Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Emọs 2:1-16

2  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“N’ihi nnupụisi atọ nke Moab nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ọ gbara ọkpụkpụ eze Idọm ọkụ ka ọ ghọọ laịm.+  M ga-eme ka ọkụ gbaa Moab. Ọ ga-erepịa ụlọ elu niile nke Kiriọt;+ Moab ga-anwụkwa mgbe a na-eme mkpọtụ, mgbe a na-eti mkpu agha, na-afụkwa opi.+  M ga-ebipụ onyeikpe n’ime ya. M ga-egbu ya na ndị isi ya niile,”+ ka Jehova kwuru.’  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihi nnupụisi atọ nke Juda nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ha jụrụ iwu Jehova+ nakwa n’ihi na ha edebeghị ụkpụrụ ya; ma ụgha ha,+ bụ́ nke ndị nna nna ha gbasoro, nọ na-eme ka ha kpafuo.+  M ga-eme ka ọkụ gbaa Juda, ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na Jeruselem.’+  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihi nnupụisi atọ nke Izrel nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ha rere onye ezi omume n’ihi ọlaọcha efu, reekwa ogbenye n’ọnụ ahịa akpụkpọ ụkwụ.+  Ọ na-agụsi ha agụụ ike ka ájá dịrị n’isi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha;+ ha na-agbagọkwa ụzọ nke ndị dị umeala n’obi;+ nwoke na nna ya agakwuruwo otu nwa agbọghọ,+ iji metọọ aha nsọ m.+  Ha na-agbatịkwa onwe ha n’akụkụ ebe ịchụàjà+ ọ bụla n’elu uwe ha chịịrị n’ike dị ka ihe ibé.+ Mmanya nke ndị e riri iwu ka ha na-aṅụ n’ụlọ chi ha.’+  “‘Ma mụ onwe m ekpochapụwo ndị Amọraịt+ n’ihi ha, bụ́ ndị toro ogologo dị ka osisi sida, ndị dịkwa ike dị ka oké osisi;+ m wee kpochapụ mkpụrụ ha ndị dị n’elu ha nakwa mgbọrọgwụ ha ndị dị n’ime ala.+ 10  Mụ onwe m sikwa n’ala Ijipt kpọpụta unu.+ Emekwara m ka unu gaa ije n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ,+ ka unu wee weghara ala ndị Amọraịt.+ 11  M nọ na-ahọpụta ụfọdụ n’ime ụmụ unu ka ha bụrụ ndị amụma,+ họpụtakwa ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa unu ka ha bụrụ ndị Naziraịt.+ Nke a ó kwesịghị ịdị otú ahụ, unu ụmụ Izrel?’ ka Jehova kwuru. 12  “‘Ma unu nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.+ Unu nyekwara ndị amụma iwu, sị: “Unu ebula amụma.”+ 13  Lee, m na-eme ka ala nke unu zọkwasịrị ụkwụ na-aṅagharị dị ka ụgbọala nke bujuru ùkwù ọka* e gbutere ọhụrụ. 14  Onye nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwe ebe ọ ga-agbaba.+ Ọ dịghị onye dị ike nke ga-eme onwe ya ka ọ dịkwuo ike, ọ dịghịkwa dike nke ga-emere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+ 15  Ọ dịghị onye ji ụta nke ga-eguzo. Ọ dịghịkwa onye nwere ụkwụ ọsọ nke ga-agbalaga. Ọ dịghịkwa onye na-agba ịnyịnya nke ga-emere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+ 16  Ma onye obi siri ike n’ime ndị dike ga-agbara ọtọ gbapụ n’ụbọchị ahụ,’+ ka Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Em 2:13*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.