Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 65:1-25

65  “Ekwewo m ka ndị na-ajụghị ajụjụ m+ chọta m.+ Ekwewo m ka ndị na-achọghị m chọta m.+ Agwara m mba nke na-adịghị akpọku aha m,+ ‘Lee m, lee m!’+  “Agbasapụworo m ndị dị isi ike+ aka m ogologo ụbọchị dum, bụ́ ndị na-eje ije n’ụzọ na-adịghị mma,+ ndị na-agbaso echiche nke aka ha;+  ndị na-akpasu m iwe+ n’ihu m mgbe niile, na-achụ àjà n’ubi,+ na-esurekwa ihe nsure ọkụ+ n’elu brik,  ndị na-anọdụ ala n’ebe a na-eli ozu,+ ndị na-arahụ n’obere ụlọ nche, ndị na-eri anụ ézì,+ ọbụna ofe e ji ihe rụrụ arụ sie+ dịkwa n’ite ha;  ndị na-asị, ‘Nọọrọ onwe gị. Abịarula m nso, n’ihi na m ga-eme ka ị dị nsọ.’+ Ndị a bụ anwụrụ ọkụ bara m n’oghere imi,+ ọkụ nke na-ere ogologo ụbọchị dum.+  “Lee! E dere ya ede n’ihu m.+ Agaghị m agbachi nkịtị,+ kama m ga-akwụ ha ụgwọ ọrụ;+ m ga-awụnye ụgwọ ọrụ ha n’obi uwe ha,+  n’ihi njehie ha na njehie ndị nna nna ha n’otu mgbe ahụ,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na ha esurewo ihe nsure ọkụ n’elu ugwu ukwu, ha akọchawokwa m+ n’elu ugwu nta,+ m ga-ebu ụzọ tụọ ụgwọ ọrụ ha atụ̀ ma wụnye ya n’obi uwe ha.”+  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Otú ahụ ọ na-abụ mmadụ hụ ụyọkọ mkpụrụ vaịn nke ga-agbapụta mmanya ọhụrụ,+ ya asị, ‘Ebibila ya,+ n’ihi na ngọzi dị n’ime ya,’+ otú ahụ ka m ga-eme n’ihi ndị ohu m ka m wee ghara ibibi mmadụ niile.+  M ga-eme ka ụmụ si na Jekọb pụta,+ meekwa ka ndị ga-eketa ugwu m si na Juda pụta;+ ndị m họọrọ ga-enweta ya,+ ndị ohu m ga-ebikwa n’ebe ahụ.+ 10  Sharọn+ ga-aghọ ebe atụrụ ga na-ata ahịhịa,+ ndagwurugwu Ekọ+ ga-aghọkwa ebe ehi ga na-ezu ike, maka ndị m bụ́ ndị ga-achọworị m.+ 11  “Ma unu bụ ndị na-ahapụ Jehova,+ ndị na-echefu ugwu nsọ m,+ ndị na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma,+ ndị na-agbajuru chi Akara Aka mmanya a gwara agwa.+ 12  M ga-enyefe unu n’aka mma agha.+ Unu niile ga-ehulata ala ka e gbuo unu;+ n’ihi na m kpọrọ òkù,+ ma unu azaghị; ekwuru m okwu, ma unu egeghị ntị;+ unu nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya m,+ ọ bụkwa ihe na-adịghị m mma ka unu họọrọ ime.”+ 13  Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee! Ndị ohu m ga-eri ihe,+ ma agụụ ga na-agụ unu.+ Lee! Ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ,+ ma akpịrị ga na-akpọ unu nkụ.+ Lee! Ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ,+ ma ihere ga na-eme unu.+ 14  Lee! Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma,+ ma unu onwe unu ga-eti mkpu ákwá n’ihi obi mwute, unu ga-akwa ákwá n’ihi ịda mbà na mmụọ.+ 15  Unu ga-ahapụ aha unu ka ọ bụrụ ihe ndị m họọrọ ga-eji na-aṅụ iyi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-egbu unu n’otu n’otu,+ ma ọ ga-agụ ndị ohu ya aha ọzọ;+ 16  ka onye ọ bụla nke na-agọzi onwe ya n’ụwa wee jiri Chineke nke okwukwe gọzie onwe ya,+ ka onye ọ bụla nke na-aṅụkwa iyi n’ụwa wee jiri Chineke nke okwukwe ṅụọ iyi;+ n’ihi na ha ga-echefu ahụhụ niile ha tara n’oge gara aga, n’ihi na a ga-ezopụ ha n’anya m.+ 17  “N’ihi na, lee, m na-eke eluigwe ọhụrụ+ na ụwa ọhụrụ.+ A gaghị echeta ihe mbụ niile,+ ha agaghị abatakwa n’obi.+ 18  Ma nweenụ obi ụtọ,+ ṅụrịakwanụ ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe m na-eke.+ N’ihi na m na-eke Jeruselem ka ọ bụrụ ihe na-enye ọṅụ, m na-ekekwa ndị ya ka ha bụrụ ihe na-enye obi ụtọ.+ 19  M ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jeruselem, nweekwa obi ụtọ n’ihi ndị m.+ A gakwaghị anụ mkpu ákwá ma ọ bụ mkpu arịrị n’ime ya.”+ 20  “A gakwaghị enwe nwa na-aṅụ ara nke ga-anọ ụbọchị ole na ole n’ebe ahụ,+ ma ọ bụ agadi nke na-anọzughị oge ndụ ya.+ N’ihi na mmadụ ga-anwụ dị ka nwata, ọ bụ ezie na ọ gbaala otu narị afọ; a ga-akọcha onye mmehie,+ ọ bụ ezie na ọ gbaala otu narị afọ. 21  Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha;+ ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.+ 22  Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ;+ ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.+ 23  Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu,+ ha agaghịkwa amụ ụmụ mụta nsogbu;+ n’ihi na ha na ụmụ ha+ bụ ụmụ Jehova gọziri agọzi.+ 24  Ọ ga-erukwa na tupu ha akpọkuo m, m ga-aza ha;+ mgbe ha ka kpụ okwu n’ọnụ, mụ onwe m ga-anụ ya.+ 25  “Anụ ọhịa wolf+ na nwa atụrụ ga-atakọ nri,+ ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi;+ ọ bụ ájá ga-abụ nri agwọ.+ Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum,”+ ka Jehova kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji