Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 21:1-45

21  Ndị isi nke ndị bụ́ nna ndị Livaị wee bịakwute Elieza+ onye nchụàjà na Jọshụa+ nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel,  ha wee gwa ha okwu na Shaịlo+ n’ala Kenan, sị: “Jehova nyere iwu site n’ọnụ Mozis ka e nye anyị obodo anyị ga-ebi, tinyere ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”+  Ụmụ Izrel wee si n’ihe nketa ha nye ndị Livaị+ obodo ndị a na ala ịta ahịhịa ha dị ka Jehova nyere n’iwu.+  Nza wee daara ezinụlọ niile nke ụmụ Kohat,+ e sikwa n’ife nza wepụta obodo iri na atọ n’ebo Juda+ nakwa n’ebo Simiọn+ nakwa n’ebo Benjamin+ nye ụmụ Erọn onye nchụàjà, bụ́ ndị Livaị.  E sikwa n’ife nza wepụta obodo iri n’ezinụlọ niile nke ebo Ifrem+ nakwa n’ebo Dan+ nakwa n’ọkara ebo Manase+ nye ụmụ Kohat+ fọdụrụnụ.  E sikwa n’ife nza wepụta obodo iri na atọ n’ezinụlọ niile nke ebo Ịsaka+ nakwa n’ebo Asha+ nakwa n’ebo Naftalaị+ nakwa n’ọkara ebo Manase ndị bi na Beshan+ nye ụmụ Geshọn.+  E si n’ebo Ruben+ nakwa n’ebo Gad+ nakwa n’ebo Zebulọn+ wepụta obodo iri na abụọ nye ụmụ Meraraị+ n’ezinụlọ ezinụlọ.  Otú a ka ụmụ Izrel si nye ndị Livaị obodo ndị a na ala ịta ahịhịa+ ha site n’ife nza,+ dị nnọọ ka Jehova nyere n’iwu site n’ọnụ Mozis.+  Ha wee si n’ebo Juda nakwa n’ebo Simiọn wepụta obodo ndị a a kpọrọ aha,+ 10  ha wee bụrụ nke ụmụ Erọn, ndị si n’ezinụlọ ụmụ Kohat, bụ́ ụmụ Livaị, n’ihi na nza nke mbụ bụ nke ha.+ 11  Ha wee nye ha Kiriat-aba+ (Aba nke a bụ nna Enak),+ ya bụ, Hibrọn,+ nke dị n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu,+ nakwa ala ịta ahịhịa gbara ya gburugburu; 12  ha nyekwara Keleb nwa Jefọne ala obodo ahụ na ógbè ya niile ka ha bụrụ ihe onwunwe ya.+ 13  Ha nyekwara ụmụ Erọn bụ́ onye nchụàjà obodo mgbaba+ maka onye gburu mmadụ,+ ya bụ, Hibrọn,+ ya na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Libna+ na ala ịta ahịhịa ya, 14  nakwa Jatia+ na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Eshtemoa+ na ala ịta ahịhịa ya, 15  nakwa Holọn+ na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Diba+ na ala ịta ahịhịa ya, 16  nakwa Eyin+ na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Jọta+ na ala ịta ahịhịa ya, Bet-shimesh+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo itoolu site n’ebo abụọ a. 17  E sikwa n’ebo Benjamin nye ha Gibiọn+ na ala ịta ahịhịa ya, na Giba+ na ala ịta ahịhịa ya, 18  Anatọt+ na ala ịta ahịhịa ya, nakwa Almọn+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 19  Obodo niile nke ụmụ Erọn+ onye nchụàjà dị iri na atọ na ala ịta ahịhịa ha.+ 20  E sikwa n’ife nza wepụta obodo dị iche iche n’ebo Ifrem+ nye ezinụlọ ụmụ Kohat, bụ́ ndị Livaị fọdụrụ n’ime ụmụ Kohat. 21  Ha wee nye ha obodo mgbaba+ maka onye gburu mmadụ,+ ya bụ, Shikem,+ ya na ala ịta ahịhịa ya+ nke dị n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, na Giza+ na ala ịta ahịhịa ya, 22  nakwa Kibzeyim+ na ala ịta ahịhịa ya, na Bet-horọn+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 23  E sikwa n’ebo Dan nye ha Elteke na ala ịta ahịhịa ya, na Gibetọn+ na ala ịta ahịhịa ya, 24  Aịjalọn+ na ala ịta ahịhịa ya, na Gat-rimọn+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 25  E sikwa n’ọkara ebo Manase nye ha Teanak+ na ala ịta ahịhịa ya, na Gat-rimọn na ala ịta ahịhịa ya; obodo abụọ. 26  Obodo niile na ala ịta ahịhịa ha, ndị ezinụlọ ụmụ Kohat fọdụrụnụ nwetara, dị iri. 27  E sikwa n’ọkara ebo Manase+ nye ụmụ Geshọn,+ bụ́ ezinụlọ ụmụ Livaị, obodo mgbaba maka onye gburu mmadụ, ya bụ, Golan,+ nke dị na Beshan, na ala ịta ahịhịa ya, na Bieshtera+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo abụọ. 28  E sikwa n’ebo Ịsaka+ nye ha Kishiọn+ na ala ịta ahịhịa ya, na Daberat+ na ala ịta ahịhịa ya, 29  Jamọt+ na ala ịta ahịhịa ya, na En-ganim+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 30  E sikwa n’ebo Asha+ nye ha Maịshal+ na ala ịta ahịhịa ya, na Abdọn+ na ala ịta ahịhịa ya, 31  na Helkat+ na ala ịta ahịhịa ya, na Rihọb+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 32  E sikwa n’ebo Naftalaị+ nye ha obodo mgbaba+ maka onye gburu mmadụ,+ ya bụ, Kidesh+ nke dị na Galili, na ala ịta ahịhịa ya, na Hamọt-dọọ+ na ala ịta ahịhịa ya, na Katan na ala ịta ahịhịa ya; obodo atọ. 33  Obodo niile nke ndị Geshọn, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị obodo iri na atọ na ala ịta ahịhịa ha. 34  Ezinụlọ ụmụ Meraraị,+ bụ́ ndị Livaị fọdụrụnụ, si n’ebo Zebulọn+ nweta Jọkniam+ na ala ịta ahịhịa ya, Kata na ala ịta ahịhịa ya, 35  Dimna+ na ala ịta ahịhịa ya, Nahalal+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 36  Ha sikwa n’ebo Ruben+ nweta Biza+ na ala ịta ahịhịa ya, na Jehaz+ na ala ịta ahịhịa ya, 37  Kedemọt+ na ala ịta ahịhịa ya, na Mefat+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo anọ. 38  Ha sikwa n’ebo Gad+ nweta obodo mgbaba maka onye gburu mmadụ, ya bụ, Remọt nke dị na Gilied,+ na ala ịta ahịhịa ya, na Mahaneyim+ na ala ịta ahịhịa ya, 39  Heshbọn+ na ala ịta ahịhịa ya, Jeza+ na ala ịta ahịhịa ya; obodo ahụ niile dị anọ. 40  Obodo niile ụmụ Meraraị,+ bụ́ ndị fọdụrụ n’ezinụlọ ụmụ Livaị, nwetara n’ezinụlọ n’ezinụlọ site n’ife nza, dị obodo iri na abụọ. 41  Obodo niile nke ndị Livaị, bụ́ ndị dị n’etiti ihe onwunwe ụmụ Izrel, dị iri anọ na asatọ,+ tinyere ala ịta ahịhịa ha.+ 42  Nke ọ bụla n’ime obodo ndị a wee bụrụ otu obodo na ala ịta ahịhịa ya nke gbara ya gburugburu, otú a ka obodo ndị a niile dị.+ 43  Jehova wee nye Izrel ala dum ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha.+ Ha wee weghara+ ya ma biri n’ime ya. 44  Jehova nyekwara ha ezumike+ gbaa gburugburu, dị ka ihe niile ọ ṅụụrụ ndị nna nna ha n’iyi si dị,+ ọ dịghịkwa otu n’ime ndị iro ha niile guzoro n’ihu ha.+ Jehova nyefere ndị iro ha niile n’aka ha.+ 45  Ọ dịghị nkwa ọ bụla n’ime nkwa ọma niile Jehova kwere ụlọ Izrel nke na-emezughị; ha niile mezuchara.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji