Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 61:1-11

61  Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m,+ n’ihi na Jehova etewo m mmanụ+ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+ O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi,+ ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha+ na a tọhapụwo ha, na imeghe anya ndị mkpọrọ;+  ịkpọsa afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya,+ na ụbọchị Chineke anyị ga-abọ ọbọ;+ ịkasi ndị niile na-eru uju obi;+  inye ndị na-eruru Zayọn uju ákwà isi ha ga-eji dochie ntụ,+ mmanụ aṅụrị+ ha ga-eji dochie iru uju, ákwà mgbokwasị nke na-eweta otuto ha ga-eji dochie mmụọ dara mbà.+ A ga-akpọkwa ha oké osisi nke ezi omume,+ ihe Jehova kụrụ,+ iji mee ka ya onwe ya maa mma.+  Ha ga-ewughachi ebe e bibiri ebibi ndị dịwara kemgbe ogologo oge;+ ha ga-ewu ọbụna ebe ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu n’oge ochie.+ Ha ga-eme ka obodo ndị e bibiri ebibi dị ọhụrụ,+ bụ́ obodo ndị tọgbọrọ n’efu malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.  “Ndị ala ọzọ ga-abịa na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu.+ Ndị mba ọzọ+ ga-abụ ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vaịn unu.+  Ma a ga-akpọ unu ndị nchụàjà Jehova;+ a ga-asịkwa na unu bụ+ ndị ozi+ nke Chineke anyị. Unu ga-eri akụ̀ nke mba dị iche iche.+ Unu ga-eji aṅụrị na-ekwu okwu banyere onwe unu n’ihi ebube ha.+  Unu ga-enweta òkè okpukpu abụọ kama ihere nke na-eme unu,+ ha ga-etikwa mkpu ọṅụ n’ihi òkè ha kama mmechuihu ha na-enwe.+ Ya mere, ha ga-enweta òkè okpukpu abụọ n’ala ha.+ Ha ga na-aṅụrị ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+  N’ihi na mụ onwe m, Jehova, hụrụ ikpe ziri ezi n’anya,+ kpọọkwa ịpụnara mmadụ ihe na ajọ omume asị.+ M ga-enye ha ụgwọ ọrụ ha n’ụzọ ziri ezi,+ mụ na ha ga-agbakwa ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.+  A ga-ama mkpụrụ ha ọbụna ná mba dị iche iche,+ marakwa ụmụ ha n’etiti ndị dị iche iche. Ndị niile hụrụ ha ga-amata ha,+ na ha bụ mkpụrụ Jehova gọziri agọzi.”+ 10  Aghaghị m ịṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.+ Mkpụrụ obi m ga-enwe ọṅụ n’ime Chineke m.+ N’ihi na o yikwasịwo m uwe nzọpụta;+ o yikwasịwo m uwe elu ezi omume,+ dị ka nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ, bụ́ onye kere onwe ya ákwà isi dị ka onye nchụàjà,+ dịkwa ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, bụ́ onye ji ihe ndị o ji achọ mma chọọ onwe ya mma.+ 11  N’ihi na dị ka ala si eme ka ihe puo, dịkwa ka ubi si eme ka ihe a kụrụ na ya puo,+ otú ahụ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-eme ka ezi omume na otuto puo+ n’ihu mba niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji