Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 16:1-22

16  “Na-eme ememme n’ọnwa Ebib,+ ị ga-emere Jehova bụ́ Chineke gị ememme ngabiga,+ n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka Jehova bụ́ Chineke gị kpọpụtara gị n’Ijipt, n’abalị.+  Ị ga-achụkwara Jehova bụ́ Chineke gị anụ ememme ngabiga n’àjà,+ site n’ìgwè ewu na atụrụ nakwa site n’ìgwè ehi,+ n’ebe Jehova ga-ahọrọ ime ka aha ya biri.+  Ruo ụbọchị asaa, erikọtala ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe iko achịcha.+ Ị ga-erikọta ya na achịcha na-ekoghị eko, bụ́ achịcha mmekpa ahụ́, n’ihi na i ji ọsọ ọsọ pụta n’ala Ijipt,+ ka i wee na-echeta ụbọchị i si n’ala Ijipt pụta, ruo ụbọchị niile nke ndụ gị.+  A gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’aka gị n’ókèala gị dum ruo ụbọchị asaa,+ anụ ọ bụla ị ga-achụ n’àjà n’uhuruchi ụbọchị mbụ agaghịkwa adị abalị dum ruo ụtụtụ.+  A gaghị ekwe ka ị chụọ anụ ememme ngabiga n’àjà na nke ọ bụla n’ime obodo gị ndị Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.  Kama ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ ime ka aha ya biri+ ka ị ga-achụ anụ ememme ngabiga n’àjà ná mgbede, ozugbo anyanwụ dara,+ n’oge ahụ a kara aka mgbe i si n’Ijipt pụta.  Ị ga-esi ya, riekwa+ ya n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ,+ n’ụtụtụ, ị ga-atụgharị laa n’ụlọikwuu gị.  Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko; n’ụbọchị nke asaa, a ga-enwe nzukọ ukwu maka Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla.  “Izu asaa ka ị ga-agụrụ onwe gị. Ị ga-ebido ịgụ izu asaa+ ahụ malite na mgbe mbụ i ji mma owuwe ihe ubi gbutuo ọka* kwụ ọtọ. 10  Ị ga-emekwara Jehova bụ́ Chineke gị ememme izu,+ na-adabere n’onyinye afọ ofufo i ji bụ́ nke ị ga-enye, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị.+ 11  Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị,+ gị na nwa gị nwoke na nwa gị nwaanyị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye Livaị nke bi n’obodo gị na onye mbịarambịa+ na nwa na-enweghị nna+ nakwa nwaanyị di ya nwụrụ,+ bụ́ ndị nọ n’etiti unu, n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ ime ka aha ya biri.+ 12  Chetakwa na ị ghọrọ ohu n’Ijipt.+ Debe ụkpụrụ ndị a, meekwa ha.+ 13  “Ị ga-eme ememme ụlọ ndò+ ụbọchị asaa mgbe ị na-ebubata ihe si n’ebe nzọcha mkpụrụ gị na ebe nzọchapụta mmanụ gị na ebe nzọchapụta mmanya gị. 14  Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’oge ememme gị,+ gị na nwa gị nwoke na nwa gị nwaanyị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye Livaị na onye mbịarambịa na nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo gị. 15  Ụbọchị asaa ka ị ga-emere Jehova bụ́ Chineke gị ememme+ n’ebe Jehova ga-ahọrọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzi+ mkpụrụ niile ị kụrụ nakwa ihe niile aka gị na-eme, ị ga na-aṅụrịkwa naanị ọṅụ.+ 16  “Ugboro atọ n’afọ ka ndị ikom gị niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị n’ebe ọ ga-ahọrọ:+ n’ememme achịcha na-ekoghị eko+ nakwa n’ememme izu+ nakwa n’ememme ụlọ ndò,+ ọ dịghịkwa onye ga-agba aka bịa n’ihu Jehova.+ 17  Onyinye onye ọ bụla ji kwesịrị ịdabere n’otú Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie ya.+ 18  “Ị ga-ahọpụtara onwe gị ndị ikpe+ na ndị isi+ n’ime obodo gị ndị Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị n’ebo n’ebo, ha ga-ekpekwa ndị Izrel ikpe n’ezi omume. 19  Agbagọla ikpe.+ Elela mmadụ anya n’ihu,+ erikwala ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi anya ndị maara ihe,+ na-agbagọkwa okwu ndị ezi omume. 20  Ikpe ziri ezi—ikpe ziri ezi ka ị ga-agbaso,+ ka i wee dịrị ndụ ma nweta ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+ 21  “Akụrụla onwe gị ụdị osisi ọ bụla ka ọ bụrụ ogwe osisi dị nsọ n’akụkụ ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke gị, nke ị ga-ewuru onwe gị.+ 22  “Ị gaghịkwa eguzobere onwe gị ogidi nsọ,+ bụ́ ihe Jehova bụ́ Chineke gị kpọrọ oké asị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Diu 16:9*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.