Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 21:1-23

21  “Ọ bụrụ na a hụ onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ n’ọhịa, n’ala Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ nke gị, ma a maghị onye gburu ya,+  ndị okenye gị na ndị ikpe+ gị ga-aga tụọ malite n’ebe onye ahụ e gburu egbu tọgbọ ruo n’obodo niile dị ya gburugburu;  iji mata obodo nke kasị dịrị nso n’ebe onye ahụ e gburu egbu tọgbọ. Ndị okenye obodo ahụ ga-esi n’ìgwè ehi kpụrụ nwa ehi nke a na-ejitụbeghị rụọ ọrụ, nke na-anyatụbeghị yok;  ndị okenye obodo ahụ ga-akpụrụ nwa ehi ahụ gaa na ndagwurugwu nke iyi na-asọ na ya, bụ́ ebe a na-adịghị akọ akọ, ebe a na-adịghịkwa agha mkpụrụ, ha ga-agbajikwa olu nwa ehi ahụ n’ebe ahụ, na ndagwurugwu ahụ.+  “Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị ga-abịarukwa nso, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke gị họọrọ ka ha na-ejere ya ozi+ nakwa ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ,+ ọ bụkwa ọnụ ha ga-ekpe ikpe esemokwu ọ bụla metụtara ime ihe ike ọ bụla.+  Ndị okenye niile nke obodo ahụ, bụ́ ndị kasị nọrọ nso n’ebe onye ahụ e gburu egbu tọgbọ, ga-akwọ aka+ ha n’elu nwa ehi ahụ a gbajiri olu ya na ndagwurugwu ahụ;  ha ga-aza, sị, ‘Ọ bụghị aka anyị wụfuru ọbara a, anya anyị ahụghịkwa mgbe a wụfuru ya.+  Jehova, emela ka ọ dị n’isi ndị gị bụ́ Izrel, bụ́ ndị ị napụtara,+ emekwala ka ikpe ọmụma ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ+ dịrị n’etiti ndị gị bụ́ Izrel.’ A gaghịkwa eme ka ikpe ọmụma ọbara ahụ dị n’isi ha.  Gị onwe gị ga-ewepụkwa ikpe ọmụma ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ n’etiti unu,+ n’ihi na ị ga-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova.+ 10  “Ọ bụrụ na ị gaa ibuso ndị iro gị agha, Jehova bụ́ Chineke gị ewee nyefee ha n’aka gị,+ i wee dọrọ ha n’agha;+ 11  i wee hụ nwaanyị mara mma n’ahụ́ n’etiti ndị ahụ ị dọọrọ n’agha, i wee nwee mmasị n’ebe ọ nọ,+ wee kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye gị, 12  ị ga-akpọbatakwa ya n’ime ụlọ gị. Ọ ga-akpụ isi+ ya ma dozie mbọ́ ya, 13  yipụkwa ákwà o gbo n’ahụ́ mgbe ị dọọrọ ya n’agha, wee biri n’ụlọ gị, ọ ga-akwakwara nne ya na nna ya ákwá otu ọnwa zuru ezu;+ e mesịa, gị na ya ga-enwe mmekọahụ, ị ga-akpọrọ ya ka ọ bụrụ nwaanyị ị lụrụ ọhụrụ, ọ ga-aghọkwa nwunye gị. 14  Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-achụpụ ya,+ dị ka mkpụrụ obi ya si chọọ; ma ị gaghị anwa anwa ree ya ere. Emegbula ya emegbu+ mgbe i wedasịworo ya n’ala. 15  “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị abụọ, ya ahụ otu n’anya ma kpọ nke ọzọ asị, ma ha abụọ amụọrọ ya ụmụ ndị ikom, ma nwunye ya nke ọ hụrụ n’anya ma nke ọ kpọrọ asị, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke ọ kpọrọ asị mụụrụ ya ọkpara,+ 16  ọ ga-erukwa na n’ụbọchị ọ ga-enye ụmụ ya ndị ikom ihe o nwere dị ka ihe nketa, a gaghị ekwe ka o were nwa nke nwaanyị ahụ ọ hụrụ n’anya mere ọkpara ma hapụ nwa nke nwaanyị ahụ ọ kpọrọ asị, bụ́ ọkpara.+ 17  N’ihi na o kwesịrị iwere nwa nke nwaanyị ahụ ọ kpọrọ asị dị ka ọkpara site n’inye ya òkè abụọ n’ihe niile o nwere,+ n’ihi na ọ bụ mmalite nke ike ịmụ ọmụmụ ya.+ Ọ bụ ya nwe ihe ruuru onye bụ́ ọkpara.+ 18  “Ọ bụrụ na nwoke nwere nwa nwoke dị isi ike, nke na-enupụ isi,+ ọ naghị ege ntị n’olu nna ya ma ọ bụ n’olu nne ya,+ ha agbaziwokwa ya ma o geghị ha ntị,+ 19  nna ya na nne ya ga-ejide ya wee kpọpụtara ya ndị okenye obodo ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo ya,+ 20  ha ga-agwakwa ndị okenye obodo ya, sị, ‘Nwa anyị nwoke a dị isi ike, na-enupụkwa isi; ọ naghị ege ntị n’olu anyị,+ ọ bụkwa onye na-eribiga nri ókè+ na onye aṅụrụma.’+ 21  Ndị ikom niile nke obodo ya ga-eji nkume tụgbuo ya. Ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu, Izrel dum ga-anụkwa ya ma tụọ egwu.+ 22  “Ọ bụrụkwa na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ,+ e wee gbuo ya, i wee kwụwa ya n’osisi,+ 23  ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị dum;+ kama ị ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na ihe a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ ka onye a kwụwara n’osisi bụ;+ emerụkwala ala gị, nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji