Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 26:1-19

26  “Ọ ga-erukwa na mgbe ị ga-emesị banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị, mgbe i nwetakwara ya ma biri n’ime ya,+  ị ga-eweta ụfọdụ n’ime mkpụrụ mbụ+ nke ihe niile ala ahụ mepụtara, bụ́ ndị ị ga-eweta n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, ị ga-awụnyekwa ha na nkata ma gaa n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ ime ka aha ya biri.+  Ị ga-abịakwute onye nchụàjà+ nke ga na-eje ozi n’oge ahụ wee sị ya, ‘Taa, m ga-akọrọ Jehova bụ́ Chineke gị na abatawo m n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna anyị hà iyi inye anyị.’+  “Onye nchụàjà ga-anara gị nkata ahụ ma busa ya n’ihu ebe ịchụàjà nke Jehova bụ́ Chineke gị.  Ị ga-ekwukwa n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Nna m bụ onye Siria nke nọ na-ala n’iyi;+ o wee gbadaa Ijipt+ ma biri n’ebe ahụ dị ka ọbịa, ya na mmadụ ole na ole;+ ma n’ebe ahụ, ọ ghọrọ mba ukwu, nke dị ike ma dị ọtụtụ.+  Ndị Ijipt wee malite imegbu anyị na imekpa anyị ahụ́, jirikwa aka ike were anyị gbara ohu.+  Anyị wee malite itiku Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà,+ Jehova wee nụ olu anyị+ ma hụ mmekpa ahụ́ anyị na nsogbu anyị nakwa mmegbu a na-emegbu anyị.+  N’ikpeazụ, Jehova ji aka dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ na ihe ịrịba ama nakwa ọrụ ebube dị iche iche+ kpọpụta anyị n’Ijipt.  O wee kpọta anyị n’ebe a ma nye anyị ala a, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ 10  Ugbu a, lee, ewetawo m mkpụrụ mbụ nke ala Jehova nyere m mepụtara.’+ “Ị ga-ebusakwa ya n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị ma kpọọ isiala n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị.+ 11  Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị na ezinụlọ gị, gị na onye Livaị na onye mbịarambịa nke nọ n’etiti unu.+ 12  “Mgbe i wetasịrị otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke ihe dum i mepụtara n’afọ nke atọ,+ bụ́ afọ a na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri, ị ga-enye ya onye Livaị, onye mbịarambịa, na nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, ha ga-erikwa ya n’ime obodo gị wee rijuo afọ.+ 13  Ị ga-ekwu n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Ewepụtawo m ihe dị nsọ n’ụlọ m, enyewokwa m ya onye Livaị na onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ,+ dị ka ihe dum i nyere m n’iwu si dị. Emebighị m ihe ndị i nyere n’iwu, echefughịkwa m ha.+ 14  Erighị m ihe ọ bụla si na ya n’oge m na-eru uju, ewepụghịkwa m ihe na ya mgbe m na-adịghị ọcha, enyeghịkwa m nke ọ bụla n’ime ya maka onye ọ bụla nwụrụ anwụ. M gere ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke m. Emewo m dị ka ihe niile i nyere m n’iwu si dị. 15  Si n’ebe obibi gị dị nsọ,+ bụ́ eluigwe, ledata anya, gọzie ndị gị bụ́ Izrel,+ gọziekwa ala i nyere anyị, dị nnọọ ka ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi,+ bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’+ 16  “Taa, Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị iwu ka i debe ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị a;+ jiri obi gị dum+ na mkpụrụ obi gị dum+ debe ha ma mee ha. 17  I mewokwa ka Jehova kwuo taa na ya ga-abụ Chineke gị mgbe ị na-eje ije n’ụzọ ya ma na-edebe ụkpụrụ+ ya na ihe o nyere n’iwu+ nakwa mkpebi ikpe+ ya, na-egekwa ntị n’olu ya.+ 18  Jehova emewo ka i kwuo taa na unu ga-abụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe ya pụrụ iche,+ dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa,+ nakwa na ị ga-edebe ihe niile o nyere n’iwu, 19  nakwa na ya onwe ya ga-eme ka ị dị elu karịa mba niile ọzọ o kere,+ bụ́ nke ga-eweta otuto na aha ọma nakwa ịma mma dị nnọọ ka o kwere ná nkwa, ọ bụrụhaala na unu abụụrụ Jehova bụ́ Chineke gị ndị dị nsọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji