Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 4:1-24

4  O wee ruo na, ozugbo mba ahụ dum gafesịrị Jọdan,+ Jehova gwara Jọshụa, sị:  “Họrọ ndị ikom iri na abụọ n’etiti ndị Izrel, otu onye n’ebo ọ bụla,+  nyekwa ha iwu, sị, ‘Sinụ n’etiti Jọdan, n’ebe ahụ ndị nchụàjà guzo,+ bute nkume iri na abụọ,+ unu ga-eburukwa ha gafee osimiri ahụ ma busa ha n’ebe unu ga-arahụ+ n’abalị a.’”  Ya mere, Jọshụa kpọrọ ndị ikom iri na abụọ,+ ndị ọ họpụtara n’etiti ụmụ Izrel, otu onye n’ebo ọ bụla;  Jọshụa wee sị ha: “Gaferenụ igbe Jehova bụ́ Chineke unu ruo n’etiti Jọdan, onye nke ọ bụla buru otu nkume n’ubu ya, dị ka ọnụ ọgụgụ ebo ụmụ Izrel si dị,  ka nke a wee bụrụ ihe ịrịba ama n’etiti unu.+ Ọ bụrụ na ụmụ unu ajụọ unu n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị mere unu ji nwee nkume ndị a?’+  Unu ga-asị ha, ‘N’ihi na e gbochiri mmiri Jọdan mgbe e bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova banye na ya.+ Mgbe ọ gafere n’etiti Jọdan, e gbochiri mmiri Jọdan, nkume ndị a ga-abụkwara ụmụ Izrel ihe ncheta ruo mgbe a na-akaghị aka.’”+  Ya mere, ụmụ Izrel mere otú ahụ, dị nnọọ ka Jọshụa nyere n’iwu, ha bukwaara nkume iri na abụọ n’etiti Jọdan, dị nnọọ ka Jehova gwara Jọshụa, dị ka ọnụ ọgụgụ ebo niile nke ụmụ Izrel si dị;+ ha wee buru ha gafee n’ebe ha ga-arahụ+ ma busa ha n’ebe ahụ.  E nwekwara nkume iri na abụọ Jọshụa doro n’etiti Jọdan n’ebe ahụ ndị nchụàjà bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro,+ ha dịkwa n’ebe ahụ ruo taa. 10  Ndị nchụàjà ahụ bu Igbe ahụ guzo n’etiti+ Jọdan ruo mgbe e mechara ihe ahụ niile Jehova nyere Jọshụa iwu ka ọ gwa ụmụ Izrel, dị ka ihe niile Mozis nyere Jọshụa n’iwu si dị.+ N’oge ahụ niile, ndị Izrel mere ọsọ ọsọ gafere.+ 11  O wee ruo na ozugbo mmadụ niile gafesịrị, igbe+ Jehova gafere, tinyere ndị nchụàjà, n’ihu ìgwè mmadụ ahụ. 12  Ụmụ Ruben na ụmụ Gad nakwa ọkara ebo Manase+ wee gafere n’usoro dị ka ndị agha+ n’ihu ụmụ Izrel, dị nnọọ ka Mozis gwara ha.+ 13  Ihe dị ka puku mmadụ iri anọ, bụ́ ndị e jikeere maka ibu agha, gafeere n’ihu Jehova maka ibu agha na mbara ọzara Jeriko. 14  N’ụbọchị ahụ, Jehova mere ka Jọshụa dị ukwuu n’anya Izrel dum,+ ha wee malite ịtụ ya egwu dị nnọọ ka ha tụrụ Mozis egwu ụbọchị niile nke ndụ ya.+ 15  Jehova wee sị Jọshụa: 16  “Nye ndị nchụàjà bu igbe ihe àmà+ iwu ka ha si na Jọdan gbagote.” 17  Jọshụa wee nye ndị nchụàjà ahụ iwu, sị: “Sinụ na Jọdan gbagote.” 18  O wee ruo na mgbe ndị nchụàjà bụ́ ndị bu igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova si n’etiti Jọdan pụta, ọbụ ụkwụ+ ndị nchụàjà apụtakwa ma zọsa n’ala akọrọ, mmiri Jọdan malitere ịlaghachi n’ọnọdụ ya ma tochie+ akụkụ ya niile dị ka ọ dị na mbụ. 19  Ụmụ Izrel wee si na Jọdan pụta n’abalị iri n’ọnwa mbụ ma maa ụlọikwuu na Gilgal+ n’ókè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ala Jeriko. 20  Jọshụa dọsara nkume iri na abụọ ahụ e si na Jọdan bupụta na Gilgal.+ 21  O wee sị ụmụ Izrel: “Mgbe ọ bụla ụmụ unu jụrụ nna ha n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara?’+ 22  Unu ga-agwa ụmụ unu, sị, ‘Ọ bụ n’ala akọrọ ka Izrel si gafee Jọdan a,+ 23  mgbe Jehova bụ́ Chineke unu mere ka mmiri Jọdan takọọ n’ihu ha ruo mgbe ha gafesịrị, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke unu mere Oké Osimiri Uhie mgbe o mere ka ọ takọọ n’ihu anyị ruo mgbe anyị gafesịrị;+ 24  ka ndị niile nke ụwa wee mara aka Jehova,+ na ọ dị ike;+ ka unu wee tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu mgbe niile.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji