Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 23:1-25

23  “Onye ọ bụla a pịrị amụ+ site n’ịkụpịa mkpụrụ amụ ya,+ ma ọ bụ onye e bepụrụ ihe o ji bụrụ nwoke, agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.  “Nwa ọ bụla a kwatara n’iko+ agaghị abata n’ọgbakọ Jehova. Nwa ya ọ bụla, ọbụna ruo n’ọgbọ nke iri, agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.  “Onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ọ bụla agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.+ Nwa ya ọ bụla, ọbụna ruo n’ọgbọ nke iri, agaghị abata n’ọgbakọ Jehova ruo mgbe a na-akaghị aka,  n’ihi na ha ejighị achịcha na mmiri bịa nyere unu aka+ n’ụzọ mgbe unu si n’Ijipt na-apụta,+ nakwa n’ihi na ha goro Belam nwa Biọ, onye Pitọ nke Mesopotemia, ka o megide gị wee kọchaa gị.+  Jehova bụ́ Chineke gị achọghịkwa ige Belam ntị;+ kama Jehova bụ́ Chineke gị mere ka nkọcha ahụ ghọọrọ gị ngọzi,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị hụrụ gị n’anya.+  Emela ihe ga-ewetara ha udo na ọganihu ụbọchị gị niile ruo mgbe a na-akaghị aka.+  “Akpọla onye Idọm asị, n’ihi na ọ bụ nwanne gị.+ “Akpọla onye Ijipt asị, n’ihi na ị ghọrọ onye mbịarambịa n’obodo ya.+  Ụmụ a ga-amụrụ ha bụ́ ọgbọ nke atọ nwere ike ịbata n’ọgbakọ Jehova.  “Ọ bụrụ na ị gaa maa ụlọikwuu iji buso ndị iro gị agha, zere ihe ọjọọ ọ bụla.+ 10  Ọ bụrụ na e nwee nwoke na-adịghị ọcha n’etiti unu n’ihi mmerụ a na-enwe n’abalị,+ ọ ga-apụkwa n’ebe unu mara n’ụlọikwuu. Ọ gaghị abata n’ebe unu mara ụlọikwuu.+ 11  Ọ ga-erukwa na n’oge mgbede, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́, mgbe anyanwụ dara, ọ ga-abata n’ebe unu mara ụlọikwuu.+ 12  Ị ga-enwe ebe ị ga na-eje mposi ná mpụga ebe ị mara ụlọikwuu, ị ga-apụkwa gaa ebe ahụ. 13  Ị ga-eji mbazụ, ya na ihe agha gị, ọ ga-erukwa na mgbe ị ga-etukwuru ala n’ebe mpụga ahụ, ị ga-eji ya gwuo ala ma tụgharịa kpochie nsị gị.+ 14  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị na-ejegharị n’ebe ị mara ụlọikwuu ịnapụta gị+ na inyefe ndị iro gị n’aka gị;+ ebe ị mara ụlọikwuu ga-adịkwa nsọ,+ ka o wee ghara ịhụ ihe ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị n’ahụ́ gị wee kwụsị iso gị.+ 15  “Enyefela ohu n’aka nna ya ukwu mgbe ọ gbapụrụ n’aka nna ya ukwu wee gbakwute gị.+ 16  Ọ ga-ebi n’etiti unu n’ebe ọ bụla ọ ga-ahọrọ n’otu n’ime obodo gị,+ n’ebe ọ bụla ọ chọrọ. Emegbula ya.+ 17  “Ọ dịghị nwaanyị Izrel ọ bụla ga-abụ akwụna ụlọ arụsị,+ a gaghịkwa enwe onye ọ bụla n’ime ndị ikom Izrel ga-abụ akwụna ụlọ arụsị.+ 18  Ewebatala ego a kwụrụ+ nwaanyị akwụna ma ọ bụ ego e retara ná nkịta+ n’ime ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị iji mezuo nkwa ọ bụla, n’ihi na ha bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị, ọbụna ha abụọ. 19  “Emela ka nwanne gị kwụọ ọmụrụ nwa,+ ọmụrụ nwa ego, ọmụrụ nwa nri,+ ọmụrụ nwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa na ya. 20  I nwere ike ịnara onye mba ọzọ+ ọmụrụ nwa, ma anala nwanne gị ọmụrụ nwa;+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe ọ bụla ị na-eme n’ala ahụ ị na-abanye inweta.+ 21  “Ọ bụrụ na i kwe Jehova+ bụ́ Chineke gị nkwa, egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya, ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+ 22  Ma ọ bụrụ na ọ dịghị nkwa i kwere, ọ gaghị aghọrọ gị mmehie.+ 23  Ị ga-emezu ihe egbugbere ọnụ gị kwuru,+ ị ga-emekwa dị nnọọ ka i kwere Jehova bụ́ Chineke gị ná nkwa dị ka onyinye afọ ofufo nke i ji ọnụ gị kwuo.+ 24  “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi vaịn mmadụ ibe gị, rachaa naanị mkpụrụ vaịn nke ga-eju mkpụrụ obi gị afọ, kama etinyela nke ọ bụla n’ime akpa gị.+ 25  “Ọ bụrụ na ị banye n’ọka* kwụ ọtọ nke mmadụ ibe gị, jiri aka ghọrọ naanị oko ọka ndị chara acha, kama emetụla mma owuwe ihe ubi n’ọka kwụ ọtọ nke mmadụ ibe gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Diu 23:25*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.