Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọn 11:1-57

11  E nwere otu nwoke na-arịa ọrịa. Aha ya bụ Lazarọs onye Betani, onye si n’obodo nta ebe Meri na Mata+ nwanne ya nwaanyị si.  N’eziokwu, ọ bụ Meri ahụ nke tere Onyenwe anyị mmanụ na-esi ísì ụtọ+ ma jiri ntutu isi ya hichaa ụkwụ ya+ ka nwanne ya nwoke Lazarọs na-arịa ọrịa.  Ya mere, ụmụnne ya nwaanyị zigaara Onyenwe anyị ozi, sị: “Onyenwe anyị, lee! onye ahụ ị hụrụ n’anya nke ukwuu+ na-arịa ọrịa.”  Ma mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ sịrị: “Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ inye Chineke otuto,+ ka e wee site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”  Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.  Otú ọ dị, mgbe ọ nụrụ na ọ na-arịa ọrịa, ọ nọrọ ụbọchị abụọ n’ebe ahụ ọ nọ.  Mgbe e mesịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaghachi na Judia.”  Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Rabaị,+ ọ dịchabeghị anya ndị Judia chọrọ ịtụ gị nkume,+ ị̀ na-agaghachi ebe ahụ?”  Jizọs zara, sị: “Ọ́ bụghị awa iri na abụọ ka a na-enwe ìhè n’ụbọchị? Ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’oge ìhè dị,+ ọ dịghị akpọ ụkwụ n’ihe ọ bụla, n’ihi na ọ na-ahụ ìhè nke ụwa a. 10  Ma ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’abalị,+ ọ na-akpọ ụkwụ n’ihe, n’ihi na ìhè adịghị n’ime ya.” 11  Ihe ndị a ka o kwuru, mgbe o kwusịrị ha, ọ sịrị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.”+ 12  Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.” 13  Otú ọ dị, ọ bụ banyere ọnwụ ya ka Jizọs na-ekwu. Ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. 14  Ya mere, n’oge ahụ, Jizọs gwara ha hoo haa, sị: “Lazarọs anwụwo,+ 15  ana m aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi unu na anọghị m n’ebe ahụ, ka unu wee kwere. Ma ka anyị gakwuru ya.” 16  Ya mere, Tọmọs, onye a na-akpọ Ejima, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, sị: “Ka anyị onwe anyị gaakwa, ka anyị wee soro ya nwụọ.”+ 17  Mgbe Jizọs bịarutere, ọ hụrụ na ọ nọworị ụbọchị anọ n’ili ncheta.+ 18  Betani dị nso na Jeruselem, ihe dị ka maịl abụọ site n’ebe ahụ. 19  Ya mere, ọtụtụ n’ime ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasi ha obi+ n’ihi nwanne ha nwoke. 20  Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, ọ gara zute ya; ma Meri+ nọdụrụ n’ụlọ. 21  Mata wee gwa Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.+ 22  Ma amaara m ugbu a na ihe niile ị ga-arịọ Chineke,+ Chineke ga-enye gị ha.” 23  Jizọs sịrị ya: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.”+ 24  Mata wee sị ya: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.” 25  Jizọs sịrị ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.+ Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ;+ 26  onye ọ bụla nke dị ndụ ma nwee okwukwe n’ebe m nọ agaghị anwụ ma ọlị.+ Ì kwere nke a?” 27  O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị; ekwerewo m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, bụ́ Onye ahụ ga-abịa n’ụwa.”+ 28  Mgbe o kwuru nke a, ọ gara kpọọ Meri nwanne ya, takwunyere ya, sị: “Onye Ozizi+ abịala, ọ na-akpọ gị.” 29  Mgbe Meri nụrụ ya, o biliri ọsọ ọsọ wee gawa izute ya. 30  N’eziokwu, Jizọs abatabeghị n’obodo nta ahụ, kama ọ ka nọ n’ebe ahụ Mata zutere ya. 31  Ya mere, mgbe ndị Juu ha na ya nọ n’ụlọ,+ ndị na-akasi ya obi, hụrụ Meri ka o biliri ọsọ ọsọ pụọ, ha sochiri ya, n’ihi na ha chere na ọ na-aga n’ili ncheta+ ịga kwaa ákwá n’ebe ahụ. 32  Mgbe Meri bịarutere n’ebe Jizọs nọ ma hụ ya, ọ dara n’ụkwụ ya, sị ya: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”+ 33  Ya mere, mgbe Jizọs hụrụ ka ọ na-akwa ákwá nakwa ka ndị Juu so ya bịa na-akwa ákwá, ọ sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu;+ 34  o wee sị: “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, bịa lee ya.” 35  Anya mmiri gbara Jizọs.+ 36  Ya mere, ndị Juu malitere ịsị: “Lee ka o si hụ ya n’anya nke ukwuu!”+ 37  Ma ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Nwoke a nke meghere anya+ onye ìsì ahụ, ó nweghị ike igbochi onye a ịnwụ?” 38  N’ihi ya, mgbe Jizọs sụsịrị ude ọzọ n’ime onwe ya, ọ bịara n’ili ncheta ahụ.+ N’eziokwu, ọ bụ ọgba, e jikwa otu nkume+ dọchie ọnụ ya. 39  Jizọs sịrị: “Kwapụnụ nkume ahụ.”+ Mata, bụ́ nwanne onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya: “Onyenwe anyị, ka ọ dị ugbu a, ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì, n’ihi na o meela ụbọchị anọ.” 40  Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?”+ 41  Ya mere, ha kwapụrụ nkume ahụ. Ma Jizọs leliri anya n’eluigwe+ wee sị: “Nna, ana m ekele gị na ị nụwo olu m.+ 42  N’eziokwu, amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile; ma ekwuru m okwu n’ihi ìgwè mmadụ a+ ndị guzo gburugburu, ka ha wee kwere na ọ bụ gị zitere m.”+ 43  Mgbe o kwuru ihe ndị a, o ji oké olu tie mkpu, sị: “Lazarọs, pụta!”+ 44  Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee buru ákwà e kere ya n’ụkwụ na n’aka pụta,+ e kekwara ya ákwà n’ihu. Jizọs sịrị ha: “Tọpụnụ ya ákwà ma hapụ ya ka ọ laa.” 45  Ya mere, ọtụtụ n’ime ndị Juu ndị bịakwutere Meri, ndị hụkwara ihe o mere, nwere okwukwe n’ebe ọ nọ;+ 46  ma ụfọdụ n’ime ha gakwuuru ndị Farisii wee kọọrọ ha ihe niile Jizọs mere.+ 47  N’ihi ya, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii mere ka Sanhedrin+ zukọta, wee malite ịsị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama?+ 48  Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ,+ ndị Rom+ ga-abịakwa were ma ụlọ nsọ anyị*+ ma mba anyị.” 49  Ma otu onye n’ime ha, Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ,+ sịrị ha: “Ọ dịghị ihe unu maara ma ọlị, 50  unu echeghịkwa na ọ kaara unu mma ka otu onye nwụchitere mmadụ niile ọnwụ,+ kama a ga-ebibi mba a dum.”+ 51  Otú ọ dị, o kwughị ihe a n’echiche nke onwe ya; kama n’ihi na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ, o buru amụma na a kara aka na Jizọs ga-anwụ maka mba ahụ, 52  ọ bụghịkwa naanị maka mba ahụ, kama ka o wee chịkọtakwa ụmụ Chineke ndị gbasasịrị agbasasị+ ka ha bụrụ otu.+ 53  Ya mere, malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ha malitere ịgba izu igbu ya.+ 54  N’ihi ya, Jizọs adịkwaghị ejegharị n’ihu ọha+ n’etiti ndị Juu,+ kama ọ hapụrụ ebe ahụ gaa n’obodo dị nso n’ala ịkpa, banye n’otu obodo a na-akpọ Ifrem.+ Ya na ndị na-eso ụzọ ya wee nọrọ n’ebe ahụ. 55  Ma ememme ngabiga+ ndị Juu na-eru nso, ọtụtụ ndị sikwa n’obodo ahụ gbagoo Jeruselem tupu ememme ngabiga ahụ amalite, ka ha wee mee onwe ha ka ha dị ọcha dị ka iwu kwuru.+ 56  Ya mere, ha nọ na-achọ Jizọs, guzokwa gburugburu ụlọ nsọ na-ajụrịtakwa ibe ha, sị: “Gịnị bụ uche unu? Ọ̀ bụ na ọ gaghị abịa ememme a ma ọlị?” 57  Ma, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii nyere iwu na ọ bụrụ na onye ọ bụla amata ebe ọ nọ, ya mee ka ha mara, ka ha wee jide ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jn 11:48*  Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ebe anyị.”