Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọn 9:1-41

9  Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya.  Ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya, sị: “Rabaị,+ ònye mehiere,+ ọ̀ bụ nwoke a ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ya,+ nke mere o ji kpuo ìsì mgbe a mụrụ ya?”  Jizọs zara, sị: “Ma nwoke a ma ndị mụrụ ya emehieghị, kama ọ bụ ka e wee mee ka ọrụ Chineke pụta ìhè n’ebe ọ nọ.+  Anyị aghaghị ịrụ ọrụ nke onye zitere m mgbe ìhè ka dị;+ abalị+ na-abịa, mgbe mmadụ ọ bụla na-apụghị ịrụ ọrụ.  N’oge niile m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.”+  Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, ọ gbụsara ọnụ mmiri n’ala wee jiri ọnụ mmiri ahụ gwọọ ụrọ, wee nyakwasị ụrọ ahụ ọ gwọrọ n’anya nwoke ahụ+  wee sị ya: “Gaa saa anya gị+ n’ọdọ mmiri Siloam”+ (nke a sụgharịrị ịbụ ‘Mmiri e zitere ezite’). O wee gaa saa anya ya.+ Ọ lọghachiri na-ahụ ụzọ.+  Ya mere, ndị agbata obi na ndị na-ahụbu na ọ bụ onye arịrịọ malitere ịsị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ nke na-anọ ala arịọ arịrịọ?”+  Ụfọdụ na-asị: “Ọ bụ ya.” Ndị ọzọ na-asị: “Ọ bụghị ya ma ọlị, kama o yiri ya.” Ma nwoke ahụ na-asị: “Ọ bụ m.” 10  Ya mere, ha malitere ịsị ya: “Oleezi otú e si meghee anya gị?”+ 11  Ọ zara, sị: “Nwoke ahụ a na-akpọ Jizọs gwọrọ ụrọ tee m n’anya, sị m, ‘Gaa na Siloam+ saa anya gị.’ M wee gaa saa anya m, hụwa ụzọ.” 12  Ha wee sị ya; “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị ha: “Amaghị m.” 13  Ha duuru nwoke ahụ kpuburu ìsì gakwuru ndị Farisii. 14  Ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike+ ka Jizọs gwọrọ ụrọ wee meghee anya ya.+ 15  Ya mere, ndị Farisii malitere ugbu a ịjụ ya otú o si hụwa ụzọ.+ O wee sị ha: “Ọ nyakwasịrị m ụrọ n’anya, m wee saa ya, hụwa ụzọ.” 16  Ya mere, ụfọdụ n’ime ndị Farisii malitere ịsị: “Onye a esighị n’ebe Chineke nọ bịa, n’ihi na ọ dịghị edebe Ụbọchị Izu Ike.”+ Ndị ọzọ malitere ịsị: “Olee otú onye bụ́ onye mmehie pụrụ isi na-eme ụdị ihe ịrịba ama ahụ?”+ Ya mere, e nwere nkewa+ n’etiti ha. 17  N’ihi ya, ha sịrị onye ìsì ahụ ọzọ: “Olee ihe i chere banyere ya, ebe ọ bụ na o meghere anya gị?” Nwoke ahụ sịrị: “Ọ bụ onye amụma.”+ 18  Otú ọ dị, ndị Juu ekweghị na o kpuburu ìsì ma malite ịhụ ụzọ, ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ nwoke ahụ nke malitere ịhụ ụzọ. 19  Ha wee jụọ ha, sị: “Onye a ọ̀ bụ nwa unu nke unu sịrị na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya? Oleezi otú o si na-ahụ ụzọ ugbu a?” 20  Ndị mụrụ ya zara, sị: “Anyị maara na onye a bụ nwa anyị, marakwa na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 21  Ma otú o si hụwa ụzọ ugbu a, anyị amaghị, anyị amaghịkwa onye meghere anya ya. Jụọnụ ya. Ọ ghọọla dimkpa. Ọ ga-azara ọnụ ya.” 22  Ndị mụrụ ya kwuru ihe ndị a n’ihi na ha na-atụ egwu+ ndị Juu, n’ihi na ndị Juu ekwekọrịtaworị na ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwupụta na ọ bụ Kraịst, a ga-achụpụ ya n’ụlọ nzukọ.+ 23  Ọ bụ ya mere ndị mụrụ ya ji sị: “Ọ ghọọla dimkpa. Jụọnụ ya.” 24  Ya mere, ha kpọrọ nwoke ahụ kpuburu ìsì nke ugboro abụọ wee sị ya: “Nye Chineke otuto;+ anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.” 25  O wee zaa ha, sị: “Ma ọ̀ bụ onye mmehie, amaghị m. Otu ihe m maara bụ na, ọ bụ ezie na m kpuburu ìsì, ana m ahụ ụzọ ugbu a.” 26  Ya mere, ha sịrị ya: “Gịnị ka o mere gị? Olee otú o si meghee anya gị?” 27  Ọ zara ha, sị: “M kọworo ya unu, ma unu egeghị ntị. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Ùnu chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?” 28  Ha wee katọọ ya, sị: “Ị bụ onye na-eso ụzọ nwoke ahụ, ma anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mozis. 29  Anyị maara na Chineke gwara Mozis okwu;+ ma anyị amaghị ebe nwoke a si.”+ 30  Nwoke ahụ zara ha, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe ijuanya+ na unu amaghị ebe o si ma ya emeghee anya m. 31  Anyị maara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị,+ kama ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Chineke ma na-eme uche ya, ọ na-ege ya ntị.+ 32  Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. 33  Ọ bụrụ na nwoke a esighị n’ebe Chineke nọ bịa,+ ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” 34  Ha zara ya, sị: “A mụrụ gị n’ime mmehie,+ n’agbanyeghị nke a, ị̀ na-ezi anyị ihe?” Ha wee chụpụ ya!+ 35  Jizọs nụrụ na ha achụpụwo ya, mgbe ọ hụrụ ya, ọ sịrị ya: “Ì nwere okwukwe n’ebe Nwa nke mmadụ nọ?”+ 36  Nwoke ahụ zara, sị: “Nna anyị ukwu, ònyekwanụ ka ọ bụ ka m wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ?” 37  Jizọs sịrị ya: “Ị hụwo ya, onye a gị na ya na-ekwu okwu bụ ya.”+ 38  Ya mere, ọ sịrị: “Onyenwe anyị, enwere m okwukwe n’ebe ọ nọ.” Nwoke ahụ wee kpọọrọ ya isiala.+ 39  Jizọs wee sị: “Ọ bụ ikpe a+ mere m ji bịa n’ụwa a: ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ wee hụ ụzọ,+ ka ndị na-ahụkwa ụzọ wee kpuo ìsì.”+ 40  Ndị so ná ndị Farisii ya na ha nọ nụrụ ihe ndị a, ha wee sị ya: “Anyị onwe anyị kwa, ànyị kpuru ìsì?”+ 41  Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, unu agaraghị enwe mmehie ọ bụla. Ma, ugbu a, unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’+ Mmehie unu+ na-adịgide.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji