Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 19:1-37

19  Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ, sị:  “Gwa nzukọ ụmụ Izrel dum okwu, sị ha, ‘Unu ga-adị nsọ,+ n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke unu dị nsọ.+  “‘Onye ọ bụla tụọ egwu nne ya na nna ya,+ debekwanụ ụbọchị izu ike m.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  Unu echigharịkwurula chi na-abaghị uru,+ unu emerela onwe unu chi a wụrụ awụ.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  “‘Ọ bụrụ na unu achụọrọ Jehova àjà udo,+ unu ga-achụ ya iji nwetara onwe unu ihu ọma.+  A ga-eri anụ ya n’ụbọchị unu chụrụ àjà ahụ nakwa n’echi ya, ma a ga-akpọ nke fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ọkụ.+  Otú ọ dị, ọ bụrụ na e rie ya n’ụbọchị nke atọ, ọ bụ ihe rụrụ arụ.+ A gaghị anabata ya nke ọma.+  Onye riri ya ga-aza ajụjụ maka njehie ya,+ n’ihi na o merụwo ihe dị nsọ nke Jehova; a ga-ebipụkwa mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.  “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu, unu ewerechala ihe dị n’ọnụ ọnụ ubi unu, unu atụtụkọtala ihe unu wefọrọ n’ubi.+ 10  Unu aghọrọkwala mkpụrụ unu ghọfọrọ+ n’ubi vaịn unu, unu atụtụkọtala mkpụrụ vaịn dasasịrị n’ubi vaịn unu. Unu ga-ahapụ ha maka ndị nọ n’ahụhụ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 11  “‘Unu ezula ohi,+ unu aghọla aghụghọ,+ unu emesola mmadụ ibe unu ihe n’ụzọ aghụghọ.+ 12  Unu ejila aha m ṅụọ iyi ụgha,+ ka unu wee ghara imerụ aha Chineke unu. Abụ m Jehova. 13  Unu erigbula mmadụ ibe unu,+ unu apụnarala mmadụ ihe.+ Ụgwọ ọrụ nke onye ọrụ e goro ego agaghị anọbọ chi n’aka unu.+ 14  “‘Akọchala onye ntị chiri, edebekwala ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu onye ìsì;+ tụọ egwu Chineke gị.+ Abụ m Jehova. 15  “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe,+ unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ.+ Unu ga-ekpe mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi. 16  “‘Agagharịla n’etiti ụmụnna gị iji kwutọọ mmadụ.+ Ebilila ịwụfu ọbara mmadụ ibe gị.+ Abụ m Jehova. 17  “‘Akpọla nwanna gị asị n’ime obi gị.+ Ị ghaghị ịdọ mmadụ ibe gị aka ná ntị,+ ka ị ghara iso ya buru mmehie ya. 18  “‘Abọla ọbọ,+ eburula ụmụ ndị gị+ iwe n’obi; hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.+ Abụ m Jehova. 19  “‘Unu ga-edebe ụkpụrụ m: Unu emela ka ụdị anụ ụlọ abụọ dịgasị iche gbaa onwe ha. Unu aghakọtala ụdị mkpụrụ abụọ n’ubi unu,+ unu eyikwala uwe abụọ nke e ji ụdị eriri abụọ e jikọtara ọnụ kwee.+ 20  “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị edinaa, ọbara ọcha ewee pụta, mgbe nwaanyị ahụ bụ nwaanyị na-ejere nwoke ọzọ ozi, a gbapụtabeghịkwa ya n’ụzọ ọ bụla, e mebeghịkwa ka o nwere onwe ya, a ga-enye ntaramahụhụ ya. A gaghị egbu ha n’ihi na a hapụbeghị ya ka o nwere onwe ya. 21  Nwoke ahụ ga-ewetara Jehova àjà ikpe ọmụma ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, bụ́ ebule àjà ikpe ọmụma.+ 22  Onye nchụàjà ga-eji ebule àjà ikpe ọmụma ahụ kpuchiere ya mmehie ya n’ihu Jehova; a ga-agbaghakwara ya mmehie o mere.+ 23  “‘Ọ bụrụ na unu abata n’ala ahụ, unu akụọkwa osisi ọ bụla maka iri mkpụrụ ya eri, unu ga-ewere mkpụrụ ya dị ka ihe na-adịghị ọcha, dị ka “apị́” ya. Ọ ga-abụrụ unu ihe a na-ebighị úgwù ruo afọ atọ. A gaghị eri ya eri. 24  Ma n’afọ nke anọ ya, mkpụrụ ya niile+ ga-aghọ ihe dị nsọ nye Jehova maka ememme obi ụtọ.+ 25  N’afọ nke ise, unu pụrụ iri mkpụrụ ya; unu mee otú a, ọ ga-amịkwuru unu mkpụrụ.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 26  “‘Unu erikọtala ihe ọ bụla na ọbara.+ “‘Unu achọla ihe mgbaàmà maka ọdịnihu,+ unu emekwala anwansi.+ 27  “‘Unu akpụlatala ajị ndị dị n’akụkụ ntì unu, unu akpụchapụkwala ọnụ ọnụ ajị agba unu.*+ 28  “‘Unu ebekasịla ahụ́ unu maka mkpụrụ obi nwụrụ anwụ,+ unu egbukwala egbugbu n’ahụ́ unu. Abụ m Jehova. 29  “‘Emerụla nwa gị nwaanyị site n’ime ka ọ ghọọ akwụna,+ ka ala a ghara ịbụ nke na-agba akwụna, omume rụrụ arụ ewee jupụta n’ala a.+ 30  “‘Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike m,+ unu ga na-atụkwa ebe nsọ m ụjọ.+ Abụ m Jehova. 31  “‘Unu echigharịkwurula ndị na-agba afa,+ unu ajụkwala ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu ase,+ ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 32  “‘Ị ga-ebiliri onye isi awọ́,+ sọpụkwara onye mere agadi,+ tụọkwa egwu Chineke gị.+ Abụ m Jehova. 33  “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa ebiri n’etiti unu dị ka ọbịa n’ala unu, unu emegbula ya.+ 34  Onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu ga-adịrị unu ka nwa afọ; unu ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe unu,+ n’ihi na unu ghọrọ ndị mbịarambịa n’ala Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 35  “‘Kwụwanụ aka ọtọ mgbe unu na-ekpe ikpe,+ mgbe unu na-atụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ mgbe unu na-atụ ịdị arọ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ mgbe unu na-atụ ihe dị mmiri mmiri. 36  Unu ga-enwe ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi,+ ihe ziri ezi e ji atụ̀ ịdị arọ ihe, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ziri ezi na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin ziri ezi. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt. 37  Ya mere, unu ga-edebe ụkpụrụ m niile na mkpebi ikpe m niile, debenụ ha.+ Abụ m Jehova.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Le 19:27*  O yiri ka ihe a na-ekwu ọ̀ bụ omume ụfọdụ nke ndị na-ekpere arụsị, ọ pụtaghị na ha apụghị ịkpụlata ajị agba ha ma ọlị.