Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 9:1-29

9  “Nụrụ, Izrel, ị na-agafe Jọdan+ taa ka ị banye wee napụ mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa gị ala ha,+ bụ́ nnukwu obodo ndị e wusiri ike ruo n’eluigwe,+  ndị dị ike ma too ogologo, ụmụ Enak,+ bụ́ ndị gị onwe gị maara, ndị ị nụkwara ka a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ònye pụrụ iguzosi ike n’ihu ụmụ Enak?’  Ị makwaara nke ọma taa na Jehova bụ́ Chineke gị na-ebutere gị ụzọ ka ị na-agafe.+ Ọ bụ ọkụ na-erepịa ihe.+ Ọ ga-ala ha n’iyi,+ ya onwe ya ga-emerikwa ha n’ihu gị; ị ga-anapụkwa ha ala ha ma bibie ha ọsọ ọsọ, dị nnọọ ka Jehova gwara gị.+  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akwapụ ha n’ihu gị, asịla n’obi gị, ‘Ọ bụ n’ihi ezi omume m ka Jehova ji kpọta m ka m nweta ala a,’+ ebe ọ bụkwanụ n’ihi ajọ omume nke mba ndị a ka Jehova ji na-achụpụ ha n’ihu gị.+  Ọ bụghị n’ihi ezi omume+ gị ma ọ bụ n’ihi na obi gị ziri ezi+ ka i ji abanye inweta ala ha; n’ezie, ọ bụ n’ihi ajọ omume nke mba ndị a ka Jehova bụ́ Chineke gị ji achụpụ ha n’ihu gị,+ nakwa ka e wee mezuo okwu Jehova ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb,+ n’iyi.  Ị ga-amarakwa na ọ bụghị n’ihi ezi omume gị ka Jehova bụ́ Chineke gị ji enye gị ezi ala a ka ọ bụrụ nke gị; n’ihi na unu bụ ndị na-ekwesi olu ike.+  “Cheta: Echefula otú i si kpasuo Jehova bụ́ Chineke gị iwe n’ala ịkpa.+ Malite n’ụbọchị i si n’ala Ijipt pụọ ruo mgbe unu bịarutere ebe a, unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya.+  Ọbụna na Horeb, unu kpasuru Jehova iwe nke mere na Jehova wesoro unu oké iwe ruo n’ókè nke ịchọ ịla unu n’iyi.+  Mgbe m gbagooro n’ugwu ịnata mbadamba nkume abụọ ahụ,+ bụ́ mbadamba nkume nke ọgbụgba ndụ unu na Jehova,+ m nọ n’ugwu ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị,+ (erighị m nri, aṅụghịkwa m mmiri,) 10  Jehova wee nye m mbadamba nkume abụọ e ji mkpịsị aka Chineke dee ihe na ha;+ e dekwara na ha okwu niile Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu n’ugwu ahụ n’ụbọchị unu zukọtara.+ 11  O wee ruo mgbe ụbọchị iri anọ ahụ gasịrị, ehihie na abalị, na Jehova nyere m mbadamba nkume abụọ ahụ, bụ́ mbadamba nkume nke ọgbụgba ndụ ahụ;+ 12  Jehova wee sị m, ‘Bilie, si n’ebe a gbadaa ọsọ ọsọ, n’ihi na ndị gị bụ́ ndị ị kpọpụtara n’Ijipt emewo omume na-eweta mbibi.+ Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha iwu ka ha soro. Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ.’+ 13  Jehova wee gaa n’ihu ịsị m, ‘Ahụwo m ndị a, ma, lee! ha bụ ndị na-ekwesi olu ike.+ 14  Hapụ m ka m laa ha n’iyi+ ma hichapụ aha ha n’okpuru eluigwe,+ ka m meekwa ka ị bụrụ mba dị ike, nke nwekwara ụba mmadụ karịa ha.’+ 15  “E mesịa, m tụgharịrị wee si n’ugwu ahụ gbadata, ka ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ;+ ebukwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ n’aka m abụọ.+ 16  M wee lee anya, ma, lee, unu emehiewo Jehova bụ́ Chineke unu! Unu emeworo onwe unu nwa ehi a wụrụ awụ.+ Unu emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ Jehova nyere unu iwu ka unu soro.+ 17  Eji m aka m abụọ buru mbadamba nkume abụọ ahụ kụọ ha n’ala ma kụrisịa ha n’ihu unu.+ 18  M wee daa n’ala n’ihu Jehova, dị ka m mere n’oge mbụ, ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Erighị m nri, aṅụghịkwa m mmiri,+ n’ihi mmehie niile unu mere wee mee ihe ọjọọ n’anya Jehova iji kpasuo ya iwe.+ 19  N’ihi na egwu tụrụ m maka iwe dị ọkụ Jehova wesoro unu ruo n’ókè nke ịchọ ịla unu n’iyi.+ Otú ọ dị, Jehova gere m ntị n’oge ahụkwa.+ 20  “Jehova wesokwara Erọn oké iwe nke na ọ fọrọ nke nta ka ọ laa ya n’iyi;+ ma arịọsiri m arịrịọ ike+ maka Erọn n’oge ahụ. 21  Ebuuru m mmehie ahụ unu mere, ya bụ, nwa ehi+ ahụ, m wee kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya, m gweriri ya nke ọma ruo mgbe ọ dị ka uzuzu; e mesịa, m wụnyere ntụ ya n’ime iyi nke si n’ugwu ahụ na-asọdata.+ 22  “Na Tabera+ nakwa na Masa+ nakwa na Kibrọt-hateeva,+ unu kpasukwara Jehova iwe.+ 23  Mgbe Jehova zipụrụ unu na Kedesh-bania,+ sị, ‘Gbagoonụ nweta ala ahụ m ga-enye unu!’ unu nupụrụ isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu enweghịkwa okwukwe+ n’ebe ọ nọ, unu egeghịkwa ntị n’olu ya.+ 24  Unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya+ malite n’ụbọchị m matara unu. 25  “Ya mere, m dara n’ala n’ihu Jehova ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị,+ n’ihi na m dara n’ala otú ahụ maka na Jehova sịrị na ya ga-ala unu n’iyi.+ 26  M wee malite ịrịọsi Jehova arịrịọ ike,+ sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, ebibila ndị gị, bụ́ ihe onwunwe nke aka gị,+ ndị i ji ịdị ukwuu gị napụta, ndị i ji aka dị ike+ kpọpụta n’Ijipt.+ 27  Cheta ndị ohu gị bụ́ Ebreham, Aịzik na Jekọb.+ Elekwasịla anya n’isi ike nke ndị a na-eme nakwa n’ajọ omume ha na mmehie ha,+ 28  ka ala+ nke i si kpọpụta anyị wee ghara ịsị: “Ọ bụ n’ihi na ike adịghị Jehova ịkpọga ha n’ala o kwere ha ná nkwa, ọ bụkwa n’ihi na ọ kpọrọ ha asị mere o ji kpọpụta ha ka o wee gbuo ha n’ala ịkpa.”+ 29  Ha onwe ha bụkwa ndị gị nakwa ihe onwunwe nke gị,+ ndị i ji ike gị dị ukwuu na ogwe aka ị gbatịrị agbatị kpọpụta.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji