Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 66:1-24

66  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Eluigwe bụ ocheeze m,+ ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m.+ Olee ụlọ unu pụrụ iwuru m,+ oleekwa ebe ga-abụ ebe izu ike m?”+  “Ọ bụ aka m mere ihe a niile, nke mere ihe a niile ji dịrị,”+ ka Jehova kwuru. “Ọ bụ onye ihe na-enye nsogbu n’obi, onye nwere mwute na mmụọ ya,+ onye na-amakwa jijiji n’ihi okwu m+ ka m ga-elekwasị anya.  “Onye na-egbu oké ehi dị m ka onye na-egbu mmadụ.+ Onye ji atụrụ na-achụ àjà dị m ka onye na-agbaji nkịta olu.+ Onye ji onyinye na-achụ àjà dị m ka onye ji ọbara ézì achụ àjà!+ Onye na-esure frankinsens n’ọkụ ka ọ bụrụ ihe ncheta+ dị m ka onye ji okwu anwansi na-agọzi mmadụ.+ Ọ bụkwa ha họọrọ ụzọ ha, ihe arụ ha na-atọkwa mkpụrụ obi ha ụtọ.+  Mụ onwe m ga-ahọrọ ụzọ m ga-esi mesie ha ike;+ m ga-emekwa ka ihe ha na-atụ ụjọ bịakwasị ha;+ n’ihi na m kpọrọ òkù, ma ọ dịghị onye zara; ekwuru m okwu, ma ọ dịghị onye gere ntị;+ ha nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya m, ọ bụkwa ihe na-adịghị m mma ka ha họọrọ ime.”+  Nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị na-ama jijiji n’ihi okwu ya:+ “Ụmụnne unu, bụ́ ndị kpọrọ unu asị,+ ndị na-ekewapụ unu n’ihi aha m,+ sịrị, ‘Ka otuto dịrị Jehova!’+ Ọ ga-apụtakwa, unu ewee ṅụrịa ọṅụ,+ ọ bụkwa ha ka ihere ga-eme.”+  Ọ dị mkpọtụ nke si n’obodo, nke si n’ụlọ nsọ!+ Ọ bụ mkpọtụ nke na-eme mgbe Jehova na-akwụ ndị iro ya ụgwọ kwesịrị ha.+  Tupu ime amalite ime ya, ọ mụrụ nwa.+ Tupu ime emewe ya, ọ mụrụ nwa nwoke.+  Ònye nụtụrụla ụdị ihe a?+ Ònye hụtụrụla ụdị ihe ndị a?+ À ga-amụ ala+ n’otu ụbọchị+ site n’ime oké mgbalị? Ka à ga-amụ mba+ n’otu mgbe?+ N’ihi na ime mere Zayọn, ọ mụwokwa ụmụ ya ndị ikom.  “M̀ ga-eme ka akpa nwa meghee ma ghara ime ka a mụpụta nwa?”+ ka Jehova kwuru. “Ka m̀ na-eme ka a na-amụ nwa ma mechie akpa nwa emechi?” ka Chineke gị kwuru. 10  Soronụ Jeruselem ṅụrịa ọṅụ, sorokwanụ ya nwee ọṅụ,+ unu niile ndị hụrụ ya n’anya.+ Soronụ ya nwee obi ụtọ nke ukwuu, unu niile ndị na-eruru ya uju;+ 11  n’ihi na unu ga-aṅụ ara ọ ga-eji gụgụọ unu obi n’ụzọ zuru ezu, afọ ewee ju unu; n’ihi na unu ga-aṅụ ara, ọnụ ara nke ebube ya ga-atọ unu ụtọ nke ukwuu.+ 12  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enye ya udo nke ga-adị ka osimiri,+ nyekwa ya ebube nke mba niile nke ga-adị ka iyi tojubigara ókè,+ unu ga-aṅụkwa ara.+ A ga-eku unu n’akụkụ, a ga-ekukwasị unu n’ikpere, na-adịda unu aka.+ 13  Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi;+ a ga-akasi unu obi n’ihe banyere Jeruselem.+ 14  Unu ga-ahụ ya, unu ewee nwee obi aṅụrị,+ ndụ ga-ejupụta n’ọkpụkpụ unu+ dị ka ọ na-ejupụta n’ahịhịa ndụ.+ A ga-emekwa ka ndị ohu Jehova mara aka ya,+ ma ọ ga-ama ndị iro ya ikpe.”+ 15  “N’ihi na, lee, Jehova na-abịa dị ka ọkụ,+ ụgbọ ịnyịnya ya yiri ifufe mmiri,+ ka o wee kwụọ ha ụgwọ ihe ha mere. Ọ ga-eme ka iwe ya, bụ́ oké ọnụma ya, bịakwasị ha; ọ ga-eji ire ọkụ baara ha mba.+ 16  N’ihi na ọ bụ dị ka ọkụ ka Jehova ga-ekpe ikpe, ee, ọ ga-eji mma agha ya+ kpee anụ ahụ́ niile ikpe; ndị Jehova gburu ga-adịkwa ọtụtụ.+ 17  Ndị na-edo onwe ha nsọ, na-eme onwe ha ka ha dị ọcha iji banye n’ubi,+ n’azụ nke dị n’etiti, ndị na-eri anụ ézì+ na ihe a na-asọ oyi, ọbụna òké,+ ha niile ga-ala n’iyi,” ka Jehova kwuru. 18  “N’ihe banyere ọrụ ha+ na echiche ha,+ m na-abịa ịkpọkọta mba niile na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche;+ ha ga-abịakwa hụ ebube m.”+ 19  “M ga-edebe ihe ịrịba ama n’etiti ha,+ m ga-ezigakwa ụfọdụ n’ime ndị lanahụrụ alanahụ ná mba dị iche iche,+ ya bụ, Tashish,+ Pul, na Lọd,+ bụ́ ndị na-agba ụta, Tubal na Jevan,+ bụ́ agwaetiti ndị dị anya,+ ndị na-anụbeghị akụkọ banyere m, ndị na-ahụbeghịkwa ebube m.+ Ha ga-akọkwa akụkọ ebube m n’etiti mba niile.+ 20  Ha ga-eji ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya na ụgbọala e mechiri elu ya emechi na ịnyịnya ibu na nne kamel+ ndị na-awụ ọsọ bute ụmụnne unu niile site ná mba niile+ dị ka onyinye a ga-enye Jehova,+ bute ha n’ugwu nsọ m,+ bụ́ Jeruselem,” ka Jehova kwuru, “dị nnọọ ka mgbe ụmụ Izrel na-eji arịa dị ọcha ebubata onyinye n’ụlọ Jehova.”+ 21  “M ga-akpọrọkwa ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị,” ka Jehova kwuru. 22  “N’ihi na dị ka eluigwe ọhụrụ+ na ụwa ọhụrụ+ nke m na-eke ga-adịgide n’ihu m,”+ ka Jehova kwuru, “otú a ka ụmụ unu+ na aha unu ga-adịgide.”+ 23  “Ọ ga-erukwa na malite n’ọnwa ọhụrụ ruo n’ọnwa ọhụrụ, malitekwa n’ụbọchị izu ike ruo n’ụbọchị izu ike, anụ ahụ́ niile ga na-abịa ka ha kpọọ isiala n’ihu m,”+ ka Jehova kwuru. 24  “Ha ga-apụkwa na-ele ozu nke ndị ahụ nọ na-emehie m;+ n’ihi na ikpuru dị na ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ ha agaghịkwa anyụ anyụ.+ Ha ga-aghọkwara anụ ahụ́ niile ihe na-asọ oyi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji