Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Sọlọmọn 8:1-14

8  “A sị nnọọ na ị dị ka nwanne m nwoke+ nke ṅụrụ ara nne m!+ Ọ bụrụ na mụ ahụ gị n’èzí, m ga-esusu gị ọnụ.+ Ndị mmadụ agaghịdị eleda m anya.  M ga-eduru gị, m ga-akpọbata gị n’ụlọ nne m,+ bụ́ onye na-ezibu m ihe. M ga-enye gị mmanya+ e tinyere ihe na-esi ísì ụtọ ka ị ṅụọ, bụ́ mmiri mkpụrụ pọmigranet a pịpụtara ọhụrụ.  M ga-ehiwe isi n’aka ekpe ya; ọ ga-ejikwa aka nri ya makụọ m.+  “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, emewo m ka unu ṅụọ iyi na unu agaghị akpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.”+  “Ònye bụ nwaanyị a+ nke si n’ala ịkpa+ na-abịa, nke dabeere n’ahụ́ onye ọ hụrụ n’anya?”+ “N’okpuru osisi apụl ka m kpọtere gị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime gị mere nne gị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime mere nwaanyị mụrụ gị.+  “Kanye m dị ka akara n’elu obi gị,+ dị ka akara n’ogwe aka gị; n’ihi na ịhụnanya siri ike dị ka ọnwụ,+ ọ naghị ekwe ekwe dị ka Shiol, ọ na-achọsi ikwesị ntụkwasị obi+ ike. Ọ na-enwu dị ka ọkụ, bụ́ ire ọkụ nke Jaa.+  Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,+ osimiri apụghịkwa ibupụ ya.+ Ọ bụrụ na mmadụ enye ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ụlọ ya iji nweta ịhụnanya, ndị mmadụ ga-eleghara ha anya.”  “Anyị nwere obere nwanne nwaanyị+ nke na-akpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwaanyị n’ụbọchị a ga-ekwu okwu ya?”  “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,+ anyị ga-eji ọlaọcha rụọ ihe nrụbichi n’elu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ,+ anyị ga-eji ibé osisi sida tụchie ya.” 10  “Abụ m mgbidi, ara m dịkwa ka ụlọ elu.+ N’ihi ya, n’anya ya, adị m ka nwaanyị nwetara udo. 11  “Ọ dị otu ubi vaịn+ Sọlọmọn nwere na Bel-hemọn. O nyefere ubi vaịn ahụ n’aka ndị ga-elekọta ya.+ Onye nke ọ bụla na-eweta otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha maka ihe si na ya. 12  “Ubi vaịn m, nke bụ́ nke m, dị n’aka m. Sọlọmọn, i nwere otu puku, ndị na-elekọta ihe si na ya nwekwara narị abụọ.” 13  “Gị onye bi n’ubi a gbara ogige,+ ndị ibe gị na-aṅa ntị n’olu gị. Mee ka m nụ ya.”+ 14  “Gbaa ọsọ, onye m hụrụ n’anya, mee ka ị dị ka nne mgbada ma ọ bụ dị ka nwa oké ele nke nọ n’ugwu ahịhịa na-esi ísì ụtọ juru.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji