Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 12:1-32

12  “Ndị a bụ ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe+ ndị unu ga-elezi anya ka unu debe+ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nke nna nna gị hà ga-eme ka i nweta, n’ụbọchị niile unu ga-adị ndụ n’ala ahụ.+  Unu ga-ebibicha+ ebe niile mba ndị unu na-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha, ya bụ, n’ugwu dị elu na n’obere ugwu dị iche iche nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+  Unu ga-akwatukwa ebe ịchụàjà+ ha ma kụrisịa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akpọkwa ogwe osisi ha dị nsọ ọkụ+ ma kwatusịa ihe oyiyi a pịrị apị+ nke chi ha, unu ga-ekpochapụkwa aha ha n’ebe ahụ.+  “Unu emesola Jehova bụ́ Chineke unu otú ahụ,+  kama ọ bụ ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ n’ebo unu niile ime ka aha ya dịrị na ya, ime ka o biri na ya, ka unu ga-achọ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-abịa.+  Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu na otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye unu na-eweta+ na onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu na anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi unu nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ+ unu.  Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eri ihe n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu+ ma ṅụrịa ọṅụ n’ihe ọ bụla unu na-eme,+ unu na ezinụlọ unu, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị agọziwo gị.  “Unu emela dị ka ihe niile anyị na-eme n’ebe a taa si dị, onye ọ bụla ana-eme ihe ziri ezi n’anya nke ya,+  n’ihi na unu abanyebeghị n’ebe izu ike+ na ihe nketa nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị. 10  Unu ga-agafekwa Jọdan+ ma biri n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ ọ ga-emekwa ka unu zuoro ndị iro niile gbara unu gburugburu ike, unu ga-ebikwa n’obi iru ala.+ 11  Ọ ga-erukwa na ebe ahụ+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ime ka aha ya biri bụ ebe unu ga-eweta ihe niile m na-enye unu iwu ka unu weta, àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu, otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye+ unu na-eweta na ihe ọ bụla unu họọrọ ịbụ onyinye e kwere ná nkwa+ nke unu ga-ekwe Jehova ná nkwa. 12  Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom na ohu unu ndị ikom na ohu unu ndị inyom na onye Livaị nke bi n’obodo unu, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+ 13  Lezie anya ka ị ghara ịchụ àjà nsure ọkụ gị n’ebe ọ bụla ọzọ ị ga-ahụ.+ 14  Kama ọ bụ n’ebe Jehova ga-ahọrọ n’otu n’ime ebo gị ka ị ga-achụ àjà nsure ọkụ gị, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ị ga-eme ihe niile m na-enye gị n’iwu.+ 15  “Ọ bụ naanị mgbe ọ bụla anụ gụrụ mkpụrụ obi gị agụụ ka ị ga-egbu ya,+ ị ga-erikwa ya n’ime obodo gị, dị ka Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị. Onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha+ nwere ike iri ya, dị ka a pụrụ iri nne mgbada na oké ele.+ 16  Ọ bụ naanị ọbara ya ka ị na-agaghị eri.+ N’ala ka ị ga-awụpụ ya dị ka mmiri.+ 17  A gaghị ekwe ka i rie n’ime obodo gị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka*+ gị ma ọ bụ nke mmanya ọhụrụ gị ma ọ bụ nke mmanụ gị ma ọ bụ nke anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị nakwa nke ìgwè ewu na atụrụ+ gị ma ọ bụ nke onyinye ọ bụla i kwere ná nkwa, bụ́ nke ị ga-ekwe ná nkwa ma ọ bụ nke onyinye afọ ofufo+ gị ma ọ bụ onyinye i wetara.+ 18  Kama, ị ga-eri ya n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ,+ gị na nwa gị nwoke na nwa gị nwaanyị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye Livaị nke bi n’obodo gị; ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị n’ihe ọ bụla ị na-eme. 19  Lezie anya ka ị ghara ịgbahapụ onye Livaị+ ụbọchị niile ị ga-ebi n’ala gị. 20  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-eme ka ókèala gị saa mbara,+ dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa,+ ị ga-asịkwa, ‘Ka m rie anụ,’ n’ihi na ọ na-agụ mkpụrụ obi gị agụụ iri anụ, ị ga-eri anụ mgbe ọ bụla ọ gụrụ mkpụrụ obi gị agụụ.+ 21  Ọ bụrụ na ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ ime ka aha+ ya dịrị na ya dị gị anya, ị ga-egbu ụfọdụ n’ime ìgwè ehi gị ma ọ bụ ụfọdụ n’ime ìgwè ewu na atụrụ gị ndị Jehova nyere gị, dị nnọọ ka m nyere gị n’iwu, ị ga-erikwa ya n’ime obodo gị mgbe ọ bụla ọ gụrụ mkpụrụ obi gị agụụ.+ 22  Ọ bụ naanị otú ahụ e si eri+ nne mgbada ma ọ bụ oké ele, otú ahụ ka ị ga-esi eri ya: ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha+ nwere ike iri ya. 23  Kpebisie nnọọ ike na ị gaghị eri ọbara ya,+ n’ihi na ọbara ya bụ mkpụrụ obi ya,+ erikọtala mkpụrụ obi na anụ ya. 24  Erila ya. Ị ga-awụpụ ya n’ala dị ka mmiri.+ 25  Erila ya, ka ihe wee gaziere gị,+ gị na ụmụ gị ndị ga-anọchi gị, n’ihi na ị ga-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova.+ 26  Ihe ị ga-ebu bụ naanị ihe dị nsọ+ ndị ga-abụ nke gị iji nye onyinye, tinyere onyinye i kwere ná nkwa,+ ị ga-abịakwa n’ebe Jehova ga-ahọrọ.+ 27  Ị ga-achụkwa àjà nsure ọkụ gị,+ bụ́ anụ na ọbara ya,+ n’elu ebe ịchụàjà nke Jehova bụ́ Chineke gị; a ga-awụpụkwa ọbara anụ ndị i ji chụọ àjà n’ihu ebe ịchụàjà Jehova+ bụ́ Chineke gị, ma ị ga-eri anụ ya. 28  “Lezie anya, rubekwa isi n’ihe a niile m na-enye gị n’iwu,+ ka ihe wee gaziere gị,+ gị na ụmụ gị ndị ga-anọchi gị ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ị ga-eme ihe dị mma ma zie ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.+ 29  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ebipụ mba ndị ị na-aga ịnapụ ala ha+ n’ihu gị, ị ga-anapụkwa ha ala ha wee biri na ha.+ 30  Lezie anya ka a ghara ịmata gị n’ọnyà iso ha,+ mgbe a lasịrị ha n’iyi n’ihu gị, ka ị gharakwa ịjụ ase banyere chi ha, sị, ‘Olee otú mba ndị a si efe chi ha? Ee, mụ onwe m ga-emekwa otu ihe ahụ.’ 31  Esila otú ahụ meso Jehova bụ́ Chineke gị,+ n’ihi na ihe niile ha na-emere chi ha bụ ihe arụ n’anya Jehova, bụrụkwa ihe ọ kpọrọ asị, n’ihi na ọbụna ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom ka ha na-esure n’ọkụ mgbe niile nye chi ha.+ 32  Okwu ọ bụla nke m na-enye unu n’iwu ka unu ga-elezi anya mee.+ Unu atụkwasịla ihe na ya, unu ewepụkwala ihe na ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Diu 12:17*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.