Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 4:1-49

4  “Ugbu a, Izrel, gee ntị n’ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị m na-akụziri unu ka unu debe, ka unu wee dị ndụ,+ ka unu wee banyekwa ma weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu.  Unu atụkwasịla ihe n’okwu m na-enye unu n’iwu taa, unu ewepụkwala ihe na ya,+ ka unu wee debe iwu Jehova bụ́ Chineke unu nke m na-enye unu taa.  “Unu ji anya unu hụ ihe Jehova mere n’ihe metụtara Bel nke Piọ,+ na Jehova bụ́ Chineke gị lara onye ọ bụla nke sooro Bel nke Piọ n’iyi n’etiti unu.+  Ma unu niile ndị na-arapara+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu nọ dịcha ndụ taa.  Lee, akụziworo m unu ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe,+ dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke m nyere m n’iwu, ka unu wee mee otú ahụ n’ala ahụ unu na-aga inweta.  Debenụ ha, meekwanụ ha, n’ihi na nke a ga-egosi na unu nwere amamihe+ nakwa na unu nwere nghọta+ n’anya ndị ga-anụ banyere ụkpụrụ ndị a niile, ha ga-asịkwa, ‘N’ezie, mba ukwu a bụ ndị maara ihe ma nwee nghọta.’+  N’ihi na olee mba ukwu+ nke nwere chi ndị nọ ya nso otú Jehova bụ́ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe niile anyị na-akpọku ya?+  Oleekwa mba ukwu nke nwere ụkpụrụ na mkpebi ikpe ziri ezi dị ka iwu a dum m na-enye unu taa?+  “Naanị lezie anya, cheekwa mkpụrụ obi gị nche nke ọma,+ ka i wee ghara ichefu ihe ndị anya gị hụworo,+ ka ha gharakwa ịpụ n’obi gị n’ụbọchị niile nke ndụ gị;+ meekwa ka ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị mara ha,+ 10  n’ụbọchị i guzoro n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị na Horeb,+ mgbe Jehova sịrị m, ‘Kpọkọtara m ndị a niile ka m mee ka ha nụ okwu m,+ ka ha wee mụta ịtụ egwu+ m n’ụbọchị niile ha dị ndụ n’ala ahụ, ka ha kụziekwara ya ụmụ ha.’+ 11  “Unu wee bịa nso ma guzo n’ala ala ugwu ahụ, ugwu ahụ nọkwa na-ere ọkụ ruo n’etiti eluigwe; itiri, ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbachiri.+ 12  Jehova wee si n’etiti ọkụ+ ahụ malite ịgwa unu okwu. Olu okwu ka unu nụrụ, ma ọ dịghị ọdịdị+ ọ bụla unu hụrụ—ọ dịghị ma e wezụga olu unu nụrụ.+ 13  O wee kọwaara unu ọgbụgba ndụ ya,+ nke o nyere unu iwu ka unu na-edebe, bụ́ Okwu Iri ahụ,+ e mesịa, o dere ha n’elu mbadamba nkume abụọ.+ 14  Ọ bụkwa m ka Jehova nyere iwu n’oge ahụ ka m kụziere unu ụkpụrụ na mkpebi ikpe, ka unu wee na-edebe ha n’ala ahụ unu na-agafe inweta.+ 15  “Cheekwanụ mkpụrụ obi unu+ nche nke ọma, n’ihi na ọ dịghị ọdịdị+ unu hụrụ n’ụbọchị Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu na Horeb, 16  ka unu wee ghara ime omume na-eweta mbibi,+ gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ 17  ihe yiri anụ ọhịa ọ bụla nke nọ n’ụwa,+ ihe yiri anụ ufe ọ bụla nke nwere nku nke na-efe n’eluigwe,+ 18  ihe yiri ihe ọ bụla na-agagharị n’ala, ihe yiri azụ̀+ ọ bụla nke nọ na mmiri n’okpuru ụwa; 19  ka ị gharakwa ileli anya n’eluigwe ma hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, bụ́ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, e wee rafuo gị, i wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha,+ bụ́ ihe Jehova bụ́ Chineke gị kenyere ndị niile nọ n’okpuru eluigwe dum.+ 20  Kama ọ bụ unu ka Jehova kpọọrọ ka ọ kpọpụta unu n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ n’Ijipt, ka unu bụrụ otu ndị ọ bụ naanị ya nwe+ dị ka ọ dị taa. 21  “Jehova wee weso m oké iwe n’ihi unu,+ nke mere na ọ ṅụrụ iyi na mụ agaghị agafe Jọdan ma ọ bụ banye n’ezi ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị.+ 22  N’ihi na m ga-anwụ n’ala a.+ Agaghị m agafe Jọdan, ma unu ga-agafe ya, unu ga-enwetakwa ezi ala a. 23  Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, nke unu na ya gbara,+ ka unu gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị iwu banyere ya.+ 24  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ọkụ na-erepịa ihe,+ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.+ 25  “Ọ bụrụ na i nwee ụmụ na ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume na-eweta mbibi+ wee mee ihe oyiyi a pịrị apị,+ bụ́ ọdịdị nke ihe ọ bụla, ọ bụrụkwa na i mee ihe ọjọọ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị+ iji kpasuo ya iwe, 26  ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+ 27  Jehova ga-achụsasịkwa unu n’etiti ndị dị iche iche,+ a ga-emekwa ka unu fọdụ mmadụ ole na ole+ n’etiti mba ndị Jehova ga-achụga unu. 28  N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+ 29  “Ọ bụrụ na unu esi n’ebe ahụ chọọ Jehova bụ́ Chineke gị, ị ga-achọtakwa ya,+ n’ihi na ị ga-eji obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum jụọ ase ya.+ 30  Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke+ gị wee gee ntị n’olu ya.+ 31  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ Chineke ebere.+ Ọ gaghị agbahapụ gị ma ọ bụ laa gị n’iyi ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ+ nna nna gị hà nke ọ ṅụụrụ ha n’iyi. 32  “Biko, jụọ ajụjụ banyere oge gara aga+ nke dịrị tupu a mụọ gị, malite n’ụbọchị Jehova kere mmadụ n’elu ụwa,+ malitekwa n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ọzọ nke eluigwe, È nwetụla oké ihe e mere nke yiri nke a, ka è nwetụla ihe a nụrụ nke yiri ya?+ 33  È nwetụla ndị ọ bụla ọzọ nụrụ ka olu Chineke si n’etiti ọkụ na-ekwu okwu dị ka gị onwe gị nụrụ ya ma ka dịrị ndụ?+ 34  Ka Chineke ọ̀ nwara iji ihe nnwapụta,+ ihe ịrịba ama+ na ọrụ ebube+ na agha+ na aka dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ si n’etiti mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, dị ka ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu si dị? 35  E gosiwo gị ya, ka i wee mara na Jehova bụ ezi Chineke;+ e nweghị ọzọ ma e wezụga ya.+ 36  O si n’eluigwe mee ka ị nụrụ olu ya iji gbazie gị; n’elu ala kwa, o mere ka ị hụ oké ọkụ ya, ị nụkwara okwu ya site n’etiti ọkụ.+ 37  “Ma ị ka dị ndụ, n’ihi na ọ hụrụ nna nna gị hà n’anya, nke mere na ọ họọrọ mkpụrụ ha ndị nọchiri ha+ wee jiri oké ike ya kpọpụta gị n’Ijipt n’ihu ya,+ 38  iji chụpụ mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa gị n’ihu gị, ka o wee kpọbata gị, iji nye gị ala ha ka ọ bụrụ ihe nketa gị dị ka ọ dị taa.+ 39  Ị makwaara nke ọma taa, chetakwa na Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.+ E nweghị ọzọ.+ 40  Debe ụkpụrụ ya+ na iwu ya nke m na-enye gị taa, ka ihe wee gaziere gị+ na ụmụ gị ndị ga-anọchi gị, nakwa ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị,+ mgbe niile.” 41  N’oge ahụ, Mozis wepụtara obodo atọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan,+ 42  ka onye gburu mmadụ wee gbaga n’ebe ahụ, bụ́ onye gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ama,+ ebe ọ na-akpọbughị ya asị;+ ọ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ,+ 43  bụ́ Biza+ nke dị n’ala ịkpa, n’ala dị larịị, maka ụmụ Ruben, nakwa Remọt+ nke dị na Gilied, maka ụmụ Gad, nakwa Golan+ nke dị na Beshan, maka ụmụ Manase.+ 44  Nke a bụ iwu+ Mozis nyere ụmụ Izrel. 45  Ndị a bụ ihe àmà+ na ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe+ ndị Mozis gwara ụmụ Izrel mgbe ha si n’Ijipt pụta, 46  n’ógbè Jọdan na ndagwurugwu dị n’ihu Bet-piọ,+ n’ala Saịhọn eze ndị Amọraịt, bụ́ onye biri na Heshbọn,+ onye Mozis na ụmụ Izrel meriri mgbe ha si n’Ijipt pụta.+ 47  Ha wee weghara ala ya na ala Ọg+ eze Beshan, bụ́ eze abụọ nke ndị Amọraịt ndị nọ n’ógbè Jọdan nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, 48  malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn, ruo n’Ugwu Sayọn, ya bụ, Hemọn,+ 49  nakwa Araba dum+ nke dị n’ógbè Jọdan n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, ruo n’oké osimiri Araba+ n’ala ala mkpọda Pisga.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji