Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 27:1-26

27  Mozis na ndị okenye Izrel wee nye ụmụ Izrel iwu, sị: “Unu ga na-edebe iwu niile m na-enye unu taa.+  Ọ ga-erukwa na n’ụbọchị unu ga-agafe Jọdan+ banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, ị ga-akwụwa nkume ndị buru ibu ma were ụrọ laịm techie ha.  Ị ga-ede ihe niile e kwuru n’iwu a n’elu ha+ mgbe ị gafeworo,+ ka i wee banye n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dị ka Jehova bụ́ Chineke nna nna gị hà gwara gị.+  Ọ ga-erukwa na mgbe unu gafere Jọdan, unu ga-akwụwa nkume ndị a n’Ugwu Ibal,+ dị nnọọ ka m na-enye unu n’iwu taa, ị ga-ewerekwa ụrọ laịm techie ha.+  Ị ga-ewukwara Jehova bụ́ Chineke gị ebe ịchụàjà n’ebe ahụ, ị ga-eji nkume wuo ebe ịchụàjà ahụ. Emetụla ngwá ọrụ e ji ígwè kpụọ na ya.+  Nkume a na-awaghị awa ka ị ga-eji wuo ebe ịchụàjà nke Jehova bụ́ Chineke gị, ị ga-achụkwara Jehova bụ́ Chineke gị àjà nsure ọkụ n’elu ya.+  Ị ga-achụ àjà udo+ ma rie ya n’ebe ahụ,+ ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị.+  Ị ga-ede ihe niile e kwuru n’iwu a n’elu nkume ndị ahụ,+ deekwa ha nke ọma.”+  Mozis na ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, wee gwa Izrel dum okwu, sị: “Nọrọ jụụ gee ntị, gị Izrel. Taa, unu aghọworo Jehova bụ́ Chineke unu otu ndị.+ 10  Gee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị ma debe iwu+ ya na ụkpụrụ+ ya ndị m na-enye gị taa.” 11  Mozis wee nye ụmụ Izrel iwu n’ụbọchị ahụ, sị: 12  “Ndị a bụ ndị ga-eguzo ọtọ gọzie ụmụ Izrel n’Ugwu Gerizim+ mgbe unu gafesịrị Jọdan: Simiọn na Livaị na Juda na Ịsaka na Josef na Benjamin. 13  Ndị a bụ ndị ga-eguzo ọtọ maka nkọcha+ n’Ugwu Ibal:+ Ruben, Gad na Asha na Zebulọn, Dan na Naftalaị. 14  Ndị Livaị ga-eji olu dara ụda gwa mmadụ niile n’Izrel, sị:+ 15  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke mere ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ ihe arụ n’anya Jehova,+ ọrụ aka nke onye na-eji osisi na ígwè arụ ọrụ,+ onye debewokwara ya n’ebe zoro ezo.’ (Mmadụ niile ga-aza, sị, ‘Amen!’)+ 16  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-elelị nna ya ma ọ bụ nne ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 17  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke welara ihe e ji kpaa ókè n’ala mmadụ ibe ya azụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 18  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke mere ka onye ìsì gahie ụzọ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 19  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke gbagọrọ+ ikpe+ nke onye mbịarambịa,+ nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 20  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke dinara nwunye nna ya, n’ihi na o kpuliwo uwe mwụda nna ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 21  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke dinara anụ ọhịa ọ bụla.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 22  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke dinara nwanne ya nwaanyị, bụ́ nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwaanyị nne ya mụrụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 23  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke dinara nne nwunye ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 24  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke si n’ebe o zoro pụta kụgbuo mmadụ ibe ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 25  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eri ngarị iji gbuo mkpụrụ obi nke bụ́ ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 26  “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-etinyeghị ihe e kwuru n’iwu a n’ọrụ site n’ime ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji