Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Emọs 5:1-27

5  “Nụrụnụ okwu a m ji abụ iru uju+ na-ekwu banyere unu, unu ụlọ Izrel:   “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,+ bụ́ Izrel, adawo;+ Ọ pụghị ibili ọzọ.+ A gbahapụwo ya n’ala ya; Ọ dịghị onye ga-ekulite ya.+  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Obodo nke chị otu puku ndị agha pụta, ọ bụ otu narị ndị agha ga-afọdụrụ ya; obodo nke chịkwa otu narị ndị agha pụta, ọ bụ ndị agha iri ga-afọdụrụ ya. Nke a bụ ihe ga-adakwasị ụlọ Izrel.’+  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova gwara ụlọ Izrel, ‘Chọọnụ m,+ ka unu wee dịrị ndụ.+  Unu achọla Betel,+ unu abatakwala Gilgal,+ unu abanyekwala Bia-shiba;+ n’ihi na a ghaghị ịdọrọ Gilgal n’agha;+ Betel ga-aghọkwa ebe a na-eme anwansi.+  Chọọnụ Jehova, ka unu wee dịrị ndụ,+ unu ụlọ Josef,+ ka o wee ghara ịrụ ọrụ dị ka ọkụ,+ ka ọ gharakwa ire, Betel ewee ghara inwe onye ga-emenyụ ọkụ na-agba ya,+  unu ndị na-agbanwe ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ahịhịa ilu,+ ndị tụdakwara ezi omume n’ala.+  Onye mere ìgwè kpakpando Kaịma+ na ìgwè kpakpando+ Kisịl,+ Onye na-agbanwe oké ọchịchịrị+ ka ọ ghọọ ụtụtụ, Onye mere ehihie ka ọ gbaa ọchịchịrị dị ka abalị,+ Onye na-akpọ oké osimiri òkù, ka o wee wụsa ya n’elu ụwa+—Jehova bụ aha ya;+  onye na-eme ka e bukọrọ ihe onye dị ike n’otu ntabi anya, ka e wee bukọrọ ihe dị ọbụna n’ebe e wusiri ike. 10  “‘Ha kpọrọ onye na-adọ aka ná ntị n’ọnụ ụzọ ámá asị,+ ha kpọkwara onye na-ekwu ihe zuru okè asị.+ 11  Ya mere, ebe ọ bụ na unu na-anara onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ego maka ubi, unu na-anarakwa ya ụtụ, bụ́ nke ọ na-eji ọka* atụ;+ unu ejiriwo nkume a wara awa rụọ ụlọ,+ ma unu agaghị anọgide na-ebi na ya; unu akọwo ubi vaịn ndị mara mma, ma unu agaghị aṅụ mmanya si na ha.+ 12  N’ihi na amaara m ugboro ole unu nupụrụ isi+ nakwa otú mmehie unu jọruru ná njọ,+ unu ndị na-ebuso onye ezi omume iro,+ unu ndị na-anara ego aka azụ,+ ndị kwapụwokwara ụmụ ogbenye n’akụkụ+ ọbụna n’ọnụ ụzọ ámá.+ 13  Ya mere, onye nwere nghọta ga-agba nkịtị n’oge ahụ, n’ihi na ọ ga-abụ oge ọdachi.+ 14  “‘Chọọnụ ezi ihe, ọ bụghị ihe ọjọọ,+ ka unu wee dịrị ndụ;+ ka Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha wee nọnyere unu, dị nnọọ ka unu kwuru.+ 15  Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.+ Meenụ ka e nwee ikpe ziri ezi n’ọnụ ụzọ ámá.+ Ma eleghị anya, Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ga-emere ndị fọdụrụ n’ụlọ Josef+ amara.’+ 16  “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘A ga na-eti mkpu arịrị+ n’ámá niile. Ndị mmadụ ga na-etikwa n’okporo ámá niile, sị: “Ewoo! Ewoo!” Ha ga-akpọ onye ọrụ ubi ka o ruo uju,+ kpọọkwa ndị ọkwa ákwá ka ha kwaa ákwá arịrị.’+ 17  ‘A ga na-eti mkpu arịrị n’ubi vaịn niile,+ n’ihi na m ga-agabiga n’etiti unu,’+ ka Jehova kwuru. 18  “‘Ahụhụ ga-adịrị ndị agụụ ụbọchị Jehova na-agụsi ike!+ Gịnịzi ka ụbọchị Jehova ga-apụtara unu?+ Ọ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè,+ 19  dị nnọọ ka mgbe mmadụ na-agba ọsọ n’ihi ọdụm, anụ ọhịa bea ezute ya; dị ka mgbe ọ banyere n’ụlọ wee tụkwasị aka ná mgbidi, agwọ ataa ya.+ 20  Ọ̀ bụ na ụbọchị Jehova agaghị abụ ọchịchịrị, kama ịbụ ìhè; ọ̀ bụkwa na itiri agaghị agba na ya, kama ìhè ịdị?+ 21  Akpọwo m ememme unu niile asị, ajụwo m ha.+ M gaghị anụ ísì ụtọ nke nzukọ ukwu unu.+ 22  Ma, ọ bụrụ na unu achụọrọ m àjà a na-esurecha n’ọkụ,+ ọbụna nye m onyinye maka inweta ihu ọma, ha agaghị atọ m ụtọ,+ m gaghịkwa ele àjà udo nke unu ji anụ mara abụba na-achụ anya.+ 23  Bụrụnụ abụ unu ji na-eme mkpọtụ si n’ebe m nọ pụọ; ka m ghara ịnụ ụda egwú dị ụtọ nke ụbọ akwara unu.+ 24  Meenụ ka ikpe ziri ezi na-eru dị ka mmiri,+ ka ezi omume na-asọkwa mgbe niile dị ka iyi.+ 25  Ọ̀ bụ àjà na onyinye inweta ihu ọma ka unu wetaara m n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ, unu ụlọ Izrel?+ 26  Unu ga-eburu Sakọt bụ́ eze unu+ nakwa Kaịwan, bụ́ ihe oyiyi ndị unu mere, kpakpando nke chi unu, ndị unu meere onwe unu.+ 27  M ga-eme ka a dọrọ unu n’agha gabiga Damaskọs,’+ ka onye aha ya bụ Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Em 5:11*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.