Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 6:1-13

6  Otú ọ dị, n’afọ Eze Ọzaya nwụrụ,+ ahụrụ m Jehova+ ka ọ nọ n’ocheeze+ dị elu, nke e bulikwara elu, uwe mwụda ya sachikwara ebe niile n’ụlọ nsọ ya.+  Ndị seraf guzo n’elu ya.+ Nke ọ bụla nwere nku isii. Ọ na-eji abụọ ekpuchi ihu ya,+ jiri abụọ na-ekpuchi ụkwụ ya, jirikwa abụọ na-efegharị.  Ha na-etiku ibe ha, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.+ Ihe niile juru n’ụwa na-egosi ebube ya.”  Ụda olu nke onye ahụ na-akpọ òkù wee mee ka ebe e konyere ibo ụzọ+ nke ụlọ ahụ malite ịma jijiji, anwụrụ ọkụ wee jupụta n’ụlọ ahụ.+  M wee sị: “Efuola m! N’ihi na ọ fọrọ nke nta ka m nwụọ, n’ihi na abụ m onye egbugbere ọnụ ya na-adịghị ọcha,+ ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha na-adịghị ọcha ka m bi;+ n’ihi na anya m ahụwo Eze bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha!”+  Otu n’ime ndị seraf wee fekwute m, o jikwa icheku ọkụ+ nke o ji ihe yiri mkpà gụta n’ebe ịchụàjà.+  O wee metụ m ya n’ọnụ,+ sị: “Lee! Ihe a emetụla egbugbere ọnụ gị, e wepụwo njehie gị, e kpuchiwokwa mmehie gị.”+  M wee malite ịnụ olu Jehova ka ọ na-asị: “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?”+ M wee sị: “Lee m! Ziga m.”+  O wee sị: “Gaa sị ha, ‘Nụrụnụ ugboro ugboro, ma unu aghọtala; hụkwanụ ugboro ugboro, ma unu amatala ihe ọ bụla.’+ 10  Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+ meekwa ka ntị ha kpọchie akpọchie,+ nyachiekwa anya ha, ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe, ka obi ha gharakwa ịghọta ihe, ka ha wee ghara ichegharị, e wee gwọọ ha.”+ 11  M wee sị: “Jehova, ruo ole mgbe?”+ O wee sị: “Ruo mgbe obodo niile ghọrọ mkpọmkpọ ebe, n’enweghị onye bi ha, ruo mgbe ụlọ niile na-enweghị mmadụ nọ ha, mgbe e bibiwokwara ala a mee ka ọ tọgbọrọ n’efu;+ 12  mgbe Jehova kpọgakwara ndị mmadụ n’ebe dị anya, ebe a gbahapụrụ agbahapụ n’etiti ala a+ ga-adịkwa nnọọ ukwuu. 13  Otu ụzọ n’ụzọ iri ka ga-anọ n’ime ya,+ ọ ga-aghọkwa ihe a ga-agba ọkụ ọzọ, dị ka osisi ukwu, dịkwa ka oké osisi, bụ́ ndị úkwù ha na-afọdụ+ ma e gbutuo ha;+ mkpụrụ dị nsọ ka úkwù ya ga-abụ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji