Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Sọlọmọn 6:1-13

6  “Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gara, gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma?+ Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gawara, ka anyị soro gị chọwa ya?”  “Onye m hụrụ n’anya gara n’ubi ya a gbara ogige,+ n’ubi a kọrọ akọ, nke a kụrụ ahịhịa na-esi ísì ụtọ,+ ịga zụọ atụrụ+ n’ubi a gbara ogige, na ịga kụrụ okooko lili.  Abụ m nke onye m hụrụ n’anya, onye m hụrụ n’anya bụkwa nke m.+ Ọ na-azụ atụrụ+ n’ebe okooko lili juru.”  “Enyi m nwaanyị,+ ị mara mma dị ka Obodo Ọma,+ ị mara mma dị ka Jeruselem,+ ị dị ebube dị ka ndị agha+ gbara ọkọlọtọ gburugburu.+  Kwụsị ile m anya,+ n’ihi na o mewo ka ahụ́ kpaghasịa m. Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu si na Gilied madata.+  Ezé gị dị ka ìgwè nne atụrụ si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta, ha niile na-amụ ejima ejima, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha ụmụ ya nwụnahụrụ.+  Agba ntị gị abụọ, nke i kpuchiri ákwà,+ yiri mkpụrụ pọmigranet a pịwara abụọ.  A pụrụ inwe ndị nwunye eze iri isii na ndị iko nwaanyị iri asatọ na ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.+  Ma m nwere otu onye bụ́ nduru m,+ onye nke m, onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+ Ọ bụ nwa agbọghọ nke nne ya hụrụ n’anya. Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ nke nne ya mụrụ. Ụmụ nwaanyị hụrụ ya, ha wee kpọọ ya onye obi ụtọ; ndị nwunye eze na ndị iko nwaanyị hụkwara ya, ha wee jaa ya mma,+ 10  ‘Ònye bụ nwaanyị a+ nke na-eledata anya dị ka chi ọbụbọ,+ nke mara mma dị ka ọnwa gbazuru agbazu,+ nke dị ọcha dị ka anyanwụ na-achasi ike,+ dịkwa ebube dị ka ndị agha gbara ọkọlọtọ gburugburu?’”+ 11  “Agbadara m n’ubi+ osisi ụkpa,* ka m hụ ifuru ndị mara na ndagwurugwu,+ ka m hụ ma osisi vaịn ò puola, ma osisi pọmigranet ọ̀ maala ifuru.+ 12  Tupu mụ amara ihe na-eme, agụụ m nwere ịhụ ihe ndị a mere ka m bịa n’ebe ụgbọ ịnyịnya nke ndị m, bụ́ ndị na-enye onwe ha n’afọ ofufo, dị.” 13  “Lọghachi, lọghachi, nwa agbọghọ Shulem! Lọghachi, lọghachi, ka anyị hụ gị!”+ “Gịnị ka unu hụrụ n’ahụ́ nwa agbọghọ Shulem?”+ “Ọ bụ ihe yiri ìgwè abụọ na-agba egwú!”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Sọ 6:11*  Ọ bụghị ụkpa nke na-akwụ n’osisi.