Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 8:1-22

8  Jehova wee sị m: “Were mbadamba ihe buru ibu,+ jiri mkpịsị nke mmadụ efu ji ede ihe dee ‘Meha-shalal-hash-baz’ n’elu ya.  Ka ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi,+ bụ́ Yuraya onye nchụàjà+ na Zekaraya nwa Jeberekaya, gbaara m akaebe.”+  M wee garuo onye amụma nwaanyị ahụ nso, o wee tụrụ ime, ka oge na-aga, ọ mụrụ nwa nwoke.+ Jehova wee sị m: “Gụọ ya Meha-shalal-hash-baz,  n’ihi na tupu nwata ahụ amata otú e si akpọ,+ ‘Papa!’ na ‘Mama!’ a ga-ebuga akụ̀ Damaskọs na ihe a kwatara na Sameria n’ihu eze Asiria.”+  Jehova wee gwa m okwu ọzọ, sị:  “Ebe ọ bụ na ndị a ajụwo+ mmiri Shaịloa+ nke na-asọ nwayọọ nwayọọ, ha na-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihi Rizin na nwa Remalaya;+  ya mere, lee! Jehova ga-eme ka ọtụtụ mmiri dị ike nke Osimiri Yufretis,+ bụ́ eze Asiria+ na ebube ya dum,+ gbagote buso ha agha.+ Ọ ga-etokwa wee tochie ọwa mmiri ya niile, sọrọkwa gafee akụkụ ya niile,  sọrọkwa gafee Juda. Ọ ga-etojubiga ókè wee sọfere.+ Ọ ga-etoru n’olu.+ Ọ ga-agbasapụkwa nku ya+ jupụta ala gị dum, gị Ịmanuel!”+  Jọọnụ njọ, unu ndị dị iche iche, ka e tipịa unu; ṅaanụ ntị, unu ndị niile nọ n’ebe ndị dị anya nke ụwa!+ Keenụ ájị̀ n’ume,+ ka e tipịakwa unu!+ Keenụ ájị̀ n’ume, ka e tipịakwa unu! 10  Meenụ atụmatụ, a ga-akụghasị ya!+ Kwuonụ ihe ọ bụla, ọ gaghịkwa enwe isi, n’ihi na Chineke nọnyeere anyị!+ 11  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova ji aka ya dị ike gwa m, ka o wee mee ka m ghara ije ije n’ụzọ ndị nke a na-ejeso, sị: 12  “Unu asịla, ‘Gbaanụ izu ọjọọ!’ mgbe ndị a na-asị, ‘Ka anyị gbaa izu ọjọọ!’+ unu atụkwala egwu ihe ha na-atụ egwu, unu amakwala jijiji n’ihi ya.+ 13  Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka unu ga-emeso dị ka onye dị nsọ,+ ọ bụkwa ya ka unu ga na-atụ egwu,+ ọ bụ ya bụ Onye kwesịrị ime ka unu na-ama jijiji.”+ 14  Ọ ga-aghọkwa ebe dị nsọ;+ ma ọ ga-aghọrọ ụlọ abụọ nke Izrel nkume ịkpọbi ụkwụ na oké nkume ịsụ ngọngọ,+ ghọọkwara ndị bi na Jeruselem+ igbudu na ọnyà. 15  Ọtụtụ n’ime ha ga-asụ ngọngọ daa, gbajiekwa, e wee mata ha n’ọnyà wee nwụde ha.+ 16  Pịachie ihe akaebe ahụ,+ kaakwa iwu ahụ akara n’etiti ndị na-eso ụzọ m!+ 17  M ga na-atụ anya Jehova,+ bụ́ onye wepụrụ ihu ya n’ebe ụlọ Jekọb nọ,+ m ga-enwe olileanya n’ebe ọ nọ.+ 18  Lee! Mụ na ụmụ Jehova nyere m+ bụ ihe ịrịba ama+ na ọrụ ebube n’Izrel site n’aka Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ onye bi n’Ugwu Zayọn.+ 19  Ọ bụrụkwa na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ase+ ma ọ bụ ndị nwere mmụọ ịkọ ọdịnihu, bụ́ ndị na-ebe ubé,+ na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ọ́ bụghị Chi ha ka ndị ọ bụla kwesịrị ịjụ ase?+ È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?+ 20  Chọpụtanụ ihe e kwuru n’iwu nakwa n’ihe akaebe!+ N’ezie, ha ga na-ekwu okwu yiri nke a+ nke na-agaghị enwe ìhè chi ọbụbọ.+ 21  Onye nke ọ bụla ga-anọ n’ihe isi ike, kwụrụkwa agụụ+ mgbe o si n’ala a na-agafe; ọ ga-erukwa na, n’ihi na agụụ na-agụ ya nakwa n’ihi na iwe ji ya, ọ ga-akọcha eze ya, kọchaakwa Chineke ya,+ ọ ga-elelikwa anya elu. 22  Ọ ga-ele anya n’ụwa, ma, lee! ọ bụ ahụhụ na ọchịchịrị,+ oké mgbachi na oge ihe isi ike na itiri nke na-enweghị ìhè+ ka ọ ga-ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji