Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 19:1-21

19  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ebipụ mba+ ndị ọ bụ ala ha ka Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, mgbe ị napụwokwara ha ala ha wee biri n’obodo ha nakwa n’ụlọ ha,+  ị ga-ewepụtara onwe gị obodo atọ n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ nke gị.+  Ị ga-akwadebere onwe gị ụzọ e si aga ha, ụzọ atọ ka ị ga-eke ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị ka ọ bụrụ nke gị, ọ ga-abụkwa ebe onye ọ bụla nke gburu mmadụ ga-agbaga.+  Nke a bụkwa ihe a ga-eme banyere onye gburu mmadụ nke ga-agbaga ebe ahụ wee dịrị ndụ: Ọ bụrụ na o gbuo mmadụ ibe ya n’amaghị ama, ọ kpọbughịkwa ya asị;+  ma ọ bụ, ọ bụrụ na ya na mmadụ ibe ya abanye n’ọhịa ịkpata nkụ, ọ bụrụkwa na o weliri aka iji anyụike gbutuo osisi, isi anyụike ahụ ewee fepụ n’osisi ya,+ ọ bụrụkwa na ọ kụta mmadụ ibe ya, onye ahụ anwụọ, ya onwe ya kwesịrị ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ.+  Ma ọ́ bụghị ya, ebe ọ bụ na obi dị onye ọbọ+ ọbara ọkụ, o nwere ike ịchụwa onye ahụ gburu mmadụ ma chụkwute ya, ebe ọ bụ na ụzọ dị anya; o nwekwara ike igbu mkpụrụ obi ya, ọ bụ ezie na ikpe ọnwụ amaghị ya,+ n’ihi na ọ kpọbughị ya asị.  Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu, sị, ‘Wepụtara onwe gị obodo atọ.’+  “Ọ bụrụ na Jehova bụ́ Chineke gị emee ka ókèala gị saa mbara dị ka ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi,+ mgbe o nyeworo gị ala ahụ dum o kwere nkwa inye nna nna gị hà,+  n’ihi na i debere iwu a dum m na-enye gị taa site n’ime ya, bụ́ ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya na ije ije n’ụzọ ya mgbe niile,+ ị ga-atụkwasịkwara onwe gị obodo atọ ọzọ n’atọ ndị a,+ 10  ka e wee ghara ịwụfu ọbara ọ bụla nke na-emeghị ihe ọjọọ+ n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị, ikpe ọmụma ọbara ọ bụla agaghịkwa adị n’isi gị.+ 11  “Ma ọ bụrụ na e nwee onye kpọrọ mmadụ ibe ya asị,+ o wee chechie ya ma bilie wakpo ya wee kụgbuo mkpụrụ obi ya,+ nwoke ahụ ewee gbaga n’otu n’ime obodo ndị a, 12  ndị okenye obodo ya ga-ezi ozi wee kpọpụta ya n’ebe ahụ, ha ga-enyefekwa ya n’aka onye ọbọ ọbara, ọ ga-anwụkwa.+ 13  Anya gị agaghị emere ya ebere,+ ị ga-ewepụ ikpe ọmụma nke ọbara na-emeghị ihe ọjọọ n’Izrel,+ ka ihe wee dịrị gị mma. 14  “Ewelala ihe ndị e ji kpaa ókè n’ala mmadụ ibe gị azụ,+ mgbe nna nna gị hà kpaworo ókè n’ihe nketa ị ga-enweta n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ nke gị. 15  “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla,+ n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.+ 16  Ọ bụrụ na onye akaebe nke na-akpa nkata ime mmadụ ihe ọjọọ ebilie gbagide mmadụ akaebe iji bo ya ebubo na ọ bụ onye nnupụisi,+ 17  mmadụ abụọ ahụ na-ese okwu ga-eguzokwa n’ihu Jehova, n’ihu ndị nchụàjà na ndị ikpe bụ́ ndị ga na-eje ozi n’oge ahụ.+ 18  Ndị ikpe ahụ ga-eme nchọpụta nke ọma,+ ọ bụrụ na onye akaebe ahụ bụ onye akaebe ụgha, ọ bụrụkwa na ọ bụ ebubo ụgha ka o boro nwanne ya, 19  unu ga-eme ya kpọmkwem ihe ahụ ọ kpara nkata ime nwanne ya,+ ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.+ 20  Ndị fọdụrụ ga-anụkwa ya wee tụọ egwu, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ha ga-eme ụdị ihe ọjọọ a n’etiti unu.+ 21  Anya gị agaghị eme ebere:+ mkpụrụ obi ga-alara mkpụrụ obi, anya alaara anya, ezé alaara ezé, aka alaara aka, ụkwụ alaara ụkwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji