Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọn 19:1-42

19  Ya mere, n’oge ahụ, Paịlet kpọọrọ Jizọs wee pịa ya ihe.+  Ndị agha ahụ jikwa ogwu kpaa okpueze wee kpuwe ya n’isi, yiwekwa ya uwe elu na-acha odo odo;+  ha wee malite ịbịakwute ya, na-asị: “Ndeewo, Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra n’ihu.+  Paịlet pụrụ n’èzí ọzọ, sị ha: “Lee! M na-akpọpụtara unu ya n’èzí ka unu wee mara na o nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”+  Jizọs wee kpuru okpueze ahụ e ji ogwu kpaa, yiri uwe elu ahụ na-acha odo odo, pụta n’èzí. O wee sị ha: “Lee nwoke ahụ!”  Otú ọ dị, mgbe ndị isi nchụàjà na ndị ọrụ nche hụrụ ya, ha tiri mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!”+ Paịlet wee sị ha: “Kpọrọnụ ya n’onwe unu kpọgide n’osisi, n’ihi na o nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”+  Ndị Juu wee sị ya: “Anyị nwere iwu,+ dịkwa ka iwu ahụ kwuru, o kwesịrị ịnwụ, n’ihi na o mere onwe ya ọkpara Chineke.”+  Ya mere, mgbe Paịlet nụrụ ihe a ha kwuru, ọ tụkwuru egwu;  o wee banye ọzọ n’obí gọvanọ, sị Jizọs: “Ebee ka i si bịa?” Ma Jizọs azaghị ya ihe ọ bụla.+ 10  Ya mere, Paịlet sịrị ya: “Ị́ chọghị ịtụpụrụ m ọnụ?+ Ọ̀ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịhapụ gị, nweekwa ikike ịkpọgide gị n’osisi?” 11  Jizọs zara ya, sị: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya.+ Ọ bụ ya mere onye ahụ nyefere m n’aka gị ji nwee mmehie ka ukwuu.” 12  N’ihi nke a, Paịlet nọ na-achọ otú ọ ga-esi hapụ ya. Ma ndị Juu tiri mkpu, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza. Onye ọ bụla nke na-eme onwe ya eze na-ekwugide Siza.”+ 13  Ya mere, mgbe Paịlet nụsịrị okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jizọs n’èzí wee nọdụ ala n’oche ikpe n’ebe a na-akpọ Pevment Nkume, ma, n’asụsụ Hibru, ọ bụ Gabata. 14  Ọ bụzi ụbọchị nkwadebe+ maka ememme ngabiga; ọ bụ ihe dị ka awa nke isii.* O wee gwa ndị Juu, sị: “Lee! Eze unu!” 15  Otú ọ dị, ha tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kpọgide ya n’osisi!” Paịlet sịrị ha: “M̀ ga-akpọgide eze unu n’osisi?” Ndị isi nchụàjà wee zaa, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.”+ 16  Ya mere, n’oge ahụ, o nyefere ya n’aka ha ka a kpọgide ya n’osisi.+ Ha wee kpọrọ Jizọs. 17  O buuru osisi ịta ahụhụ ahụ n’onwe ya+ wee gawa+ ebe ahụ a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi, nke a na-akpọ Gọlgọta n’asụsụ Hibru;+ 18  ha kpọgidekwara ya n’osisi n’ebe ahụ,+ ya na ụmụ nwoke abụọ ọzọ, otu n’akụkụ nke a, nke ọzọkwa n’akụkụ nke ọzọ, Jizọs wee nọrọ n’etiti.+ 19  Paịlet dekwara utu aha wee kụgide ya n’osisi ịta ahụhụ ahụ. Ihe e dere na ya bụ: “Jizọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.”+ 20  Ya mere, ọtụtụ n’ime ndị Juu gụrụ utu aha a, n’ihi na ebe a kpọgidere Jizọs n’osisi dị nso n’obodo;+ e dekwara ya n’asụsụ Hibru nakwa n’asụsụ Latịn nakwa n’asụsụ Grik. 21  Otú ọ dị, ndị isi nchụàjà ndị Juu malitere ịgwa Paịlet, sị: “Edela ‘Eze ndị Juu,’ kama dee na ọ sịrị, ‘Abụ m Eze ndị Juu.’” 22  Paịlet zara, sị: “Ihe m dere, edewo m ya.” 23  Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya, kee ya ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha, chịrịkwa uwe ime ya. Ma uwe ime ahụ enweghị ebe a dụkọtara ya, n’ihi na a kpara ya akpa site n’elu gbadaa.+ 24  Ya mere, ha gwarịtara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị kpebie site n’ife nza onye ọ ga-abụ nke ya.” Nke a bụ ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe elu m n’etiti onwe ha, ha fekwara nza maka uwe m.”+ Otú a kwa ka ndị agha ahụ mere ihe ndị a n’ezie. 25  Otú ọ dị, ndị guzo n’akụkụ osisi ịta ahụhụ Jizọs bụ nne ya+ na nwanne nne ya nke nwaanyị; Meri+ nwunye Klopas, na Meri Magdalin.+ 26  Ya mere, mgbe Jizọs hụrụ nne ya na onye ahụ na-eso ụzọ ya bụ́ onye ọ hụrụ n’anya+ ka ha guzo nso, ọ sịrị nne ya: “Nwaanyị, lee nwa gị!” 27  Ọ gwakwara onye ahụ na-eso ụzọ ya, sị: “Lee nne gị!” Malite n’oge awa ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya gaa n’ụlọ nke ya. 28  E mesịa, mgbe Jizọs maara na ugbu a, ihe niile emechawo, iji mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, ọ sịrị: “Akpịrị na-akpọ m nkụ.”+ 29  Otu ite nke mmanya gbara ụka juru dọrọ n’ebe ahụ. Ya mere, ha weere ogbo nke mmanya ahụ gbara ụka juru, fanye ya n’okporo osisi hisop, welie ya tinye n’ọnụ ya.+ 30  Mgbe Jizọs natara mmanya ahụ gbara ụka, ọ sịrị: “E mechawo ya!”+ o hulatara isi wee kubie ume.+ 31  Ma ebe ọ bụ ụbọchị Nkwadebe,+ ndị Juu rịọrọ Paịlet ka o mee ka a kụjisịa ha ụkwụ, ka e bupụkwa ozu ha, ka ozu ha wee ghara ịdịgide+ n’elu osisi ịta ahụhụ n’Ụbọchị Izu Ike, (n’ihi na Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ nke ukwu).+ 32  Ya mere, ndị agha ahụ bịara wee kụjisịa onye nke mbụ nakwa onye nke ọzọ a kpọgidere ha na ya n’osisi ụkwụ. 33  Ma mgbe ha rutere n’ebe Jizọs nọ, ha akụjisịghị ya ụkwụ n’ihi na ha hụrụ na ọ nwụọla. 34  Ma otu n’ime ndị agha ahụ mara ya ube n’akụkụ,+ ozugbo ahụ, ọbara na mmiri gbapụtara. 35  Onye ahụ nke hụrụ ya agbawo àmà, àmà ya bụkwa eziokwu, onye ahụ makwa na ihe ndị a ọ na-akọ bụ eziokwu, ka unu onwe unu kwa wee kwere.+ 36  N’eziokwu, ihe ndị a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya a ga-agbaji.”+ 37  Ihe ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Ha ga-elegide anya n’Onye ahụ ha mara ube.”+ 38  Mgbe ihe ndị a gasịrị, Josef onye Arimatia rịọrọ Paịlet ka ya buru ozu Jizọs. Ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ na nzuzo, n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu;+ Paịlet wee nye ya ikike.+ O wee bịa buru ozu ya.+ 39  Nikọdimọs, bụ́ nwoke ahụ bịakwutere ya na mbụ n’abalị, jikwa ngwugwu mea na ihe otite alo nke dị ihe dị ka otu narị paụnd n’ịdị arọ bịa.+ 40  Ya mere, ha buuru ozu Jizọs wee kee ya ákwà ozu, teekwa ya ihe na-esi ísì ụtọ,+ dị nnọọ ka ndị Juu si akwadebe ozu a chọrọ ili eli. 41  E nwere ubi dị n’ebe ahụ a kpọgidere ya n’osisi. N’ubi ahụ, e nwere otu ili ncheta ọhụrụ,+ bụ́ ebe a na-elitụbeghị onye ọ bụla. 42  Ya mere, n’ihi nkwadebe+ ndị Juu na-eme, ha liri Jizọs n’ebe ahụ n’ihi na ili ncheta ahụ dị nso.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jn 19:14*  Ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.