ghara ime mmehie n’ihi ya wee nwụọ+ maka ya n’ihi na ha na-emerụ ya. Abụ m Jehova, onye na-edo ha nsọ. 10  “‘Ọ dịghị onye nkịtị ga-eri ihe ọ bụla dị nsọ.+ Ọ dịghị onye mbịarambịa ya na onye nchụàjà bi ma ọ bụ onye ọrụ e goro ego nke ga-eri ihe ọ bụla dị nsọ. 11  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà azụta mkpụrụ obi, bụ́ onye o ji ego ya zụta, onye ahụ pụrụ iso rie ya. Ndị ohu a mụrụ n’ụlọ ya pụkwara iso rie ihe oriri ya.+ 12  Ọ bụrụ na nwa onye nchụàjà aghọọ nwunye onye bịara abịa, ọ gaghị eri ihe si n’onyinye ndị dị nsọ. 13  Ma ọ bụrụ na di nwa onye nchụàjà anwụọ ma ọ bụ a gbaa ya alụkwaghịm mgbe ọ na-amụtabeghị nwa, o wee laghachi n’ụlọ nna ya, nọrọ otú ọ nọ mgbe ọ bụ nwa agbọghọ,+ ọ ga-eso eri ihe oriri nna ya;+ ma ọ dịghị onye ọ bụla bịara abịa ga-eri ya. 14  “‘Ọ bụrụ na mmadụ erie ihe dị nsọ n’amaghị ama,+ ọ ga-atụkwasị otu ụzọ n’ụzọ ise+ nke ihe ahụ n’elu ya wee were ihe ahụ dị nsọ nye onye nchụàjà. 15  Ya mere, ha agaghị emerụ ihe ndị dị nsọ nke ụmụ Izrel, ndị ha ga-enye Jehova n’onyinye,+ 16  wee mee ka ha taa ahụhụ n’ihi ịbụ ndị ikpe mara maka iri ihe ha ndị dị nsọ; n’ihi na abụ m Jehova, onye na-edo ha nsọ.’” 17  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 18  “Gwa Erọn na ụmụ ya nakwa ụmụ Izrel dum okwu, sị ha, ‘Onye ọ bụla nke si n’ụlọ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nọ n’Izrel nke na-eweta onyinye ya,+ n’ihi nkwa ọ bụla+ o kwere ma ọ bụ n’ihi nke ọ bụla n’onyinye afọ ofufo ya,+ bụ́ nke ọ ga-enye Jehova maka àjà nsure ọkụ, 19  iji nweta ihu ọma,+ ọ ga-abụ nke ahụ́ dị mma,+ oké nke si n’ìgwè ehi, n’etiti ụmụ ebule ma ọ bụ n’etiti ewu. 20  Unu ewetala ihe ọ bụla nwere nkwarụ,+ n’ihi na ọ gaghị eme ka unu nweta ihu ọma. 21  “‘Ọ bụrụ na mmadụ ewetara Jehova àjà udo+ iji mezuo ihe o kwere ná nkwa+ ma ọ bụ weta ya dị ka onyinye afọ ofufo, ọ ga-abụ nke ahụ́ dị mma nke si n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ, iji nweta ihu ọma. Ọ gaghị enwe nkwarụ ọ bụla. 22  Ọ dịghị nke ọ bụla kpuru ìsì ma ọ bụ nke ọkpụkpụ gbajiri ma ọ bụ nke nwere apa ma ọ bụ ákpụ̀ ma ọ bụ akpụkpa ma ọ bụ ọkpụisi eri ngo+ unu ga-ewetara Jehova, unu agaghịkwa esi na ha suree àjà a na-esure n’ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà nye Jehova. 23  Ma ehi ma ọ bụ atụrụ nke otu akụkụ ahụ́ ya dị ogologo ma ọ bụ dị mkpụmkpụ karịa ibe ya,+ unu pụrụ iji ya nye onyinye afọ ofufo; ma, ọ bụrụ na unu ga-eji ya kwụọ nkwa unu kwere, a gaghị anara ya nke ọma. 24  Ma, nke a pịrị amụ+ ma ọ bụ nke e gwepịara mkpụrụ amụ ya egwepịa ma ọ bụ dọpụ ya adọpụ ma ọ bụ bepụ ya ebepụ, unu ewetarala ya Jehova, unu achụkwala ha n’àjà n’ala unu. 25  Unu achụla nke ọ bụla n’ime ihe ndị a niile nke onye mba ọzọ wetara n’àjà ka ọ bụrụ ihe oriri Chineke unu, n’ihi na ha rụrụ arụ. Ha nwere nkwarụ.+ A gaghị anara ha nke ọma+ n’aka unu.’” 26  Jehova gwakwara Mozis, sị: 27  “Ọ bụrụ na a mụọ oké ehi ma ọ bụ nwa ebule ma ọ bụ ewu, ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa,+ ma malite n’ụbọchị nke asatọ gaa n’ihu, a ga-anara ya nke ọma dị ka onyinye, ka ọ bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova. 28  Unu egbula ehi ma ọ bụ atụrụ na nwa ya n’otu ụbọchị.+ 29  “Ọ bụrụ na unu na-achụrụ Jehova àjà ekele,+ unu ga-achụ ya iji nwetara onwe unu ihu ọma. 30  A ga-eri ya n’ụbọchị ahụ.+ Unu edofọla nke ọ bụla n’ime ya ruo ụtụtụ.+ Abụ m Jehova. 31  “Debenụ ihe m nyere n’iwu ma na-eme ha.+ Abụ m Jehova. 32  Unu emerụla aha nsọ m,+ a ga-edokwa m nsọ n’etiti ụmụ Izrel.+ Abụ m Jehova, onye na-edo unu nsọ,+ 33  bụ́ Onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Abụ m Jehova.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji