Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 28:1-68

28  “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i gee nnọọ ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’ilezi anya debe iwu ya niile m na-enye gị taa,+ Jehova bụ́ Chineke gị ga-emekwa ka ị dị elu karịa mba niile ọzọ dị n’ụwa.+  Ngọzi a niile ga-abịakwara gị ma chụkwute gị,+ n’ihi na ị na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị:  “Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ n’obodo,+ onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụkwa n’ọhịa.+  “Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ+ gị ga-abụ, tinyere ihe ala gị ga-emepụta na ụmụ anụ ụlọ gị,+ ya bụ, ụmụ ehi gị nakwa ụmụ ewu na atụrụ gị.+  “Ihe a gọziri agọzi ka nkata gị+ na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.+  “Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata, onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụkwa mgbe ị na-apụ apụ.+  “Jehova ga-eme ka e merie ndị iro gị n’ihu gị, bụ́ ndị na-ebuso gị agha.+ Ha ga-esi n’otu ụzọ pụta ibuso gị agha, ma ha ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu gị.+  Jehova ga-ahụ na ya gọziri ụlọ nkwakọba ihe+ gị nakwa ihe ọ bụla ị na-eme,+ ọ ga-agọzikwa gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.  Jehova ga-eme ka unu guzosie ike ịbụrụ ya ndị dị nsọ,+ dị nnọọ ka ọ ṅụụrụ gị n’iyi,+ n’ihi na ị na-edebe ihe Jehova bụ́ Chineke gị nyere n’iwu,+ i wee na-eje ije n’ụzọ ya. 10  Ndị niile nke ụwa ga-ahụ na a kpọkwasịwo gị aha Jehova,+ ha ga-atụkwa gị egwu.+ 11  “Jehova ga-emekwa ka mkpụrụ nke afọ+ gị na ụmụ anụ ụlọ gị na ihe ala gị ga-emepụta dị nnọọ ukwuu+ n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye gị.+ 12  Jehova ga-emepere gị ezi ụlọ nkwakọba ihe ya, bụ́ eluigwe, iji mee ka mmiri zoo n’ala gị n’oge ya+ nakwa iji gọzie ihe niile aka gị na-eme;+ ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma ị gaghị agbazite ihe.+ 13  Jehova ga-edebe gị n’isi, ọ bụghị n’ọdụ; ị ga-anọkwa naanị n’ebe dị elu,+ ị gaghị anọ n’ebe dị ala, n’ihi na ị na-erube isi n’iwu+ Jehova bụ́ Chineke gị, bụ́ nke m na-enye gị taa ka i debe ma mee. 14  Ahapụkwala okwu niile m na-enye gị n’iwu taa wee gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ iji soro chi ọzọ dị iche iche ma fee ha ofufe.+ 15  “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’ilezi anya debe iwu ya niile na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa, nkọcha a niile ga-abịakwasị gị ma chụkwute gị:+ 16  “Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ n’obodo,+ onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụkwa n’ọhịa.+ 17  “Ihe a bụrụ ọnụ ka nkata+ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.+ 18  “Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ,+ tinyere ihe ala gị ga-emepụta+ na ụmụ ehi gị nakwa ụmụ ewu na atụrụ gị.+ 19  “Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata, onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụkwa mgbe ị na-apụ apụ.+ 20  “Jehova ga-eme ka ọbụbụ ọnụ,+ ọgba aghara+ na ịba mba+ dakwasị gị n’ihe ọ bụla ị na-eme bụ́ nke ị na-agbalị ime, ruo mgbe e kpochapụrụ gị, i wee laa n’iyi ọsọ ọsọ, n’ihi omume ọjọọ gị, ebe ọ bụ na ị hapụwo m.+ 21  Jehova ga-eme ka ọrịa na-efe efe rapara gị n’ahụ́ ruo mgbe o kpochapụrụ gị n’ala ahụ ị na-aga inweta.+ 22  Jehova ga-eme ka ị rịawa ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ na ọrịa ahụ́ ọzịza na oké okpomọkụ, meekwa ka mma agha+ bịakwasị gị, meekwa ka ihe ọkụkụ gị kpọnwụọ,+ meekwa ka ihe ọkụkụ gị maa ebù,+ ihe ndị a ga-achụkwa gị ọsọ ruo mgbe ị lara n’iyi. 23  Mbara igwe nke dị n’elu isi gị ga-adịkwa ka ọla kọpa, ala nke dị n’okpuru gị ga-adịkwa ka ígwè.+ 24  Jehova ga-eme ka ntụ na uzuzu zoo n’ala gị dị ka mmiri. Ọ ga-esi n’eluigwe zokwasị gị ruo mgbe a lara gị n’iyi. 25  Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+ 26  Ozu gị ga-aghọkwara anụ ufe ọ bụla nke eluigwe na anụ ọhịa ihe oriri, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.+ 27  “Jehova ga-eme ka etuto Ijipt too gị,+ meekwa ka ọkpụ ikè na ụ́gwọ̀ na ọkọ, bụ́ ndị a na-agaghị agwọta agwọta, rịawa gị. 28  Jehova ga-eme ka ị gbaa ara,+ mee ka i kpuo ìsì,+ meekwa ka i nwee uche mgbasasị.+ 29  Ị ga-aghọkwa onye na-asọgharị ìsì n’etiti ehihie, dị nnọọ ka onye ìsì na-asọgharị ìsì n’ọchịchịrị,+ ị ga-emekwa ka ụzọ gị ghara ịga nke ọma; ị ga-aghọkwa naanị onye a na-erigbu erigbu na onye a na-apụnara ihe mgbe niile, n’enweghị onye ga-azọpụta gị.+ 30  Ị ga-ekwe nwaanyị nkwa ọlụlụ, ma nwoke ọzọ ga-edina ya n’ike.+ Ị ga-ewu ụlọ, ma ị gaghị ebi n’ime ya.+ Ị ga-akọ ubi vaịn, ma ị gaghị amalite ịghọrọ mkpụrụ ya.+ 31  A ga-egbu ehi gị n’ihu gị—ma ọ dịghị anụ ya ị ga-eri. A ga-apụnara gị ịnyịnya ibu gị n’ihu gị—ma ọ gaghị alọghachikwute gị. A ga-akpụnye ndị iro gị atụrụ gị—ma ị gaghị enwe onye nzọpụta.+ 32  A ga-akpọnye ndị ọzọ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ anya gị ga na-elekwa ha, na-achọsikwa ha ike mgbe niile—ma ike agaghị adị aka gị.+ 33  Ndị ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ nke ala gị na ihe niile ị rụpụtara;+ ị ga-aghọkwa naanị onye a na-erigbu erigbu na onye a na-echi ọnụ n’ala mgbe niile.+ 34  Ihe ị ga-eji anya gị hụ ga-agbaka gị isi.+ 35  “Jehova ga-eme ka etuto ọjọọ nke a na-agaghị agwọta agwọta too gị n’ikpere gị abụọ nakwa n’ụkwụ gị abụọ, malite n’ọbụ ụkwụ gị ruo n’opu isi gị.+ 36  Jehova ga-eme ka gị+ na eze+ gị nke ị ga-eme ka ọ chịwa gị gaa ná mba ị na-amaghị, bụ́ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị; n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị e ji osisi na nkume mee.+ 37  Ị ga-aghọkwa ihe ijuanya,+ ihe e ji atụ ilu+ na ihe ịkwa emo n’etiti ndị niile Jehova ga-achụga gị. 38  “Ị ga-ewere mkpụrụ dị ukwuu gaa ubi, ma ihe ị ga-eweta ga-adị obere,+ n’ihi na igurube ga-erichapụ ya.+ 39  Ị ga-akọ ubi vaịn, lekọtakwa ya, ma ọ dịghị mmanya ị ga-aṅụ, ọ dịghịkwa ihe ị ga-ewere lọta,+ n’ihi na ọtị ga-erichapụ ya.+ 40  Ị ga-enwe osisi oliv n’ókèala gị dum, ma ọ dịghị mmanụ ị ga-ete n’ahụ́ gị, n’ihi na mkpụrụ oliv gị ga-adapụsị.+ 41  Ị ga-amụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ma ha agaghị abụ nke gị, n’ihi na a ga-adọrọ ha n’agha.+ 42  Ụkpara ga-eweghara osisi gị na mkpụrụ niile nke ala gị. 43  Onye mbịarambịa nke nọ n’etiti unu ga na-agbago elu elu karịa gị, ma gị onwe gị ga na-agbada ala ala.+ 44  Ọ bụ ya ga na-agbazinye gị ihe, ma gị onwe gị agaghị agbazinye ya ihe.+ Ọ ga-aghọ isi, ma gị onwe gị ga-aghọ ọdụ.+ 45  “Nkọcha ndị a niile+ ga-abịakwasịkwa gị, chụọ gị ọsọ ma chụkwute gị ruo mgbe a lara gị n’iyi,+ n’ihi na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’idebe iwu ya na ụkpụrụ ya ndị o nyere gị.+ 46  Ha ga-adịgidekwa n’ahụ́ gị nakwa n’ahụ́ ụmụ gị dị ka ihe ịrịba ama na ihe àmà ruo mgbe a na-akaghị aka,+ 47  n’ihi na i jighị ọṅụ na obi ụtọ+ jeere Jehova bụ́ Chineke gị ozi maka ihe niile bara ụba.+ 48  Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+ 49  “Jehova ga-eme ka mba nke nọ n’ebe dị anya,+ nke si n’ebe ụwa sọtụrụ, buso gị agha, dị nnọọ ka ugo si efekwasị n’ihe ọ ga-eburu,+ ya bụ, mba nke ị na-agaghị aghọta asụsụ ya,+ 50  mba nke ihu ya na-emenye ụjọ,+ nke na-agaghị ele agadi nwoke anya n’ihu, nke na-agaghịkwa emere nwa okorobịa amara.+ 51  Ha ga-erikwa ụmụ anụ ụlọ gị na ihe ala gị mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ gị,+ ha agaghịkwa ahapụrụ gị ọka,* mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi gị ma ọ bụ ụmụ ewu na atụrụ gị ọ bụla, ruo mgbe ha bibiri gị.+ 52  Ha ga-anọchibido gị n’obodo gị ruo mgbe mgbidi gị dị elu e wusiri ike, bụ́ ndị ị tụkwasịrị obi, ga-ada n’ala gị dum, ee, ha ga-anọchibido gị n’obodo gị niile, n’ala gị dum, bụ́ nke Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị.+ 53  Mgbe ahụ, ị ga-eri mkpụrụ nke afọ gị, bụ́ anụ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ bụ́ ndị Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị, n’ihi otú nnọchibido ndị iro gị ga-anọchibido gị ga-esi siere gị ike ma nye gị nsogbu. 54  “Nwoke ọ bụla nke na-agbasighị ike, nke a zụtọkwara azụtọ n’etiti unu, ga na-ele+ nwanne ya nwoke na nwunye ya ọ hụrụ n’anya na ụmụ ya ndị fọrọ afọ, bụ́ ndị fọdụụrụ ya, anya ọjọọ, 55  ka ọ ghara inyetụ otu n’ime ha anụ ụmụ ya ọ ga-eri, n’ihi na o nwekwaghị ihe fọdụụrụ ya ma ọlị n’ihi otú nnọchibido ndị iro gị ga-anọchibido gị n’obodo gị niile ga-esi siere gị ike ma nye gị nsogbu.+ 56  Nwaanyị nke na-agbasighị ike, nke a zụtọrọ azụtọ n’etiti unu, nke na-anwatụbeghịkwa ịzọ ọbụ ụkwụ ya n’ala n’ihi ịbụ onye a zụtọrọ azụtọ na onye na-agbasighị ike,+ ga na-ele di ya ọ hụrụ n’anya na nwa ya nwoke na nwa ya nwaanyị anya ọjọọ, 57  na-elekwa ọbụna ichi nwa nke si n’agbata ụkwụ ya pụta na ụmụ ya ndị ikom bụ́ ndị ọ mụrụ,+ n’ihi na ọ ga-eri ha na nzuzo n’ihi ịnọ n’ụkọ ihe niile n’ihi otú nnọchibido ndị iro gị ga-anọchibido gị n’obodo gị ga-esi siere gị ike ma nye gị nsogbu.+ 58  “Ọ bụrụ na i lezighị anya debe ihe niile e kwuru n’iwu a, bụ́ ndị e dere n’akwụkwọ+ a, ka i wee tụọ egwu aha a nke dị ebube+ ma dị egwu,+ bụ́ Jehova+ Chineke gị, 59  Jehova ga-emekwa ka ihe otiti gị na ihe otiti ụmụ gị sie oké ike, bụ́ oké ihe otiti ndị na-adịru ogologo oge,+ nakwa ajọ ọrịa ndị na-adịru ogologo oge.+ 60  Ọ ga-eme ka ị rịa ọrịa niile nke Ijipt, bụ́ ndị ị tụrụ egwu, ha ga-araparakwa gị n’ahụ́.+ 61  Jehova ga-emekwa ka ọrịa ọ bụla na ihe otiti ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ iwu a rịa gị ruo mgbe a lara gị n’iyi. 62  Unu ga-afọdụkwa mmadụ ole na ole,+ n’agbanyeghị na unu adịwo ọtụtụ dị ka kpakpando nke eluigwe,+ n’ihi na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị. 63  “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+ 64  “Jehova ga-achụsasị gị n’etiti ndị niile malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa,+ n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị, bụ́ osisi na nkume.+ 65  Ị gaghịkwa atụsara ahụ́ n’etiti mba ndị ahụ,+ ọbụ ụkwụ gị agaghịkwa enwe ebe izu ike; Jehova ga-eme ka obi na-ama gị jijiji,+ meekwa ka anya gị na-agbachi agbachi,+ meekwa ka mkpụrụ obi gị daa mbà n’ebe ahụ. 66  Ndụ gị ga-anọ n’oké ihe ize ndụ, ị ga-anọkwa n’ụjọ abalị na ehihie, ị gaghịkwa eji ndụ gị n’aka.+ 67  N’ụtụtụ, ị ga-asị, ‘A sị nnọọ na ọ bụ anyasị!’ n’anyasị kwa, ị ga-asị, ‘A sị nnọọ na ọ bụ ụtụtụ!’ n’ihi ụjọ nke dị gị n’obi nke ga-atụ gị nakwa n’ihi ihe anya gị ga-ahụ.+ 68  Jehova ga-eji ụgbọ mmiri bughachi gị n’Ijipt site n’ụzọ nke m gwara gị banyere ya, sị, ‘Ị gaghị ahụ ya ọzọ ma ọlị,’+ unu ga-eresị ndị iro unu onwe unu n’ebe ahụ ka unu wee ghọọ ohu ha ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi,+ ma a gaghị enwe onye ga-azụrụ unu.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Diu 28:51*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.