Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 32:1-52

32  “Eluigwe, ṅaa ntị ka m kwuo okwu; Ka ụwa nụrụkwa okwu ọnụ m.+   Ntụziaka m ga na-atasị dị ka mmiri ozuzo,+ Okwu m ga na-adasị dị ka igirigi,+ Dị ka mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa,+ Dịkwa ka mmiri nke na-ezosi ike n’elu ahịhịa ndụ.+  N’ihi na m ga-akpọsa aha Jehova.+ Kwuonụ na Chineke anyị dị ukwuu!+   Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+ N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+ Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+   Ha onwe ha emewo omume na-eweta mbibi;+ Ha abụghị ụmụ ya, ọ bụ ha nwere ntụpọ.+ Ọgbọ gbagọrọ agbagọ ma hịgọọ ahịgọ!+   Ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emeso otú a,+ Unu ndị nzuzu na-amaghị ihe?+ Ọ́ bụghị ya bụ Nna gị nke mụrụ gị,+ Onye kere gị wee mee ka ị kwụsie ike?+   Cheta ụbọchị ndị gara aga,+ Chebaranụ afọ ndị gara aga site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ echiche; Jụọ nna gị, ọ pụrụ ịkọrọ gị;+ Jụọkwa ndị agadi gị, ha pụrụ ịgwa gị ya.+   Mgbe Onye Kasị Elu nyere mba dị iche iche ihe nketa,+ Mgbe o kewara ụmụ Adam, otu onye n’ebe ibe ya nọ,+ O wee kpaara ndị dị iche iche ókè+ Dị ka ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel si dị.+   N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya;+ Jekọb bụ òkè o ketara.+ 10  O wee chọta ya n’ala ịkpa,+ N’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụmanụ na-agbọ ụja na ya.+ Ọ malitere ịgba ya gburugburu,+ iji lekọta ya,+ Iji chebe ya dị ka nwa anya ya.+ 11  Dị nnọọ ka ugo si akpasu akwụ́ ya, Na-erugharị n’elu ụmụ ya,+ Gbasaa nku ya, buru ha, Buru ha na nku ya,+ 12  Ọ bụ naanị Jehova nọ na-edu ya,+ E nweghịkwa chi mba ọzọ so ya.+ 13  Ọ nọ na-eme ka ọ nọkwasị n’ebe ndị dị elu n’ụwa,+ O wee rie mkpụrụ si n’ubi.+ O mere ka ọ na-aracha mmanụ aṅụ nke si na nkume dị elu,+ Na mmanụ nke si n’oké nkume siri ike;+ 14  Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmiri ara nke ewu na atụrụ,+ Tinyere abụba ebule, Nakwa ebule, ụdị nke Beshan, na mkpi,+ Tinyere ọka wit kasị mma;+ Ị nọkwa na-aṅụ ọbara mkpụrụ vaịn dị ka mmanya.+ 15  Mgbe Jeshurọn+ malitere ịma abụba, o wee nupụ isi.+ Ị mawo abụba, ị gbawo agba, i ribawo afọ.+ O wee gbahapụ Chineke, onye kere ya,+ Ledakwa Oké Nkume+ nke nzọpụta ya anya. 16  Ha malitere iji chi ala ọzọ+ kpalie ya ikwo ekworo;+ Ha nọkwa na-eji ihe arụ dị iche iche na-akpasu ya iwe.+ 17  Ha wee na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà, ọ bụghị Chineke,+ Ya bụ, chi dị iche iche ha na-amabughị,+ Bụ́ ndị ọhụrụ batara n’oge na-adịbeghị anya,+ Ndị nna nna unu hà na-amaghị. 18  I wee chefuo Oké Nkume nke mụrụ gị,+ I wee malite iwepụ Chineke n’echiche, bụ́ Onye mụpụtara gị dị ka à ga-asị na ime mere ya.+ 19  Mgbe Jehova hụrụ ya, ọ kwụsịrị ịkwanyere ha ùgwù,+ N’ihi iwe ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom kpasuru ya. 20  O wee sị, ‘Ka m wepụ ihu m n’ebe ha nọ,+ Ka m hụ ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha. N’ihi na ha bụ ọgbọ rụrụ arụ,+ Ụmụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi.+ 21  Ha onwe ha ejiriwo ihe na-abụghị chi kpalie m ikwo ekworo;+ Ha ejiriwo arụsị ha na-abaghị n’ihe+ kpasuo m iwe; Mụ onwe m ga-ejikwa ndị na-enweghị ihe ha bụ kpalie ha ikwo ekworo;+ M ga-eji mba nzuzu kpasuo ha iwe.+ 22  N’ihi na iwe m enwuruwo dị ka ọkụ,+ Ọ ga-erekwa ọkụ gbadaruo Shiol, n’ebe dị n’ime ime ala,+ Ọ ga-erechapụkwa ala na mkpụrụ ya,+ Sunyekwa ntọala ugwu ọkụ.+ 23  M ga-eme ka ọtụtụ ọdachi dakwasị ha;+ M ga-agba ha akụ́ m.+ 24  Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ,+ oké ahụ́ ọkụ ga-eripịakwa ha,+ Ya na ajọ mbibi.+ M ga-ezitekwa anụ ọhịa ka ha taa ha,+ Ha na anụ ndị na-akpụ n’ala ka ha tanye ha elò n’ahụ́.+ 25  Mma agha ga-agbawa ha aka nwa n’èzí,+ Ụjọ ga-adịkwa n’ime ụlọ,+ Gbawa ha aka ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,+ Nwa na-aṅụ ara na nwoke isi awọ́.+ 26  M gaara asị: “M ga-achụsasị ha,+ M ga-eme ka a kwụsị ịkpọtụ aha ha n’etiti mmadụ efu,”+ 27  Ma ọ́ bụghị na m tụrụ egwu iwe onye iro,+ Na ndị na-emegide ha pụrụ ịghọtahie ya,+ Na ha pụrụ ịsị: “Aka anyị akawo ike,+ Ọ bụghịkwa Jehova mere ihe a dum.”+ 28  N’ihi na ha bụ mba nke na-enweghị uche,+ Nghọta adịghịkwa n’etiti ha.+ 29  A sị nnọọ na ha maara ihe,+ ha gaara echebara ihe a echiche!+ Ha gaara eche echiche banyere ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.+ 30  Olee otú otu onye pụrụ isi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri ọsọ?+ Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ò rere ha,+ Jehova enyefeekwa ha n’aka ha. 31  N’ihi na oké nkume ha adịghị ka Oké Nkume anyị,+ Ọbụna ndị iro anyị ga-ekweta nke a.+ 32  N’ihi na osisi vaịn ha si n’osisi vaịn Sọdọm, O si na mbara ala Gọmọra.+ Mkpụrụ vaịn ha bụ mkpụrụ vaịn na-egbu mmadụ, Ụyọkọ ha na-elu ilu.+ 33  Mmanya ha bụ elò nnukwu agwọ, Bụrụkwa nsí jọgburu onwe ya nke agwọ ubí.+ 34  Ọ́ bụghị n’ebe m nọ ka a kwakọbara ya, Kaakwa ya akara n’ụlọ nkwakọba ihe m?+ 35  Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ na ịkwụ ụgwọ.+ N’oge a kara aka, ụkwụ ha agaghị akwụsi ike n’ala,+ N’ihi na ụbọchị ọdachi ha dị nso,+ Ihe ndị a ga-eme ha na-abịakwa ọsọ ọsọ.’+ 36  N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe,+ Ọ ga-enwekwa mwute maka ndị ohu ya,+ N’ihi na ọ ga-ahụ na ha enwekwaghị enyemaka, Naanị ihe e nwere bụ onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe. 37  Ọ ga-asịkwa, ‘Olee ebe chi ha nọ,+ Oké nkume nke ha gbabara n’ime ya,+ 38  Ònye na-eribu abụba nke àjà ha,+ Na-aṅụ mmanya àjà ihe ọṅụṅụ ha?+ Ha bilie nyere unu aka.+ Ha ghọọrọ unu ebe nzuzo.+ 39  Hụnụ na ọ bụ m bụ ya,+ E nweghịkwa chi ọzọ ọ bụ mụ na ya.+ M na-eme ka a nwụọ, m na-emekwa ka a dị ndụ.+ Emewo m ka e nwee oké mmerụ ahụ́,+ mụ onwe m ga-agwọkwa ya,+ Ọ dịghịkwa onye na-anapụta ihe n’aka m.+ 40  N’ihi na m na-eweli aka m n’eluigwe ṅụọ iyi,+ M na-asịkwa: “Dị nnọọ ka m dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,”+ 41  Mgbe m ga-amụ mma agha m nke na-egbu maramara,+ Mgbe aka m ga-eme ihe e kpere n’ikpe,+ M ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-emegide m,+ M ga-akwụkwa ndị kpọrọ m oké asị ụgwọ.+ 42  M ga-eme ka ọbara gbuo akụ́ m dị ka mmanya,+ Mma agha m ga-erikwa anụ ahụ́,+ Ṅụọkwa ọbara ndị e gburu egbu na nke ndị a dọtara n’agha, Ọ ga-erikwa isi ndị ndú nke onye iro.’+ 43  Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ, unu mba niile,+ N’ihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,+ Ọ ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya,+ Kpuchiekwara ala nke ndị ya mmehie.” 44  Mozis wee bịa kwuo okwu niile nke abụ a ná ntị ụmụ Izrel,+ ya na Hoshia nwa Nọn.+ 45  Mgbe Mozis gwasịrị Izrel dum ihe a niile, 46  ọ gara n’ihu ịsị ha: “Tinyenụ okwu niile m na-agwa unu iji dọọ unu aka ná ntị taa n’obi unu,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya ime ihe niile e kwuru n’iwu a.+ 47  N’ihi na ọ bụghịrị unu okwu na-abaghị uru,+ kama ọ bụ ndụ unu,+ unu ga-esitekwa n’okwu a mee ka ụbọchị unu dị ogologo n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”+ 48  Jehova wee gwa Mozis okwu n’otu ụbọchị ahụ, sị: 49  “Gbagoo n’ugwu Abarim a,+ bụ́ Ugwu Nibo,+ nke dị n’ala Moab, nke chere ihu na Jeriko, hụ ala Kenan, nke m na-enye ụmụ Izrel ịbụ ihe onwunwe.+ 50  Nwụọ n’elu ugwu ahụ ị na-agbago, ka e lie gị dị ka e liri ndị gị,+ dị nnọọ ka Erọn nwanne gị nwụrụ n’Ugwu Họọ,+ e wee lie ya dị ka e liri ndị ya; 51  n’ihi na unu emesoghị m otú unu kwesịrị isi meso m+ n’etiti ụmụ Izrel, na mmiri Meriba+ nke Kedesh, n’ala ịkpa Zin; n’ihi na unu edoghị m nsọ n’etiti ụmụ Izrel.+ 52  N’ihi na ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye ebe ahụ, n’ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji