Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 11:1-47

11  Jehova wee gwa Mozis na Erọn okwu, sị ha:  “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nke a bụ ihe e kere eke dị ndụ nke unu nwere ike iri+ n’ime anụmanụ niile dị n’elu ala:  Ihe ọ bụla e kere eke nke ụkwụ ya wara njakpa, nke ụkwụ ya nwekwara mkpịwa, nke na-atagharịkwa ọnụ n’etiti anụmanụ, ọ bụ ya ka unu nwere ike iri.+  “‘Ọ bụ naanị nke a ka unu na-agaghị eri n’etiti anụ ndị na-atagharị ọnụ na ndị ụkwụ ha wara njakpa: kamel, n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.+  Unu erikwala ewi nkume,+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.  Unu erikwala ùrúrù,+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.  Unu erikwala ézì,+ n’ihi na ụkwụ ya wara njakpa, ụkwụ ya nwekwara mkpịwa, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.  Unu erila anụ ha, unu emetụkwala ozu ha aka.+ Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.+  “‘Nke a bụ ihe unu nwere ike iri n’ime ihe ọ bụla dị n’ime mmiri:+ Ihe niile nwere ntù na akpịrịkpa,+ nke dị n’ime mmiri, n’oké osimiri nakwa n’iyi, unu nwere ike iri ha. 10  Ihe niile dị n’oké osimiri nakwa n’iyi, nke na-enweghị ntù na akpịrịkpa, n’ime ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè nakwa n’ime mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke dị n’ime mmiri, ha bụ ihe unu ga na-asọ oyi. 11  Ee, ha ga-abụrụ unu ihe na-asọ oyi. Unu erila anụ ha,+ ozu ha ga na-asọkwa unu oyi. 12  Ihe ọ bụla dị n’ime mmiri nke na-enweghị ntù na akpịrịkpa bụ ihe unu ga na-asọ oyi. 13  “Anụ ufe ndị a ga-abụ ihe unu ga na-asọ oyi.+ E kwesịghị iri ha eri. Ha bụ ihe na-asọ oyi: ugo+ na ugo na-eri azụ̀ na udele ojii, 14  na égbé uhie na égbé ojii,+ n’ụdị ya dị iche iche, 15  na ugoloọma ọ bụla,+ n’ụdị ya dị iche iche, 16  na enyí nnụnụ+ na ikwiikwii na nnụnụ mmiri na agụ nkwọ, n’ụdị ya dị iche iche, 17  na ikwiikwii nta na nnụnụ mmiri bụ́ kọmọrant na ikwiikwii ntị ogologo,+ 18  na ọbọgwụ mmiri na okwolo na udele,+ 19  na ụgbala ọcha na ụgbala mmiri, n’ụdị ya dị iche iche, na nnụnụ huupu na ụsụ.+ 20  Ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè nke nwere nku bụ́ nke ji ụkwụ anọ eje ije bụ ihe unu ga na-asọ oyi.+ 21  “‘Ọ bụ naanị nke a ka unu nwere ike iri n’ime ihe niile e kere eke na-enupụta n’ìgwè bụ́ ndị nwere nku, ndị ji ụkwụ anọ eje ije, ndị nwere ụkwụ e ji amali elu bụ́ ndị ha ji amali elu n’elu ala. 22  Ndị a ka unu nwere ike iri n’ime ha: igurube na-enugharị enugharị,+ n’ụdị ya dị iche iche, na ụdị igurube a na-eri eri,+ n’ụdị ya dị iche iche, na mbụzụ, n’ụdị ya dị iche iche, na ụkpara,+ n’ụdị ya dị iche iche. 23  Ihe ọ bụla ọzọ e kere eke na-enupụta n’ìgwè, nke nwere nku, nke nwekwara ụkwụ anọ, bụ ihe unu ga na-asọ oyi.+ 24  Ihe ndị a ga-eme ka unu ghọọ ndị na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 25  Onye ọ bụla nke bu ozu ha n’ahụ́ ya ga-asụ+ uwe ya, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 26  “‘Anụmanụ ọ bụla nke ụkwụ ya wara njakpa ma ụkwụ ya enweghị mkpịwa, nke na-adịghịkwa atagharị ọnụ, bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.+ 27  Ma ihe ọ bụla e kere eke nke ji ọbụ ụkwụ na ọbụ aka ya eje ije n’etiti ihe niile e kere eke ndị na-eji ụkwụ anọ eje ije ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 28  Onye ọ bụla nke buru ozu+ ha ga-asụ uwe ya,+ ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. Ha ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. 29  “‘Nke a ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha n’etiti ihe e kere eke na-enupụta n’ìgwè n’elu ala:+ nkapị na òké na-amali elu+ na ngwere, n’ụdị ya dị iche iche, 30  na agụ ụlọ na oroburu na ngwere mmiri na ngwere ájá na ogwumagala. 31  Ihe ndị a ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha n’etiti ihe niile e kere eke na-enupụta n’ìgwè.+ Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 32  “‘Ihe ọ bụla ozu nke ọ bụla n’ime ha dakwasịrị ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ arịa e ji osisi mee+ ma ọ bụ uwe ma ọ bụ akpụkpọ anụ+ ma ọ bụ ákwà iru uju.+ A ga-asụnye arịa ọ bụla a na-eji eme ihe n’ime mmiri, ọ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede, mgbe ahụ ọ ga-adị ọcha. 33  Ma ite ụrọ+ ọ bụla nke ozu nke ọ bụla n’ime ha dabara, ihe ọ bụla dị n’ime ya ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, unu ga-akụrikwa ya.+ 34  Ụdị ihe ọ bụla a na-eri eri nke mmiri si na ya wụsara ga-aghọ nke na-adịghị ọcha, ihe ọṅụṅụ ọ bụla nke dị n’arịa ọ bụla, nke mmiri si na ya bara, ga-aghọkwa nke na-adịghị ọcha. 35  Ihe ọ bụla ozu nke ọ bụla n’ime ha dakwasịrị ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha. Ma ọ̀ bụ ekwú ma ọ bụ ihe a na-adọkwasị ite, a ga-akụtu ya. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha, ha ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. 36  Ọ bụ naanị iyi na olulu a hapụrụ ka mmiri dọrọ n’ime ya ga-adịrị ọcha, ma onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 37  Ọ bụrụ na ozu nke ọ bụla n’ime ha adaa n’elu mkpụrụ akụ́kụ́ ọ bụla a ga-akụ akụ, ọ dị ọcha. 38  Ma ọ bụrụ na a wụsa mmiri ná mkpụrụ, akụkụ ọ bụla nke ozu ha adaa n’elu ya, ọ ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. 39  “‘Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’anụmanụ unu nke bụụrụ unu ihe oriri anwụọ, onye ọ bụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 40  Onye riri+ akụkụ ọ bụla nke ozu ya ga-asụ uwe ya, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede; onye bupụkwara ozu ya ga-asụ uwe ya, ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 41  Ihe ọ bụla e kere eke nke na-enupụta n’ìgwè n’elu ala bụ ihe na-asọ oyi.+ A gaghị eri ya eri. 42  Ihe ọ bụla e kere eke nke na-akpụ akpụ+ na ihe ọ bụla na-eji ụkwụ anọ eje ije ma ọ bụ nke ọ bụla nwere ọtụtụ ụkwụ n’ime ihe niile na-enupụta n’ìgwè n’elu ala, unu erila ha, n’ihi na ha bụ ihe na-asọ oyi.+ 43  Unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu bụrụ ihe na-asọ oyi, unu ekwela ka ha mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ha ewee mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 44  N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu;+ unu ga-edo onwe unu nsọ, unu ga-adịkwa nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+ Ya mere, unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu ghara ịdị ọcha. 45  N’ihi na abụ m Jehova onye dupụtara unu n’ala Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu;+ unu ga-adịkwa nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+ 46  “‘Nke a bụ iwu banyere anụmanụ na anụ ufe na mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke na-agagharị n’ime mmiri+ nakwa banyere mkpụrụ obi ọ bụla na-enupụta n’ìgwè n’elu ala, 47  iji kpaa ókè+ n’agbata ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha nakwa n’agbata ihe e kere eke dị ndụ a pụrụ iri eri na ihe e kere eke dị ndụ a na-agaghị eri eri.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji