Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ákwá 4:1-22

א [Alef] 4  Ewoo, lee ka ọlaedo na-egbuke egbuke, bụ́ ọlaedo ọma, sizi gbachuo agbachu!+ Lee ka e si wụsa nkume dị nsọ+ n’isi okporo ámá niile!+ ב [Bet]   Ụmụ Zayọn ndị dị nnọọ oké ọnụ ahịa,+ ndị dịbu ka ọlaedo a nụchara anụcha, Lee ka e sizi were ha dị ka nnukwu ite ụrọ, bụ́ ọrụ aka nke ọkpụite!+ ג [Gimel]   Ọbụna nkịta ọhịa na-enye ụmụ ha ara. Ha na-enye ụmụ ha ara. Ada bụ́ ndị m aghọọla ndị obi tara mmiri,+ dị ka enyí nnụnụ nọ n’ala ịkpa.+ ד [Dalet]   Ire nwa na-aṅụ ara araparawo n’okpo ọnụ ya n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ.+ Ụmụntakịrị arịọwo ka e nye ha nri.+ Ma ọ dịghị onye na-enye ha.+ ה [Hee]   Ndị na-eri ihe dị ụtọ anọrọwo ná mgbagwoju anya n’okporo ámá.+ Ndị na-eyi ákwà dị oké ọnụ ahịa* malite mgbe ha bụ ụmụaka+ amakpuruwo n’ikpo ntụ.+ ו [Wọọ]   Ntaramahụhụ e nyere ada bụ́ ndị m maka njehie ha dị ukwuu karịa ntaramahụhụ e nyere Sọdọm maka mmehie ya,+ Bụ́ obodo a kwaturu n’otu ntabi anya, n’enweghị onye nyeere ya aka.+ ז [Zayin]   Ndị Naziraịt+ ya dịbu ọcha karịa snoo;+ ha na-achabu ọcha karịa mmiri ara ehi. Ha na-achabu uhie uhie+ karịa nkume kọral; ha na-egbukekwa egbuke dị ka nkume safaya.+ ח [Het]   Ha na-ejizi oji karịa ọchịchịrị. A dịghịkwa amata ha n’okporo ámá.+ Ha atawo ahụ́ bụrụzie ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+ Ha akpọọla nkụ dị ka osisi. ט [Tet]   Ọ kaara ndị mma agha gburu mma+ karịa ndị ụnwụ gburu,+ N’ihi na ume na-agwụ ha maka na ihe si n’ubi adịkwaghị, ha wee yie ndị e ji ube magbuo. י [Yod] 10  Ndị inyom nwere ọmịiko ejiriwo aka ha sie ụmụ ha.+ Ha aghọọla nri ngụgụ obi n’oge e bibiri ada bụ́ ndị m.+ כ [Kaf] 11  Jehova awụpụwo ọnụma ya dum.+ Ọ wụpụwo iwe ya dị ọkụ.+ O sunyewokwa Zayọn ọkụ, bụ́ nke na-erechapụ ntọala ya.+ ל [Lamed] 12  Ndị eze ụwa na ndị niile bi n’elu ala ekwetaghị+ Na onye mmegide na onye iro ga-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+ מ [Mem] 13  N’ihi mmehie nke ndị amụma ya, njehie nke ndị nchụàjà ya,+ Ndị na-awụfu ọbara ndị ezi omume nọ n’ime ya.+ נ [Nun] 14  Ha awagharịala n’okporo ámá+ dị ka ndị kpuru ìsì.+ E jiriwo ọbara metọọ ha,+ N’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ imetụ uwe ha aka.+ ס [Samek] 15  “Pụọnụ n’ụzọ! Unu ndị na-adịghị ọcha!”+ ka ha gwara ha n’olu dara ụda. “Pụọnụ n’ụzọ! Pụọnụ n’ụzọ! Unu emetụla anyị aka!”+ N’ihi na ha enwekwaghị ebe obibi.+ Ha awagharịala.+ Ndị mmadụ ekwuwo n’etiti mba dị iche iche, sị: “Ha agaghị ebi ọzọ dị ka ndị ọbịa.+ פ [Pee] 16  Jehova achụsasịwo ha.+ Ọ gaghị elekwasị ha anya ọzọ.+ Ndị mmadụ agaghị asọpụrụ ọbụna ndị nchụàjà.+ Ha agaghị emere ọbụna ndị agadi amara.”+ ע [Ayin] 17  Anya akpọọla anyị ebe anyị nọ na-ele anya n’efu maka enyemaka.+ Mgbe anyị na-elegharị anya, anyị elekwasịwo anya ná mba nke na-apụghị iweta nzọpụta.+ צ [Sadee] 18  Ha na-esogharị nzọụkwụ anyị+ ka ha jide anyị, nke na ọ dịghị onye na-ejegharị n’ámá obodo anyị. Ọgwụgwụ anyị eruwo nso. Ụbọchị anyị agwụchaala, n’ihi na ọgwụgwụ anyị eruola.+ ק [Kof] 19  Ndị na-achụ anyị na-efe ọsọ karịa ugo nke eluigwe.+ Ha achụwo anyị ajọ ọsọ n’elu ugwu.+ Ha echechiela anyị n’ala ịkpa.+ ר [Resh] 20  E jidewo ume anyị na-eku,+ bụ́ onye Jehova tere mmanụ,+ ná nnukwu olulu ha,+ Onye anyị kwuru banyere ya, sị: “Na ndò ya+ ka anyị ga-ebi n’etiti mba dị iche iche.”+ ש [Sin] 21  Nwee obi ụtọ, ṅụrịakwa ọṅụ,+ gị ada bụ́ Idọm,+ nke dị n’ala Ọz.+ A ga-enyekwa gị iko ahụ.+ Mmanya ga na-egbu gị, ị ga-agbakwa onwe gị ọtọ.+ ת [Tọọ] 22  Ada bụ́ Zayọn, ntaramahụhụ maka njehie gị agwụwo.+ Ọ gaghị eme ka a dọrọ gị n’agha ọzọ.+ O chewo ihu ná njehie gị, gị ada bụ́ Idọm. O kpughewo mmehie gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ákw 4:5*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “na-eyi ákwà na-acha uhie uhie,” ya bụ, ákwà na-acha uhie uhie nke dị oké ọnụ ahịa.