Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 14:1-15

14  Nke a bụ ala ụmụ Izrel nwetara dị ka ihe nketa n’ala Kenan,+ nke Elieza onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel mere ka ha keta.+  E ji ife nza nye ha ihe nketa ha,+ dị nnọọ ka Jehova si n’ọnụ Mozis nye iwu ka e meere ebo itoolu na ọkara.+  N’ihi na Mozis enyewo ebo abụọ na ọkara nke ọzọ ihe nketa ha n’ofe Jọdan;+ ma o nyeghị ndị Livaị ihe nketa n’etiti ha.+  N’ihi na ụmụ Josef ghọrọ ebo abụọ,+ Manase+ na Ifrem;+ ha enyeghịkwa ndị Livaị òkè n’ala ahụ, ma e wezụga obodo+ ndị ha ga-ebi nakwa ala ịta ahịhịa ha maka anụ ụlọ ha na ihe onwunwe ha.+  Dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu, otú ahụ ka ụmụ Izrel mere; ha wee kee ala ahụ.  Ụmụ Juda wee bịakwute Jọshụa na Gilgal,+ Keleb+ nwa Jefọne onye Kinaz+ wee sị ya: “Gị onwe gị maara nke ọma ihe Jehova gwara+ Mozis onye nke ezi Chineke+ na Kedesh-bania+ banyere m nakwa banyere gị onwe gị.  Adị m afọ iri anọ mgbe Mozis ohu Jehova zipụrụ m na Kedesh-bania ịga ledo ala a,+ m wee kọọrọ ya otú m si jee dị nnọọ ka ọ dị n’obi m.+  Ụmụnne m ndị mụ na ha so gaa mere ka obi lọọ ndị anyị mmiri;+ ma mụ onwe m soro Jehova bụ́ Chineke m n’ụzọ zuru ezu.+  N’ihi ya, Mozis ṅụrụ iyi n’ụbọchị ahụ, sị, ‘Ala ahụ nke ị zọrọ ụkwụ+ ga-abụ nke gị na ụmụ gị dị ka ihe nketa ruo mgbe a na-akaghị aka, n’ihi na i sowo Jehova bụ́ Chineke m n’ụzọ zuru ezu.’+ 10  Ugbu a, lee, Jehova echebewo m ndụ,+ dị nnọọ ka o kwere ná nkwa,+ n’ime afọ iri anọ na ise a kemgbe Jehova kwere Mozis nkwa a mgbe Izrel jere ije n’ala ịkpa,+ ma ugbu a, lee, agbawo m afọ iri asatọ na ise taa. 11  Ma m ka dị ike taa dị ka m dị n’ụbọchị Mozis zipụrụ m.+ Otú ike m hà n’oge ahụ ka ọ hà ugbu a maka ibu agha, ịpụ apụ na ịbata abata.+ 12  Ugbu a, nye m ógbè a bụ́ ugwu ugwu nke Jehova kwere ná nkwa n’ụbọchị ahụ,+ n’ihi na gị onwe gị nụrụ n’ụbọchị ahụ na e nwere ụmụ Enak+ n’ebe ahụ nakwa obodo ndị e wusiri ike.+ Ma eleghị anya, Jehova ga-anọnyere m,+ m ga-anapụkwa ha ala ha, dị nnọọ ka Jehova kwere ná nkwa.”+ 13  Jọshụa wee gọzie ya ma were Hibrọn nye Keleb nwa Jefọne ka ọ bụrụ ihe nketa ya.+ 14  Ọ bụ ya mere Hibrọn ji bụrụ nke Keleb nwa Jefọne onye Kinaz, o wee bụrụ ihe nketa ya ruo taa, n’ihi na o soro Jehova bụ́ Chineke Izrel n’ụzọ zuru ezu.+ 15  Aha Hibrọn tupu mgbe ahụ bụ Kiriat-aba+ (Aba+ nke a bụ onye kasị ukwuu n’etiti ụmụ Enak). Ala ahụ enweghị nsogbu agha ọzọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji