Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 56:1-12

56  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Na-emenụ ihe ziri ezi,+ na-emekwanụ ezi omume.+ N’ihi na nzọpụta m ga-abịa n’oge na-adịghị anya,+ a ga-ekpughekwa ezi omume m n’oge na-adịghị anya.+  Obi ụtọ na-adịrị mmadụ efu nke na-eme ihe a,+ na nwa nke mmadụ nke na-edebe ya,+ onye na-edebe ụbọchị izu ike ka ọ ghara imerụ ya,+ onye na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ụdị ihe ọjọọ ọ bụla.+  Ka onye mba ọzọ nke sonyeere Jehova ghara ịsị,+ ‘Jehova aghaghị ikewapụ m n’ebe ndị ya nọ.’+ Ka ọnaozi+ gharakwa ịsị, ‘Lee! Abụ m osisi kpọrọ nkụ.’”  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ndị ọnaozi ndị na-edebe ụbọchị izu ike m, ndị họọrọ ime ihe na-atọ m ụtọ,+ ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike,+  m ga-enye ha ihe ncheta+ na aha,+ ihe ka ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom mma,+ n’ụlọ m+ nakwa n’ime ogige m. M ga-enye ha aha ga-adịru mgbe ebighị ebi,+ nke a na-agaghị ebipụ ebipụ.+  “Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị sonyeere Jehova iji jeere ya ozi+ na iji hụ aha Jehova n’anya,+ iji bụrụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izu ike ka ha ghara imerụ ya, ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike,+  m ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m,+ meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.+ A ga-anabata àjà ha a na-esurecha n’ọkụ+ na àjà nkịtị ha+ n’elu ebe ịchụàjà m.+ N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị niile.”+  Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ onye na-akpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa,+ kwuru: “M ga-akpọkọtara ha ndị ọzọ ma e wezụga ndị nke ha a kpọkọtaworo akpọkọta.”+  Unu anụ ọhịa niile, bịanụ rie ihe, unu anụ niile bi n’oké ọhịa.+ 10  Ndị nche ya kpuru ìsì.+ Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha maara ihe na-emenụ.+ Ha niile bụ nkịta dara ogbi; ha apụghị ịgbọ ụja,+ ha na-ekusi ume ike, ha makpu ala, ịrahụ ụra na-atọgbu ha atọgbu.+ 11  Ha bụ nkịta agụụ na-agụsi mkpụrụ obi ha ike;+ afọ adịghị eju ha eju.+ Ha bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta.+ Ha niile echewo ihu n’ụzọ nke ha, onye ọ bụla iji nweta uru na-ezighị ezi nke ya site n’ókè nke ala ya, na-asị:+ 12  “Bịanụ! Ka m gbata mmanya; ka anyị ṅụbiga mmanya na-egbu egbu ókè.+ Echi ga-adịkwa nnọọ ka taa, ọ ga-abụ oké ụbọchị n’ụzọ ka nnọọ ukwuu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji