Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 15:1-63

15  Òkè+ nke ebo ụmụ Juda ketara n’ezinụlọ n’ezinụlọ dị ruo n’ókè nke ala Idọm,+ ya bụ, ala ịkpa Zin,+ ruokwa Negeb+ na nsọtụ ebe ndịda ya.  Ókè nke ala ha n’ebe ndịda bụ malite na nsọtụ Oké Osimiri Nnu,+ malite n’ọnụ mmiri nke dị n’ebe ndịda.  Ọ gbadara n’ebe ndịda ruo n’ebe e si agbago Akrabim+ wee gafere ruo Zin,+ sikwa na ndịda gbagoo Kedesh-bania+ wee gafere ruo Hezrọn, gbagookwa Ada wee gaa gburugburu ruo Kaka.  Ọ gafekwara ruo Azmọn,+ ruokwa na ndagwurugwu Ijipt;+ ebe ókè ya jedebere bụ n’oké osimiri. Nke a wee bụrụ ókè ha n’ebe ndịda.  Ókè ya n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ Oké Osimiri Nnu ruo na nsọtụ Jọdan, ókè ya n’isi isi ebe ugwu kwụsịrị n’ọnụ mmiri nke oké osimiri, na nsọtụ Jọdan.+  Ókè nke ala ahụ gbagokwara Bet-họgla+ ma gafere ebe ugwu Bet-araba,+ ókè ya gbagokwara ruo nkume Bohan,+ nwa Ruben.  Ókè ya gbagokwara Diba n’ebe ndagwurugwu Ekọ+ ma chee ihu n’ebe ugwu ruo Gilgal,+ bụ́ nke dị n’ihu ebe e si agbago Adọmịm, nke dị na ndịda iyi ndagwurugwu; ókè ya gafekwara ruo mmiri En-shimesh,+ ebe o jedebere bụ En-rogel.+  Ókè ya gbagokwara ndagwurugwu nwa Hinọm,+ ruo ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs+ nke dị na ndịda, ya bụ, Jeruselem;+ ókè ya gbagoro n’elu ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu Hinọm n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị na nsọtụ ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu.  A kpakwara ókè ya malite n’elu ugwu ahụ ruo n’isi mmiri Neftoa,+ ruokwa n’obodo ndị dị n’Ugwu Ifrọn; a kpakwara ókè ya ruo Beala,+ ya bụ, Kiriat-jierim.+ 10  Ókè ya bidoro na Beala gaa gburugburu n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’Ugwu Sia, gaferekwa ruo ná mkpọda Ugwu Jierim n’ebe ugwu, ya bụ, Kesalọn; o wee gbadaa ruo Bet-shimesh+ ma gafee ruo Timna.+ 11  Ókè ya rukwara ná mkpọda Ekrọn+ n’ebe ugwu, a kpakwara ókè ya ruo Shikerọn, gafee ruo Ugwu Beala, ruokwa Jabniel; ebe ókè ya jedebere bụ n’oké osimiri. 12  Ókè ya n’ebe ọdịda anyanwụ bụ Osimiri Ukwu+ ahụ nakwa ala dị n’akụkụ ya. Ọ bụ nke a bụ ókè ya gbaa gburugburu, ya bụ, ókè nke ala ụmụ Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 13  O nyekwara Keleb+ nwa Jefọne òkè n’etiti ụmụ Juda dị ka iwu Jehova nyere Jọshụa si dị, ya bụ, Kiriat-aba (Aba nke a bụ nna Enak), ya bụ, Hibrọn.+ 14  Ya mere, Keleb chụpụrụ ụmụ Enak+ atọ n’ebe ahụ, ya bụ, Shishaị+ na Ahaịman na Talmaị,+ ndị Enak mụrụ.+ 15  O wee si n’ebe ahụ gaa buso ndị bi na Diba agha.+ (Aha Diba tupu mgbe ahụ bụ Kiriat-sifa.)+ 16  Keleb wee sị: “Onye ọ bụla nke bibiri Kiriat-sifa wee weghara ya, m ga-akpọnye ya Aksa+ nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17  Ọtniel+ nwa Kinaz,+ bụ́ nwanne Keleb, wee weghara ya. O wee kpọnye ya Aksa+ nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. 18  O wee ruo na mgbe nwaanyị a na-ala, ọ nọ na-agwa di ya ka ọ rịọta nna ya ala. Nwaanyị a wee kụọ aka mgbe ọ nọ n’elu ịnyịnya ibu. Keleb wee sị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?”+ 19  O wee sị: “Biko, nye m ngọzi, n’ihi na ọ bụ otu ibé ala nke dị n’ebe ndịda ka i nyere m, biko, nye m Gọlọt-meyim.” O wee nye ya Gọlọt Mgbago na Gọlọt Ndịda.+ 20  Nke a bụ ihe nketa+ nke ebo ụmụ Juda,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 21  Obodo ndị dị na nsọtụ ebo ụmụ Juda, n’ebe dị nso n’ókè ha na Idọm,+ n’ebe ndịda, bụ Kabzil+ na Ida na Jegọ, 22  na Kaịna na Dimona na Adeda, 23  na Kidesh na Hezọ na Itnan, 24  Zif na Tilem+ na Bielọt, 25  na Hezọ-hadata na Kiriọt-hezrọn, ya bụ, Hezọ, 26  Emam na Shima na Moleda,+ 27  na Heza-gada na Heshmọn na Bet-pelet,+ 28  na Heza-shual+ na Bia-shiba+ na Biziotaya, 29  Beala+ na Ayịm na Izem,+ 30  na Eltolad na Kisil na Họma,+ 31  na Ziklag+ na Madmana na Sansana, 32  na Lebeọt na Shilhim na Eyin+ na Rimọn;+ obodo ahụ niile dị iri abụọ na itoolu, ha na ógbè ha niile. 33  Na Shefila+ e nwere Eshtaọl+ na Zora+ na Ashna, 34  na Zanoa+ na En-ganim, Tapua na Ịnam, 35  Jamọt+ na Adọlam,+ Soko+ na Azika,+ 36  na Shearem+ na Aditem na Gedira na Gederọtem; obodo iri na anọ na ógbè ha niile. 37  Zinan na Hadasha na Migdal-gad, 38  na Daịlien na Mizpe na Jọktiel, 39  Lekish+ na Bọzkat+ na Eglọn,+ 40  na Kabọn na Lamam na Kitlish, 41  na Gedirọt, Bet-degọn na Neama na Makida;+ obodo iri na isii na ógbè ha niile. 42  Libna+ na Ita+ na Eshan, 43  na Ịfta na Ashna na Nizib, 44  na Kaịla+ na Akzib+ na Marisha;+ obodo itoolu na ógbè ndị dị n’ime ha. 45  Ekrọn+ na obodo nta ya niile, tinyere ógbè ya niile. 46  Malite n’Ekrọn, n’ebe ọdịda anyanwụ, ihe niile dị n’akụkụ Ashdọd na ógbè ha niile. 47  Ashdọd,+ obodo nta ya niile na ógbè ya niile; Geza,+ obodo nta ya niile na ógbè ya niile, gbadaruo ndagwurugwu Ijipt, na Osimiri Ukwu na ógbè dị ya n’akụkụ.+ 48  N’ógbè bụ́ ugwu ugwu, Shemia na Jatia+ na Soko, 49  na Dana na Kiriat-sana, ya bụ, Diba, 50  na Enab na Eshtemo+ na Enim, 51  na Goshen+ na Holọn na Gaịlo;+ obodo iri na otu na ógbè ha niile. 52  Arab na Duma na Ishan, 53  na Jenim na Bet-tapua na Afika, 54  na Họmta na Kiriat-aba, ya bụ, Hibrọn,+ na Zayọ; obodo itoolu na ógbè ha niile. 55  Meyọn,+ Kamel na Zif+ na Jọta, 56  na Jezril na Jọkdiam na Zanoa, 57  Keyin, Gibia na Timna;+ obodo iri na ógbè ha niile. 58  Halhọl, Bet-zọọ na Gidọ, 59  na Mearat na Bet-enọt na Eltekọn; obodo isii na ógbè ha niile. 60  Kiriat-bel,+ ya bụ, Kiriat-jierim,+ na Raba; obodo abụọ na ógbè ha niile. 61  N’ala ịkpa, Bet-araba,+ Midin na Sikeka, 62  na Nibshan na Obodo Nnu na En-gidaị;+ obodo isii na ógbè ha niile. 63  Ma ụmụ Juda achụpụlighị+ ndị Jibọs,+ bụ́ ndị biri na Jeruselem;+ ndị Jibọs wee biri na Jeruselem n’etiti ụmụ Juda ruo taa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji