Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 23:1-16

23  O wee ruo mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, mgbe Jehova mere ka Izrel zuoro ndị iro niile gbara ha gburugburu ike,+ mgbe Jọshụa meworo agadi, kaakwa nká,+  na Jọshụa kpọkọrọ Izrel dum,+ ndị okenye ha, na ndị isi+ ha na ndị ikpe ha na ndị ndú ha, wee sị ha: “Mụ onwe m emewo agadi, akawo m nká.  Ma unu onwe unu ahụwo ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu mere mba ndị a niile n’ihi unu,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ onye na-eburu unu agha.+  Lee, esi m n’ife nza+ keere unu mba ndị a fọdụrụ ịbụrụ ebo unu niile ihe nketa, ha na mba niile m bipụrụ,+ malite na Jọdan ruo n’Osimiri Ukwu nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+  Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu nọ na-akwapụ ha n’ihu unu, ọ napụkwara ha ala ha n’ihi unu,+ unu wee weghara ala ha, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu ná nkwa.+  “Nwenụ obi ike+ idebe na ime ihe niile e dere n’akwụkwọ+ iwu Mozis, site n’ahapụghị ha gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+  site n’ịghara iso mba ndị a na-akpakọrịta,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu. Unu akpọtụkwala chi ha aha,+ unu ejikwala ha ṅụọ iyi,+ unu efekwala ha ofufe, unu akpọkwarala ha isiala.+  Kama, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu ka unu ga-arapara n’ahụ́,+ dị nnọọ ka unu meworo ruo taa.  Jehova ga-esi n’ihu unu chụpụ mba ndị dị ukwuu ma dị ike.+ (Ọ dịghị onye ọ bụla guzoworo n’ihu unu ruo taa.)+ 10  Naanị otu onye n’etiti unu ga-achụ otu puku mmadụ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha,+ dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa.+ 11  Nọrọkwanụ na nche mgbe niile+ maka mkpụrụ obi unu site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya.+ 12  “Ma ọ bụrụ na unu anwaa anwaa laghachi azụ,+ unu ewee rapara n’ahụ́ ndị fọdụrụ ná mba ndị a,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu, unu na ha ewee na-agọ ọgọ,+ unu na ha ana-akpakọrịtakwa, 13  unu aghaghị ịmara na Jehova bụ́ Chineke unu agaghị anọgide na-anapụ mba ndị a ala ha n’ihi unu;+ ha ga-aghọkwara unu igbudu na ọnyà na ihe otiti n’akụkụ abụọ unu,+ ghọọkwa ogwu n’anya unu ruo mgbe unu lara n’iyi pụọ n’ezi ala a nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+ 14  “Ugbu a, lee! Ọ bụ ọnwụ na-echezi m ihu taa.+ Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.+ 15  Ọ ga-erukwa na, dị nnọọ ka okwu ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu mezuru n’isi unu,+ otú ahụ ka Jehova ga-eme ka ihe ọjọọ niile bịakwasị unu ruo mgbe o kpochapụrụ unu n’ezi ala a nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu,+ 16  n’ihi na unu mebiri ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu nke o nyere unu n’iwu, nakwa n’ihi na unu agawo fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala.+ Jehova ga-eweso unu iwe dị ọkụ,+ unu ga-alakwa n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ezi ala a nke o nyere unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji