Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọn 6:1-71

6  Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jizọs gafere oké osimiri Galili,* ma ọ bụ Taịbirias.+  Ma oké ìgwè mmadụ nọ na-eso ya, n’ihi na ha na-ahụ ihe ịrịba ama ndị ọ na-eme n’ahụ́ ndị ọrịa.+  Ya mere, Jizọs rịgooro n’elu ugwu,+ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụkwara ala n’ebe ahụ.  Ememme ngabiga,+ bụ́ ememme ndị Juu, na-erukwa nso.  Ya mere, mgbe Jizọs leliri anya wee hụ na oké ìgwè mmadụ na-abịakwute ya, ọ jụrụ Filip, sị: “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ka ndị a rie?”+  Otú ọ dị, ọ na-ekwu ihe a iji nwalee ya, n’ihi na ya onwe ya maara ihe ọ chọrọ ime.  Filip zara ya, sị: “Achịcha e ji narị mkpụrụ ego dinarịọs abụọ zụọ agaghị ezu ime ka onye ọ bụla n’ime ha nweta ntakịrị.”+  Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ Andru nwanne Saịmọn Pita, sịrị ya:  “Lee otu nwa okoro nta nke bu ogbe achịcha ọka bali ise+ na ntakịrị azụ̀ abụọ. Ma olee ihe ihe ndị a ga-abụrụ ọtụtụ mmadụ há otú a?”+ 10  Jizọs wee si: “Meenụ ka ha nọdụ ala rie nri.”+ Ahịhịa juru eju n’ebe ahụ. Ya mere, ndị ikom ahụ nọdụrụ ala iri nri, ha dị ihe dị ka puku ise.+ 11  Ya mere, Jizọs weere achịcha ndị ahụ, mgbe o kelesịrị Chineke, o kesaara ha ndị ahụ nọdụrụ ala iri nri, otú ahụkwa ka o kesaara ha obere azụ̀ dị ka ha chọrọ.+ 12  Ma mgbe ha rijuru afọ,+ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.” 13  Ya mere, ha tụtụkọtara ya. Ha wee tụtụkọta achịcha ọka bali ise ahụ e rifọrọ erifọ. O wee ju nkata iri na abụọ, nke bụ́ ihe ndị ahụ riri nri rifọrọ.+ 14  N’ihi ya, mgbe ndị ahụ hụrụ ihe ịrịba ama ndị o mere, ha malitere ịsị: “N’ezie, onye a bụ onye amụma ahụ+ nke ga-abịa n’ụwa.” 15  Ya mere, ebe Jizọs maara na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri+ n’ugwu ahụ naanị ya. 16  Mgbe o ruru mgbede, ndị na-eso ụzọ ya gbadara n’oké osimiri,+ 17  mgbe ha banyere n’ụgbọ mmiri, ha malitere ịkwọfere oké osimiri ahụ ka ha gaa Kapaniọm. Ka ọ dịkwa ugbu a, ọchịchịrị agbaala, ma Jizọs abịakwutebeghị ha. 18  Oké osimiri ahụ malitekwara ime mkpatụ n’ihi na ifufe dị ike na-efe.+ 19  Otú ọ dị, mgbe ha kwọọrọ ụgbọ ha ruo ihe dị ka maịl atọ ma ọ bụ anọ, ha hụrụ Jizọs ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ma na-abịaru ụgbọ mmiri ahụ nso; egwu wee tụwa ha.+ 20  Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụ m; unu atụla egwu!”+ 21  Ya mere, ha chọrọ ịkpọbata ya n’ụgbọ mmiri ahụ. N’oge na-adịghị anya, ụgbọ mmiri ahụ ruru n’elu ala ebe ha na-achọ ịga.+ 22  N’echi ya, ìgwè mmadụ ndị guzo n’ofe oké osimiri hụrụ na ọ dịghị ụgbọ mmiri dị n’ebe ahụ ma e wezụga otu obere ụgbọ mmiri, hụkwa na Jizọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ mmiri kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya pụrụ; 23  ma ụgbọ mmiri ndị si Taịbirias rutere n’ebe ahụ ha riri achịcha mgbe Onyenwe anyị kelesịrị Chineke. 24  Ya mere, mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ na ma Jizọs ma ndị na-eso ụzọ ya anọghị n’ebe ahụ, ha banyere n’obere ụgbọ mmiri ha wee bịa Kapaniọm ịchọ+ Jizọs. 25  Ya mere, mgbe ha hụrụ ya n’ofe oké osimiri ahụ, ha sịrị ya: “Rabaị,+ olee mgbe i ji rute ebe a?” 26  Jizọs zara ha, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Unu na-achọgharị m, ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ ihe ịrịba ama, kama n’ihi na unu riri achịcha, afọ wee ju unu.+ 27  Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi,+ kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi,+ bụ́ nke Nwa nke mmadụ ga-enye unu; n’ihi na ọ bụ ya ka Nna m, bụ́ Chineke, kara akara nke na-egosi na ihe ya masịrị ya.”+ 28  Ya mere, ha sịrị ya: “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?” 29  Jizọs zara ha, sị: “Nke a bụ ọrụ Chineke, ka unu nwee okwukwe+ n’onye Onye ahụ zitere.”+ 30  Ya mere, ha sịrị ya: “Olee ihe ịrịba ama ị ga-eme,+ ka anyị wee hụ ya ma kwere na gị? Olee ọrụ ị ga-arụ? 31  Nna nna anyị hà riri mana+ n’ala ịkpa, dị nnọọ ka e dere, sị, ‘O nyere ha achịcha si n’eluigwe ka ha rie.’”+ 32  N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, ọ bụghị Mozis nyere unu achịcha ahụ si n’eluigwe, kama ọ bụ Nna m nyere unu ezi achịcha nke si n’eluigwe.+ 33  N’ihi na achịcha nke Chineke bụ onye ahụ nke si n’eluigwe bịa, nke na-enyekwa ụwa ndụ.” 34  Ya mere, ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, na-enye anyị achịcha a mgbe niile.”+ 35  Jizọs sịrị ha: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Onye na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya ma ọlị, onye nwekwara okwukwe n’ebe m nọ, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị.+ 36  Ma agwawo m unu, sị, Unu ahụwo m ma unu ekweghị.+ 37  Ihe niile Nna m nyere m ga-eru m aka, agaghịkwa m achụpụ onye na-abịakwute m ma ọlị;+ 38  n’ihi na esi m n’eluigwe bịa+ ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.+ 39  Nke a bụ uche nke onye ahụ zitere m, na agaghị m atụfu ihe ọ bụla n’ime ihe niile o nyere m kama na m ga-akpọlite ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ. 40  N’ihi na nke a bụ uche Nna m, na onye ọ bụla nke na-ahụ Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya ga-enwe ndụ ebighị ebi,+ m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”+ 41  Ya mere, ndị Juu malitere ịtamu ntamu megide ya n’ihi na ọ sịrị: “Abụ m achịcha nke si n’eluigwe bịa”;+ 42  ha wee malite ịsị:+ “Onye a ọ́ bụghị Jizọs nwa Josef,+ onye anyị maara nna ya na nne ya? Olee ihe mere o ji na-asị ugbu a: ‘Esi m n’eluigwe bịa’?” 43  Jizọs zara ha, sị: “Kwụsịnụ ịtamu ntamu n’etiti onwe unu. 44  Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya;+ m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.+ 45  E dere n’akwụkwọ ndị amụma, sị, ‘Ha niile ga-abụkwa ndị Jehova kụziiri ihe.’+ Onye ọ bụla nke nụrụ ihe site n’ọnụ Nna m ma mụta ihe na-abịakwute m.+ 46  Ọ bụghị na ọ dị mmadụ ọ bụla hụworo Nna m,+ ma e wezụga onye ahụ nke si n’ebe Chineke nọ; onye a ahụwo Nna m.+ 47  N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye kweere nwere ndụ ebighị ebi.+ 48  “Abụ m achịcha+ na-enye ndụ. 49  Nna nna unu hà riri mana+ n’ala ịkpa ma mechaa nwụọ. 50  Nke a bụ achịcha ahụ nke si n’eluigwe bịa, ka onye ọ bụla wee rie ya ma ghara ịnwụ. 51  Abụ m achịcha na-enye ndụ nke si n’eluigwe bịa; ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; n’eziokwu, achịcha ahụ m ga-enye bụ anụ ahụ́ m+ n’ihi ndụ nke ụwa.”+ 52  Ya mere, ndị Juu malitere ịrụrịta ụka n’etiti onwe ha, sị: “Olee otú nwoke a ga-esi enye anyị anụ ahụ́ ya ka anyị rie?” 53  N’ihi ya, Jizọs sịrị ha: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́+ Nwa nke mmadụ, ṅụọkwa ọbara ya,+ unu enweghị ndụ+ n’ime onwe unu. 54  Onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ; 55  n’ihi na anụ ahụ́ m bụ ezi nri, ọbara m bụkwa ezi ihe ọṅụṅụ. 56  Mụ na onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m dị n’otu, ya onwe ya na mụ onwe m dịkwa n’otu.+ 57  Dị nnọọ ka Nna m nke dị ndụ+ zitere m, m wee dị ndụ n’ihi Nna m, onye na-erikwa m, ọbụna onye ahụ ga-adị ndụ n’ihi m.+ 58  Nke a bụ achịcha nke si n’eluigwe bịa. Ọ dịghị ka mgbe nna nna unu hà riri achịcha ma mechaa nwụọ. Onye na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”+ 59  Ihe ndị a ka o kwuru mgbe ọ na-ezi ihe ná nzukọ ọha mmadụ na Kapaniọm. 60  Ya mere, mgbe ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a, ha sịrị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ ige ntị na ya?”+ 61  Ma, ebe Jizọs maara n’ime onwe ya na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu banyere ihe a, ọ sịrị ha: “Ihe a ò mere ka unu sụọ+ ngọngọ? 62  Ọ́ bụrụkwanụ na unu ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọbu?+ 63  Ọ bụ mmụọ bụ ihe na-enye ndụ;+ anụ ahụ́ abaghị uru ọ bụla ma ọlị. Okwu m gwara unu si n’ike mmụọ nsọ,+ ọ na-enyekwa ndụ.+ 64  Ma e nwere ụfọdụ n’ime unu na-ekweghị.” N’ihi na site ná mmalite, Jizọs maara ndị bụ́ ndị na-ekweghị ekwe na onye ahụ nke ga-arara ya nye.+ 65  Ya mere, ọ gara n’ihu ịsị: “Ọ bụ ya mere m ji sị unu, Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m ekweghị ya.”+ 66  N’ihi ihe a o kwuru, ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ihe ha hapụrụ ahapụ,+ kwụsịkwa iso ya na-ejegharị.+ 67  Ya mere, Jizọs gwara mmadụ iri na abụọ ahụ, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” 68  Saịmọn Pita+ wee zaa ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru?+ I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.+ 69  Anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”+ 70  Jizọs wee zaa ha, sị: “M họọrọ unu mmadụ iri na abụọ,+ ọ́ bụghị ya? Ma otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.”+ 71  N’eziokwu, ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saịmọn Iskarịọt; n’ihi na ọ bụ onye a ga-arara ya nye,+ ọ bụ ezie na ọ bụ otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jn 6:1*  N’ezie, ọ bụ ọdọ mmiri; Baịbụl kpọkwara ya ọdọ mmiri Genesaret, Osimiri Galili, nakwa Osimiri Taịbirias.”