Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 16:1-10

16  Ala ụmụ Josef+ ketara site n’ife nza+ bidoro na Jọdan,+ nke dị nso na Jeriko, ruo na mmiri Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruo n’ala ịkpa nke si na Jeriko gbagoo n’ógbè Betel+ nke bụ́ ugwu ugwu.  O sikwa na Betel nke Lọz+ gafere ruo n’ókè ndị Akaịt,+ n’Atarọt,  ọ gbadakwara n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’ókè ndị Jaflet ruo n’ókè Bet-horọn+ Ndịda na Giza,+ ebe o jedebere bụ n’oké osimiri.+  Ụmụ Josef,+ bụ́ Manase na Ifrem,+ wee weghara ala ahụ.+  Ókè nke ala ụmụ Ifrem, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ, ee, ókè nke ihe nketa ha n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ Atarọt-ada,+ ruo Bet-horọn Mgbago;+  ókè ya wee ruo n’oké osimiri. Mikmitat+ dị n’ebe ugwu, ókè ya gakwara gburugburu n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Teanat-shaịlo, wee si n’ebe ọwụwa anyanwụ gafee ruo Janoa.  O wee si na Janoa gbadaa ruo Atarọt nakwa Neara, ruokwa Jeriko,+ gbadaakwa Jọdan.  Malite na Tapua,+ ókè ya gawara n’ebe ọdịda anyanwụ ruo na ndagwurugwu Kena,+ ebe o jedebere wee bụrụ n’oké osimiri.+ Nke a bụ ihe nketa nke ebo ụmụ Ifrem, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.  Ụmụ Ifrem nwekwara obodo+ ndị e wepụtaara ha n’etiti ihe nketa nke ụmụ Manase, obodo niile na ógbè ha niile. 10  Ha achụpụghịkwa ndị Kenan+ bi na Giza,+ ndị Kenan wee biri n’etiti ndị Ifrem ruo taa,+ bụrụkwa ndị ohu na-arụ ọrụ mmanye.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji