Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 58:1-14

58  “Were oké olu tie mkpu; emechila ọnụ.+ Mee ka olu gị dasie ụda ike dị ka opi. Gwa ndị m nnupụisi ha,+ gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.  N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ m ka ha nọ na-achọ kwa ụbọchị. Ha na-ekwukwa na ọ na-atọ ha ụtọ ịmara ụzọ m,+ dị ka mba nke na-eme ezi omume, nke na-ahapụghịkwa ikpe ziri ezi nke Chineke ha,+ ha nọ na-arịọ m ka m kpeere ha ikpe ezi omume, na-abịarukwa Chineke nso, bụ́ onye ihe ya na-atọ ha ụtọ,+  “‘Gịnị mere anyị ji buo ọnụ ma ị hụghị ya,+ gịnịkwa mere anyị ji mekpaa mkpụrụ obi anyị ahụ́+ ma ị maghị?’+ “N’ezie, ọ bụ ihe na-atọ unu ụtọ ka unu na-achọ n’ụbọchị unu na-ebu ọnụ, mgbe e nwere ndị niile unu na-amanye ka ha na-adọgburu unu onwe ha n’ọrụ.+  Unu na-ebu ọnụ iji na-ese okwu ma na-alụ ọgụ,+ nakwa iji na-akụ ajọ ọkpọ.+ Ọ̀ bụ na unu anọghị na-ebu ọnụ ma na-eche na ọ bụ mgbe a ga-anọ n’elu nụ olu unu?  Ibu ọnụ nke m chọrọ ò kwesịrị ịdị otú a, ya bụ, ụbọchị mmadụ na-emekpa mkpụrụ obi ya ahụ́,+ ụbọchị mmadụ na-ehulata isi ya dị ka ahịhịa amị, gbasaa ákwà iru uju, kposaakwa ntụ ka ha bụrụ ihe ndina ya?+ Ọ̀ bụ ihe a ka unu na-akpọ ibu ọnụ na ụbọchị dị Jehova mma?+  “Ọ́ bụghị nke a bụ ụdị ibu ọnụ m chọrọ? Ịtọpụ agbụ ajọ omume,+ ịtọpụ eriri e ji kegide osisi yok,+ na ịhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha nwere onwe ha,+ nakwa ka unu gbajie osisi yok niile?+  Ọ́ bụghị ka i kenye onye agụụ na-agụ ihe oriri,+ ka ị kpọbatakwa ndị nọ n’ahụhụ na ndị na-enweghị ebe obibi n’ụlọ gị?+ Ọ bụrụ na ị hụ onye gba ọtọ, ka i yiwe ya uwe,+ ka ị gharakwa izopụ onwe gị n’ebe onye ikwu gị nọ?+  “Mgbe ahụ ka ìhè gị ga-enwupụta dị ka chi ọbụbọ;+ ị ga-agbakekwa ngwa ngwa.+ Ezi omume gị ga-ebutere gị ụzọ;+ ebube Jehova ga-ekpekwara gị azụ.+  Mgbe ahụ ka ị ga-akpọku Jehova, ya aza; ị ga-eti mkpu enyemaka,+ ya asịkwa, ‘Lee m!’ “Ọ bụrụ na i wepụ osisi yok n’ebe ị nọ,+ kwụsị ịtụ aka+ na ikwu okwu ọjọọ;+ 10  ọ bụrụkwa na i nye onye agụụ na-agụ ihe na-agụ mkpụrụ obi gị,+ nyejuokwa mkpụrụ obi nke nọ n’ahụhụ afọ, ìhè gị ga-enwukwa ọbụna n’ọchịchịrị, itiri gị ga-adịkwa ka etiti ehihie.+ 11  Jehova ga na-edu+ gị mgbe niile,+ na-enyejukwa mkpụrụ obi gị afọ ọbụna n’ala kpọrọ nkụ,+ ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ gị dị ike;+ ị ga-adịzi ka ubi nke mmiri na-ede nke ọma,+ dịkwa ka isi mmiri, nke mmiri ya na-adịghị ata ata. 12  Ọ bụ n’ihi gị ka ndị mmadụ ga-ewu ebe ndị ahụ tọgbọrọ n’efu kemgbe oge dị anya gara aga;+ ị ga-ewughachikwa ọbụna ntọala ndị tọgbọrọ n’efu kemgbe ọtụtụ ọgbọ.+ A ga-akpọkwa gị onye na-arụzi ebe e tidara etida ná mgbidi,+ onye na-arụzi okporo ụzọ nke mmadụ si ala n’ụlọ ya. 13  “Ọ bụrụ na i kworo ụbọchị izu ike mee ka ụkwụ gị laghachi azụ, i wee kwụsị ime ihe na-atọ gị ụtọ n’ụbọchị m nke dị nsọ,+ kpọọkwa ụbọchị izu ike ihe na-enye obi ụtọ, ụbọchị Jehova nke dị nsọ, nke a na-akwanyere ùgwù,+ i wee kwanyere ya ùgwù kama ịgbaso ụzọ gị, kama ịchọ ihe na-atọ gị ụtọ na okwu na-enweghị isi; 14  mgbe ahụ, ihe Jehova ga-atọ gị ụtọ nke ukwuu,+ m ga-emekwa ka ị nọkwasị n’ebe ndị dị elu nke ụwa.+ M ga-emekwa ka i rie ihe si n’ihe nketa nke Jekọb nna nna gị,+ n’ihi na ọ bụ ọnụ Jehova kwuru ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji