Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 13:1-33

13  Jọshụa emewo agadi, ọ kawo nká.+ Jehova wee sị ya: “Gị onwe gị emewo agadi, ị kawokwa nká, ala nke a na-enwetabeghị ka buru nnọọ ibu.+  Nke a bụ ala ka fọdụrụnụ:+ ógbè niile nke ndị Filistia+ na ógbè niile nke ndị Geshọ+  (malite na ngalaba Osimiri Naịl nke dị n’ihu Ijipt ruo n’ókè Ekrọn n’ebe ugwu,+ a na-ewerebu ya dị ka nke ndị Kenan);+ ndị isi ise+ nke ndị Filistia, ndị Geza+ na ndị Ashdọd,+ ndị Ashkelọn,+ ndị Gat+ na ndị Ekrọn;+ na ndị Avim.+  N’ebe ndịda, e nwere ala dum nke ndị Kenan; tinyere Meara, nke ndị Saịdọn,+ ruo n’Efek, ruokwa n’ókè ndị Amọraịt;  tinyere ala ndị Gibal+ nakwa Lebanọn dum nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, malite na Bel-gad+ nke dị n’ala ala Ugwu Hemọn ruo n’ebe e si abanye Hemat;+  tinyere ndị niile bi n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, malite na Lebanọn+ ruo Misrefọt-meyim,+ ndị Saịdọn+ niile; mụ onwe m ga-anapụ ha ala ha n’ihu ụmụ Izrel.+ Naanị kenye ya Izrel dị ka ihe nketa, dị nnọọ ka m nyere gị n’iwu.+  Ugbu a, keere ebo itoolu nakwa ọkara ebo Manase ala a dị ka ihe nketa.”+  Ụmụ Ruben na ụmụ Gad so ọkara ebo nke ọzọ nweta ihe nketa ha nke Mozis nyere ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, dị nnọọ ka Mozis ohu Jehova nyere ha,+  malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn,+ na obodo nke dị n’etiti ndagwurugwu ahụ, na ala Medeba+ dum nke dị larịị ruo Daịbọn;+ 10  tinyere obodo niile nke Saịhọn eze ndị Amọraịt, onye chịrị na Heshbọn, ruokwa n’ókè nke ala ụmụ Amọn;+ 11  tinyere Gilied na ókèala ndị Geshọ+ na ndị Meakat na Ugwu Hemọn+ dum na Beshan+ dum ruo Saleka;+ 12  ebe dum Ọg+ chịrị n’ime Beshan, bụ́ onye chịrị n’Ashtarọt nakwa n’Edriaị,+ ọ bụ ya fọdụrụ ndụ n’ime ndị Refeyim fọdụrụnụ,+ Mozis wee gbuo ha, napụkwa ha ala ha.+ 13  Ma ụmụ Izrel anapụghị+ ndị Geshọ na ndị Meakat ala ha, kama Geshọ+ na Meakat bi n’etiti Izrel ruo taa. 14  Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ọ na-enyeghị ihe nketa.+ Àjà Jehova bụ́ Chineke Izrel nke a na-esure n’ọkụ+ bụ ihe nketa ha,+ dị nnọọ ka o kwere ha ná nkwa.+ 15  Mozis wee nye ebo Ruben ihe nketa, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, 16  ókèala ahụ wee bụrụ nke ha malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn, na obodo nke dị n’etiti ndagwurugwu ahụ, tinyere ala dum dị larịị nke dị n’akụkụ Medeba;+ 17  Heshbọn+ na obodo+ ya niile ndị dị n’ala dị larịị, Daịbọn+ na Bemọt-bel+ na Bet-bel-mion,+ 18  na Jehaz+ na Kedemọt+ na Mefat,+ 19  na Kiriateyim+ na Sibma+ na Ziret-sheha nke dị n’ugwu dị na ndagwurugwu, 20  na Bet-piọ nakwa mkpọda Pisga+ na Bet-jeshimọt,+ 21  tinyere obodo niile ndị dị n’ala dị larịị+ nakwa ebe dum Saịhọn eze ndị Amọraịt chịrị, bụ́ onye chịrị na Heshbọn,+ onye Mozis gburu,+ ya na ndị isi Midian, ya bụ, Ivaị na Rikem na Zọọ na Họọ na Riba,+ ndị Saịhọn mere ndị isi, bụ́ ndị biri n’ala ahụ. 22  Ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Biọ,+ bụ́ onye na-agba afa,+ tinyere ndị ọzọ ha gburu. 23  Ókè nke ala ụmụ Ruben wee bụrụ Jọdan; ókèala a bụ ihe nketa nke ụmụ Ruben+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, tinyere obodo ha na ógbè ha niile. 24  Mozis nyekwara ebo Gad, bụ́ ụmụ Gad, ihe nketa n’ezinụlọ n’ezinụlọ,+ 25  ókèala ha wee bụrụ Jeza+ na obodo niile dị na Gilied,+ tinyere ọkara ala ụmụ Amọn+ ruo Aroa,+ nke dị n’ihu Raba;+ 26  malitekwa na Heshbọn+ ruo Remat-mizpe na Betonim, malitekwa na Mahaneyim+ ruo n’ókè Diba;+ 27  nakwa Bet-heram+ na Bet-nimra+ na Sọkọt+ na Zefọn, ndị dị na ndagwurugwu, bụ́ ebe ndị fọdụrụ n’ebe Saịhọn eze Heshbọn+ chịrị, Jọdan wee bụrụ ókè ya ruo na nsọtụ oké osimiri Kineret+ nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan. 28  Ọ bụ nke a bụ ihe nketa ụmụ Gad+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, tinyere obodo ha na ógbè ha niile. 29  Mozis nyekwara ọkara ebo Manase ihe nketa, o wee bụrụ nke ọkara ebo Manase, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ 30  Ókèala ha malitere na Mahaneyim,+ Beshan dum, ebe dum Ọg eze Beshan+ chịrị, nakwa obodo ụlọikwuu niile nke Jeya+ ndị dị na Beshan, bụ́ obodo iri isii. 31  Ọkara Gilied, na Ashtarọt+ na Edriaị,+ bụ́ obodo ndị dị n’ebe Ọg chịrị n’ime Beshan, ka e nyere ụmụ Mekia+ nwa Manase, bụ́ ọkara ụmụ Mekia n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 32  Ọ bụ ala ndị a ka Mozis mere ka ha keta, na mbara ọzara Moab n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, nke dị nso na Jeriko.+ 33  Mozis enyeghị ndị ebo Livaị ihe nketa.+ Jehova bụ́ Chineke Izrel bụ ihe nketa ha, dị nnọọ ka o kwere ha ná nkwa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji