Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 21:1-24

21  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Gwa ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn okwu, sị ha, ‘Ka onye ọ bụla ghara imerụ onwe ya n’etiti ndị ya site n’imetụ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ aka.+  Ma, ọ bụrụ onye ya na ya bụ otu ọbara, onye dị ya nso, nne ya na nna ya na nwa ya nwoke na nwa ya nwaanyị na nwanne ya nwoke  na nwanne ya nwaanyị, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye dị ya nso, onye na-enweghị nwoke na-alụ ya, o nwere ike imerụ onwe ya.  Ọ gaghị emerụ onwe ya n’ihi nwaanyị a lụ alụ n’etiti ndị ya wee mee onwe ya ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ.  Ha agaghị akwọcha isi ha,+ ha agaghịkwa akpụchapụ ọnụ ọnụ ajị agba ha,+ ha agaghịkwa akawa ahụ́ ha.+  Ha ga-adị nsọ nye Chineke ha,+ ha agaghịkwa emerụ aha Chineke ha,+ n’ihi na ọ bụ ha na-esure àjà Jehova ndị a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe oriri Chineke ha;+ ha ga-adị nsọ.+  Ha agaghị alụ akwụna+ ma ọ bụ nwaanyị e merụrụ emerụ; ha agaghịkwa alụ+ nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm,+ n’ihi na ọ bụ onye nchụàjà dị nsọ nye Chineke ya.  Doo ya nsọ,+ n’ihi na ọ bụ ya na-ewetara Chineke unu ihe oriri. Ọ ga-adị nsọ nye unu,+ n’ihi na mụ onwe m Jehova, onye na-edo unu nsọ, dị nsọ.+  “‘Ọ bụrụ na nwa nwaanyị nke onye nchụàjà emerụọ onwe ya site n’ịgba akwụna, ọ bụ nna ya ka ọ na-emerụ. A ga-akpọ ya ọkụ.+ 10  “‘Ma onye bụ́ onyeisi nchụàjà n’etiti ụmụnne ya, bụ́ onye a ga-ete mmanụ n’isi,+ nke a ga-emekwa ka o nwee ikike iyi uwe+ onyeisi nchụàjà, agaghị ahapụ isi ya n’edozighị ya edozi,+ ọ gaghịkwa adọwa uwe ya.+ 11  Ọ gaghị abịa n’ebe mkpụrụ obi ọ bụla nwụrụ anwụ dị.+ Ọ gaghị emerụ onwe ya n’ihi nna ya na nne ya. 12  Ọ gaghịkwa esi n’ebe nsọ pụọ, ọ gaghịkwa emerụ ebe nsọ nke Chineke ya,+ n’ihi na ihe àmà nke nraranye, bụ́ mmanụ Chineke ya ji ete mmadụ mmanụ,+ dị n’isi ya. Abụ m Jehova. 13  “‘Ya onwe ya ga-alụkwa nwaanyị na-amaghị nwoke.+ 14  Ma ọ gaghị alụ nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm na nke e merụrụ emerụ, bụ́ akwụna, kama ọ ga-alụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke site n’etiti ndị ya. 15  Ọ gaghịkwa emerụ mkpụrụ ya n’etiti ndị ya,+ n’ihi na abụ m Jehova, onye na-edo ya nsọ.’”+ 16  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 17  “Gwa Erọn, sị, ‘Ọ dịghị onye ọ bụla nwere nkwarụ+ n’ime mkpụrụ gị n’ọgbọ ha niile ga-abịa nso ịchụ ihe oriri Chineke ya n’àjà.+ 18  Ọ bụrụ na e nwee onye nwere nkwarụ, ọ gaghị abịa nso: nwoke kpuru ìsì ma ọ bụ nke dara ngwọrọ ma ọ bụ nke nwere imi mpịa ma ọ bụ nke otu akụkụ ahụ́ ya dị oké ogologo,+ 19  ma ọ bụ nwoke ụkwụ ya gbajiri agbaji ma ọ bụ nke aka ya gbajiri agbaji, 20  ma ọ bụ nke nwere mkpumkpu azụ ma ọ bụ onye ihe mere n’anya ma ọ bụ onye akpụkpa na-ata ma ọ bụ onye nwere ọkpụisi eri ngo ma ọ bụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.+ 21  Nwoke ọ bụla nwere nkwarụ nke si ná mkpụrụ Erọn onye nchụàjà agaghị abịaru nso isure àjà Jehova ndị a na-esure n’ọkụ.+ O nwere nkwarụ. Ọ gaghị abịaru nso ịchụ ihe oriri Chineke ya n’àjà.+ 22  O nwere ike iri ihe oriri Chineke ya site n’ihe ndị kasị nsọ+ na ihe ndị dị nsọ.+ 23  Ma ọ gaghị abataru n’ákwà mgbochi ahụ,+ ọ gaghịkwa abịaru nso n’ebe ịchụàjà,+ n’ihi na o nwere nkwarụ;+ ọ gaghịkwa emerụ ebe nsọ+ m, n’ihi na abụ m Jehova, onye na-edo ha nsọ.’”+ 24  Mozis wee gwa Erọn na ụmụ ya nakwa ụmụ Izrel niile ihe ndị a.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji